Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 23


Isi 23

Jisus wee kwado okwu nile nke Aịsaịa—O wee nye ndị ahụ iwu ịchọsị ihe nile ndị-amụma dere ike—Okwu nile nke Samuel onye Leman gbasara Mbilite-n’onwu ahụ ka a gbakọnyere n’akụkọ-ndekọta ha nile. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua, lee, asị m unu, na unu kwesịrị ịchọ ihe ndị a. E, iwu-nsọ ka m na-enye unu ka unu jiri mgbalị chọsie ihe ndị a ike; n’ihi na nnukwu ka okwu nile nke Aịsaịa dị.

2 N’ihi na n’ezie o kwuru na-arụtụ-aka ihe nile gbasara ndị m ndị bụ nke ụlọ nke Israel; ya mere ọ dịrịrị mkpa na ọ ga-agwa kwa ndị Jentaịlụ okwu.

3 Ma ihe nile nke o kwuru adịwo ma ga-adị, ọbụna dịka okwu nile nke o kwuru siri dị.

4 Ya mere gee nu ntị n’okwu m nile; dee ihe ndị m gwaworo unu; ma dịka oge na uche nke Nna siri dị, ha ga-aga nʼiru rute ndị Jentaịlụ.

5 Ma onye ọbụla nke ga-an̄a ntị n’okwu m nile ma chegharịa ma e mee ya baptism, onye ahụ ka a ga-azọpụta. Chọọ ihe nile ndị-amụma dere, n’ihi na ọtụtụ ka ha dị nke na-agba-ama maka ihe ndị a.

6 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a ọ sị kwara ha ọzọ, mgbe ọ kọwadarusịrị akwụkwọ-nsọ ahụ ala nye ha nke ha nataworo, ọ sịrị ha: Lee, akwụkwọ-nsọ ndị ọzọ ọ ga-adị m mma ka unu dee, nke ahụ unu na-edebeghị.

7 Ma o wee ruo na ọ gwara Nifaị: Weta nu akụkọ-ndekọta nile nke unu debeworo.

8 Ma mgbe Nifaị wetaworo akụkọ-ndekọta nile ahụ, ma tọgbọwo ha n’iru ya, o lekwasịrị ha anya ma sị:

9 N’ezie asị m unu, enyere m nwa-oru m Samuel, onye Leman iwu, ka o wee gbaara ndị a ama, na n’ụbọchị ahụ Nna ga-enye aha ya otuto na m, na e nwere ọtụtụ ndị nsọ ndị ga-ebilite site na ndị nwụrụ-anwụ, ma ga-egosịpụta onwe ha nye ọtụtụ, ma ga-akụziri ha ozi-ọma. Ma ọ sịrị ha: Ọ dịghị otu ahụ?

10 Ma ndị na-eso uzo ya zara ya ma sị: E, Onye-nwe, Samuel buru amụma dịka okwu gị nile siri dị, ma e mezuru ha nile.

11 Ma Jisus sịrị ha: Olee otu o siri bụrụ na unu edebeghị ihe nke a, na ọtụtụ ndị nsọ bilitere ma gosị ọtụtụ mmadụ onwe ha ma kuziere ha ozi-ọma?

12 Ma o wee ruo na Nifaị chetara na ihe nke a, edebeghị ya.

13 Ma o wee ruo na Jisus nyere iwu ka e dee ya; ya mere e dere ya dịka o siri nye iwu.

14 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kọwadaruworo akwụkwọ-nsọ nile ala n’otu, nke ha deworo, o nyere ha iwu ka ha kụzie ihe nile ahụ nke ọ kọwadaruworo ala nye ha.