Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 20


Isi 20

Jisus wee mee ka e nweta achịcha na mmanya n’ụzọ dị ebube ma ọzọ, nye ndị ahụ oriri-nsọ—Ndị nke Jekọb fọdụrụ ga-abịa na mmata nke Onye-nwe Chineke ha, ma ha ga eketa ala Amerika nile—Jisus bụ onye-amụma dịka Moses siri bụrụ, ma ndị nke Nifaị bụ ụmụ nke ndị-amụma—Ndị ọzọ bụ ndị nke Onye-nwe a ga-akpọkọta ha na Jerusalem. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na o nyere igwe-mmadụ ahụ iwu ka ha kwụsị ikpe ekpere, na kwa ndị na-eso ụzọ ya. Ma o nyere ha iwu ka ha ghara ịkwụsị aikpe ekpere n’ime obi ha.

2 Ma o nyere ha iwu ka ha bilie ma guzoro ọtọ n’ụkwụ ha. Ma ha biliri ọtọ n’ụkwụ ha.

3 Ma o wee ruo na ọ nyawakwara achịcha ọzọ ma gọzie ya, ma nye ndị na-eso uzo ya ahụ ka ha rie.

4 Ma mgbe ha riworo o nyere ha iwu ka ha nyawa achịcha, ma nye igwe-mmadụ ahụ.

5 Ma mgbe ha nyeworo igwe-mmadụ ahụ, o nyekwara ha mmanya ka ha n̄ụọ, ma nye ha iwu ka ha nye igwe-mmadụ ahụ.

6 Ugbua, enwebeghị aachịcha dị, ọbụghị ma e nwere mmanya ndị na-eso ụzọ ya ahụ wetara, ọbụghị ma igwe-mmadụ ahụ ha wetara.

7 Mana o anyere ha achịcha n’ezie ka ha rie, na mmanya ka ha n̄ụọ.

8 Ma ọ sịrị ha: Onye nke ana-eri achịcha nke a na-eri site n’arụ m nye mkpụrụ-obi ya; ma onye nke na-an̄ụ site na mmanya nke a na-an̄ụ site n’ọbara m nye mkpụrụ-obi ya; ma agụụ-nri ma-ọbụ mmiri agaghị agụ mkpụrụ-obi ya mgbe ọbụla, kama a ga-emejupụta ya.

9 Ugbua, mgbe igwe-mmadụ ahụ riworo nri ma n̄ụọ ihe ọn̄ụn̄ụ, lee, ha jupụtara na Mụọ; ma ha jiri otu olu tipụta mkpu, ma nye Jisus otuto, onye ha hụrụ ma nụ kwa.

10 Ma o wee ruo na mgbe ha nile nyeworo Jisus otuto, ọ sịrị ha: Lee ugbua emesịwo m iwu-nsọ nke Nna nyere m iwu gbasara ndị a, bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Israel.

11 Unu chetara na m gwara unu okwu, ma sị na mgbe a ga-emejupụta aokwu nile nke bAịsaịa—lee e dere ha ede, unu ji ha n’iru unu, ya mere chọọ nụ ha—

12 Ma n’ezie, n’ezie, asị m unu, na mgbe a ga-emejupụta ha mgbe ahụ bụ mmejupụta nke aọgbụgba-ndụ ahụ nke Nna meworo nye ndị ya, O ụlọ nke Israel.

13 Ma mgbe ahụ ka andị fọdụrụ, ndị a ga bekposasị ebe nile n’elu iru nke ụwa, a cga-akpọkọta ha bata site n’ọwụwa-anyanwụ na site n’ọdịda-anyanwụ, na site na ndịda-ndịda na site na elu-elu; ma a ga-akpọta ha na dmmata nke Onye-nwe Chineke ha, onye gbapụtaworo ha.

14 Ma Nna enyewo m iwu ka m nye unu aala nke a, maka ihe nketa unu.

15 Ma asị m unu, na ọbụrụ na ndị Jentaịlụ aechegharịghị mgbe ngọzi nke ha ga-anata gasịworo, mgbe ha kposasịworo ndị m—

16 Mgbe ahụ ka unu, bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Jekọb, ga-aga nʼiru n’etiti ha; ma unu ga-anọ n’etiti ha ndị ga-adị ọtụtụ; ma unu ga-anọ n’etiti ha dịka ọdụm n’etiti anụmanụ nile nke oke ọhịa, na dịka nwa aọdụm n’etiti igwe atụrụ, nke, ọbụrụ na ọ banye ga bazọda ma ga-adọka irighiri irighiri, ma ọdịghị onye ga-enwe ike ịnapụta.

17 A ga ewelite aka unu imegide ndị-iro unu, ma ndị-iro unu nile a ga-ebepụ ha.

18 Ma aga m aakpọkọta ndị m ọnụ dịka mmadụ si na-ekpokọta ukwu-ọka ya nile n’ala-ụlọ.

19 N’ihi na aga m eme ndị m ndị nke ha na Nna gbaworo-ndụ, e, aga m eme ampi unu igwe, ma aga m eme akpụkpọ-mkpuchi-ukwu unu nile ka ha bụrụ bras. Ma unu ga-akụrịsi ọtụtụ mmadụ irighiri irighiri; ma aga m edo uru ha nsọ nye Onye-nwe, ma ihe onwunwe ha nye Onye-nwe nke ụwa nile. Ma lee, Abụ m onye ahụ na-eme ya.

20 Ma ọ ga-eru, ka Nna kwuru, na amma-agha nke ikpe-ziri-ezi m ga ekoro n’ofe isi ha n’ụbọchị ikpe-azụ; ma ma-ọbụghị na ha chegharịrị ọ ga-adakwasị ha, ka Nna kwuru, e, ọbụna dakwasị mba nile nke ndị Jentaịlụ.

21 Ma ọ ga-eru na aga m ehiwe andị m, O ụlọ nke Israel.

22 Ma lee, ndị a ka m ga-ehiwe n’ala nke a, ruo na mmejupụta nke aọgbụgba-ndụ ahụ nke m gbara mụ na nna unu Jekọb; ma ọ ga-abụ bJerusalem Ọhụrụ. Ma ike nile nke elu-igwe ga-adị n’etiti ndị a; e, ọbụna caga m anọ n’etiti unu.

23 Lee, abụ m onye ahụ nke Moses kwuru maka ya, na-asị: aOnye-amụma ka Onye-nwe bụ Chineke unu ga-akpọlite nye unu site n’ụmụnne unu, dịka o siri nye m; ya ka unu ga-anụrụ olu ya n’ihe nile ọbụla ọ ga-agwa unu. Ma ọ ga-eru na mkpụrụ-obi nile ndị na-agaghị anụrụ olu onye-amụma ahụ a ga-ebepụ ha site n’etiti ndị mmadụ.

24 N’ezie asị m unu, e, ma andị-amụma nile site na Samuel na ndị nile so ya n’azụ, ka ha ra bụ ndị kwuworo okwu, agbawo-ama maka m.

25 Ma lee, unu bụ ụmụ nke ndị-amụma; ma unu bụ nke ụlọ nke Israel; ma unu bụ nke aọgbụgba-ndụ ahụ nke Nna mere ya na n di nna unu, na-asị Abraham: Ma bnʼime mkpụrụ-afọ gị ka ebo nile nke ụwa ga-enwe ngọzi.

26 Nna ebe o buworo ụzọ kulite m nye unu, ma zite m ịgọzi unu an’ịtụgharịpụ onye ọbụla n’ime unu site n’ajọọ-omume ya nile; ma nke a n’ihi na unu bụ ụmụ nke ọgbụgba-ndụ ahụ—

27 Ma mgbe a gọziworo unu mgbe ahụ ka Nna mejupụtara ọgbụgba-ndụ nke o mere ya na Abraham, na-asị: aNa mkpụrụ-afọ gị ka ebo nile nke ụwa ga-enwe ngọzi—ruo n’ịwụpụta Mụọ Nsọ site na m wụkwasị bndị Jentaịlụ, ngọzi ahụ nke awụkwasịrị ndị Jentaịlụ ga-eme ka ha dị ike karịa ndị nile, ruo na mkposasị nke ndị m, O ụlọ nke Israel.

28 Ma ha ga-abụ aihe-otiti nye ndị ala nke a. Otu o sila dị, mgbe ha ga-anatawọrịị uju nke ozi-ọma m, mgbe ahụ ọbụrụ na ha ga-emesi obi ha ike megide m aga m eweghachị ajọọ-omume ha nile n’isi nke ha, ka Nna kwuru.

29 Ma aga m aecheta ọgbụgba-ndụ ahụ nke m meworo mụ na ndị m; mụ na ha agbawo-ndụ na aga m bakpọkọta ha ọnụ n’oge nke dị mụ mma, na aga m enye kwa ha cala nke ndị nna ha ọzọ maka ihe nketa ha, nke bụ ala nke dJerusalem, nke bụ ala nke e kwere ha na nkwa ruo mgbe nile, ka Nna kwuru.

30 Ma ọ ga-eru na oge na-abịa, mgbe a ga-ekwusara ha uju nke ozi-ọma m;

31 Ma ha aga-ekwere na m, na abụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ma ga-ekpe ekpere nye Nna n’aha m.

32 Mgbe ahụ ka andị-nche ha ga-ewelite olu ha elu, ma n’olu ka ha ga-abụkọta abụ ọnụ; n’ihi na ha ga-ahụ anya na anya.

33 Mgbe ahụ ka Nna ga-akpọkọta kwa ha ọzọ, ma nye ha Jerusalem maka ala nke nketa ha.

34 Mgbe ahụ ka ha ga-etiwapụ mkpu ọn̄ụ—aBụkọtanụ, unu mkpọmkpọ ebe nke Jerusalem; n’ihi na Nna akasịwo ndị ya obi, ọ gbapụtawo Jerusalem.

35 Nna agbawo ogwe-aka nsọ ya ọtọ n’anya nile nke mba nile; ma nsọtụ nile nke ụwa ga-ahụ nzọpụta nke Nna ahụ; ma Nna na Mụ bụ otu.

36 Ma mgbe ahụ ka a ga-eweta na mmezu ihe nke e dere ede: aTeta, teta kwa ọzọ, ma yikwasị ume gị, O Zaịọn; yikwasị ọmarịcha uwe gị nile, O Jerusalem, obodo-ukwu dị nsọ, n’ihi na site ugbua ọdịghị ndị ana-ebịghị-ugwu na ndị na-adịghị-ọcha ga-abata n’ime gị ọzọ.

37 Hụchapụ onwe gị site n’uzuzu; bilie, nọdụ ala, O Jerusalem; tọpụ onwe gị site n’agbụ nile nke olu gị, O ada-a-dọkpụrụ-n’agha nke Zaịọn.

38 N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: Unu erewo onwe unu n’ihe efu, ma a ga-agbapụta unu na-ejighi ego.

39 N’ezie, n’ezie, asị m unu, na ndị m ga-amata aha m; e, n’ụbọchị ahụ ha ga-amata na ọ bụ m bụ onye na-ekwu.

40 Ma mgbe ahụ ka ha ga-asị: aOlee otu ịma mma ya siri dị n’elu ugwu-ukwu nile bụ ụkwụ abụọ nke onye ahụ na-ewetara ha ozi nile nke ihe ọma, nke bna-ekwupụta ụdọ; nke na-eweta ozi nile nye ha maka ihe ọma, nke na-ekwupụta nzọpụta; nke na-asị Zaịọn: Chineke Gị na-achị!

41 Ma mgbe ahụ ka iti-mkpu ga-aga nʼiru: aPụọ nụ, pụọ nụ, si nụ n’ebe ahụ pụọ, emetụ-kwala ihe nke bna-adịghị ọcha aka; pụọ nụ site n’etiti ya; dị nụ cọcha unu ndị na-ebu ngwa-ọrụ nke Onye-nwe.

42 N’ihi na unu aagaghị apụ ọsọ-ọsọ ma-ọbụ jiri mgbapụ laa; n’ihi na Onye-nwe ga-eburu unu ụzọ gaa, ma Chineke nke Israel ga-abụ onye-nche unu kpo azụ.

43 Lee, nwa-oru m ga-akpachapụ anya mee ihe; a ga-ebuli ya elu ma too ya oke otuto ma ọ ga-adị ezigbo elu.

44 Dịka ọ tụrụ ọtụtụ n’anya maka gị—ile iru ya mebiri nke ukwuu, karịa onye ọbụla, ma ụdịdị ya karịa nke ụmụ nwoke nile nke mmadụ—

45 Otu a ka ọ ga-esi afesa ọtụtụ mba; ndị eze nile ga-ekpuchibido ya ọnụ ha, n’ihi ihe ahụ nke a na-agwabeghị ha ka ha ga-ahụ; ma nke ahụ ha na-anụbeghị ka ha tụgharịa-uche maka ya.

46 N’ezie, n’ezie, asị m unu, ihe ndị a nile ga-abịarịrị, ọbụna dịka Nna nyeworo m iwu. Mgbe ahụ ka ọgbụgba-ndụ nke a nke Nna gbaworo ya na ndị ya a ga-emejupụta ya; ma mgbe ahụ ndị m ga-ebi kwa na aJerusalem ọzọ, ma ọ ga-abụ ala nke nketa ha.