Akwụkwọ nsọ
Jakọb 7


Isi 7

Sherọm wee gọnarị Kraịst, wee nwe ndọrọ-ndọrọ ya na Jekọb, wee rịo ihe iriba-ama ma nwee ihe otiti site n’aka Chineke—Ndị-amụma nile ekwuwo maka Kraịst na aja mgbaghara mmehie ya—Ndị Nifaị wee bichaa ụbọchị ha nile dịka ndị mkpagharị, a mụrụ ha n’ime mkpagbu ma akpọrọ ha asị site n’aka ndị Leman. Ihe dịka n’afọ 544 ruo 421 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo mgbe ụfọdụ afọ gafesịworo, otu nwoke wee bịa n’etiti ndị nke Nifaị, nke aha ya bụ Sherọm.

2 Ma o wee ruo na ọ malitere ikwusa okwu n’etiti ndị mmadụ, ma na-ekwupụtara ha na e kwesịghị inwe Kraịst. Ma o kwusara ọtụtụ ihe ndị bụ otuto n’esịghị n’obi nye ndị mmadụ, ma nke a ka o mere ka o wee kwatuo ozizi nke Kraịst.

3 Ma ọ rụsịrị ọrụ ike ka o wee dufuo obi nile nke ndị mmadụ, nke mere na o dufukwara ọtụtụ obi, ma ya, ebe ọ matara na mụ, Jekọb, nwere okwukwe na Kraịst onye ga-abịa, ọ chọrọ nnukwu ohere ka o wee bịakwute m.

4 Ma o nwere mmụta, nke na o nwere ọmụma zuru-oke nke asụsụ nke ndị ahụ; ya mere, o nwere ike ijiri nnukwu otuto n’esịghị n’obi, na nnukwu ike ikwu okwu, dịka ike nke ekwensu.

5 Ma o nwere olile-anya ịkwanye m site n’okwukwe ahụ, na-agbanyeghị ọtụtụ amkpughe ahụ na ọtụtụ ihe ahụ nke m hụworo gbasara ihe ndị a; n’ihi na n’ezie a hụwo m ndị mụọ-ozi, ma ha eziwokwa m rịị ozi. Na kwa, anụwo m rịị olu nke Onye-nwe na-agwa m okwu n’ezigbo okwu, site n’oge ruo n’oge; ya mere, e nweghị ike ịkwagharị m.

6 Ma o wee ruo na ọ bịakwutere m, ma n’ụdị a ka ọ gwara m okwu, na-asị: Nwanne m nwoke Jekọb, a chọwo m nnukwu ohere ka m wee gwa gị okwu; n’ihi na a nụwo m ma a ma kwa m na ị na-aga nnukwu njem, na-ekwusa ihe i na-akpọ ozi-ọma, ma-ọbụ ozizi nke Kraịst.

7 Ma i dufuwo ọtụtụ ndị mmadụ nke mere na ha na-agbanwe ezị ụzọ nke Chineke, ma aghara idebe iwu nke Moses nke bụ ezi ụzọ; ma gbanwe iwu nke Moses n’ikpere otu ihe nke i siri na ọ ga-abịa ọtụtụ narị afọ n’ọdịn’iru. Ma ugbua lee, mụ, Sherọm, na ekwupụtara gị na nke a bụ ikwuhie Chineke; n’ihi na ọdịghị onye matara maka ụdị ihe ndị a; n’ihi na o bnweghị ike ikwu maka ihe ndị ga-abịa. Ma n’ụdị a ka Sherọm jiri dọso m ndọrọ-ndọrọ.

8 Mana lee, Onye-nwe Chineke wunyere aMụọ Ya n’ime mkpụrụ-obi m, nke mere na m megharịrị ya anya n’ime okwu ya nile.

9 Ma m wee sị ya: I na-agọnarị Kraịst ahụ onye ga-abịa? Ma o wee si: O bụrụ na e nwere otu Kraịst ga-dị, a gaghị m agọnarị ya; Mana ama m na o nweghị Kraịst dị, ọbụghị ma o nwewọrịị ma-ọbụ o nwere mgbe ọ ga-adị.

10 Ma m wee sị ya: I kwenyere n’akwụkwọ-nsọ nile? Ma ọ siri, E.

11 Ma m wee sị ya: Mgbe ahụ ị naghị aghọta ha; n’ihi na ha n’ezie na-agba ama maka Kraịst. Lee, a sị m gị na enwebeghị otu onye-amụma deworo, ma-ọbụ abuo-amụma, ma ọbụghị na ha kwuworo gbasara Kraịst.

12 Ma nke a abụghị ihe nile—e mewo ka ọ pụta ìhè nke ọma nye m, n’ihi na a nụwo m ma hụ; ma emekwara ka ọ pụta ìhè nye m site an’ike nke Mụọ Nsọ; ya mere, ama m na ọbụrụ na ọdịghị aja mgbaghara mmehie a chụrụ mmadụ nile bga-efu.

13 Ma o wee ruo na ọ sịrị m: Gosị m aihe iriba-ama site n’ike nke Mụọ Nsọ a, nke i mataworo nnukwu ihe maka ya.

14 Ma m wee sị ya: Gịnị ka m bụ na m ga a nwa Chineke ka o gosị gị ihe iriba-ama n’ihe nke ị mataworo na ọ bụ aezi-okwu? Mana ị ga-agọnarị ya, n’ihi na i bụ nke bekwensu. Otu o sila dị ọbụghị uche m ga-eme; kama ọbụrụ na Chineke ga-akutu gị, ka nke ahụ bụrụ ihe iriba-ama nye gị na ọ nwere ike, ma n’elu igwe ma n’elu ụwa; na kwa, na Kraịst ga-abịa. Ma ka uche Gị, O Onye-nwe, mee, ma ọbụghị nke m.

15 Ma o wee ruo na mgbe mu, Jekọb, kwuworo okwu ndị a, ike nke Onye-nwe bịakwasịrị ya, nke mere na ọ dara n’ala. Ma o wee ruo na azụrụ ya ọtụtụ ụbọchị.

16 Ma o wee ruo na ọ gwara ndị mmadụ: Gbakọta nụ echi, n’ihi na aga m anwụ; ya mere, a chọsiri m ike ịgwa ndị mmadụ okwu tutu mụ anwụọ.

17 Ma o wee ruo na echi ahụ igwe-mmadụ ahụ gbakọtara otu ebe; ma o wee kwuoro ha okwu dị mfe nghọta ma gọnarị ihe ndị ahụ nile nke ọ kụziworo ha, ma kwupụta Kraịst ahụ, na ike nke Mụọ Nsọ, na nkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi.

18 Ma o wee gwa ha okwu dị mfe nghọta, na e aduhiewo ya site n’ike nke bekwensu. Ma o wee kwuo maka ala-mụọ, na maka mgbe ebighi-ebi, na maka ntaram-ahụhụ ebighi-ebi.

19 Ma o wee sị: Egwu na-atụ m ka ọ ghara ịbụ na mụ emewo ammehie nke na-enweghị mgbaghara, n’ihi na e kwuworo m Chineke okwu ụgha; n’ihi na a gọnarịrị m Kraịst, ma sị na e kwere m n’akwụkwọ-nsọ nile; ma ha n’ezi okwu na-agba-ama maka ya. Ma n’ihi na e jiwo m otu a kwuoro Chineke okwu ụgha ana m atụsi egwu ike ka ọ ghara ịbụ na ọnọdụ m ga-adị begwu; mana a na m ekwupụtara Chineke.

20 Ma o wee ruo na mgbe o kwuworo okwu ndị a nile o nweghị kwa ike ikwu karịa, ma o wee arara mụọ ya nye.

21 Ma mgbe igwe mmadụ ahụ hụworo na o kwuru ihe ndị a dịka ọ chọrọ ịnwụ, ọ tụrụ ha n’anya karịa; nke mere na ike nke Chineke bịakwasịrị ha, ma ọ akarịrị ha nke mere na ha dara n’ala.

22 Ugbua, ihe nke a masịrị m, Jekọb, n’ihi na a rịọwo m ya site n’aka Nna m nke bi n’elu-igwe; n’ihi na ọ nụwo akwa m ma zaa ekpere m.

23 Ma o wee ruo na udo na ịhụ-n’anya nke Chineke ka e weghachiri ọzọ n’etiti ndị mmadụ ahụ; ma ha wee anyochaa akwụkwọ-nsọ nile, ma ghara kwa ịn̄a-ntị n’okwu nile nke ajọọ mmadụ a.

24 Ma o wee ruo na ọtụtụ ụzọ ka a chọpụtara iji anwetaghachị ma weghachi ndị Leman na ọmụma nke ezi-okwu ahụ; mana ha nile bụ bnke efu, n’ihi na ha nwere mmasị cn’ịlụ agha na dịkwafu ọbara, ma ha nwere eịkpọ-asị ebighi-ebi megide anyị, bụ ụmụnne ha. Ma ha chọrọ site n’ike nke aka ha ibibi anyị n’esepụghị aka.

25 Ya mere, ndị nke Nifaị chekwasiri onwe ha ike megide ha site na ngwa-agha ha nile, na site n’ike ha nile, na-atụkwasị-obi na Chineke ahụ na ankume nke nzọpụta ha; ya mere, ha ka bụ kwa, ndị nwe mmeri nke ndị iro ha nile.

26 Ma o wee ruo na mụ, Jekọb, malitere ịka-nka; ma akụkọ-ndekọta nke ndị a a na-edebe an’epekele ndị ọzọ nke Nifaị, ya mere, ana m eweta akụkọ-ndekọta a na ngwụcha, na ekwupụta na e dewo m dịka m kachasịrị mata, site n’ikwu na oge sooro anyị gafee, na kwa bndụ anyị gafere, dịka na nrọ, ebe anyị bụ ndị nọọrọ onwe ha na ndị mmadụ dị nwayọ, ndị ngagharị, a chụpụrụ site na Jerusalem, a mụrụ n’ime mkpagbu, n’ime ọzara, ma nwe mkpọrọm-asị site n’aka ụmụnne anyị, nke kpatara agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile; ya mere, anyị ruru uju n’ụbọchị ndụ anyị nile.

27 Ma mụ, Jekọb, hụrụ na aga m agbada n’ala-ili m na nso nso; ya mere, a sịrị m nwa m nwoke aInos: Were epekele ndị a. Ma a gwara m ya ihe nile nke nwanne m nwoke Nifaị bnyeworo m n’iwu, ma o wee kwe nkwa nrube-isi nye iwu ndị ahụ nile. Ma m wee bịa na ngwụcha nke ihe odide m n’elu epekele ndị a, nke ihe odide ya dịworo ntakịrị; ma nye onye-na-agụ ya a na m asị nọdụ mma, na-enwe olile-anya na ọtụtụ ụmụnne m nwoke ga-agụ okwu m nile. Ụmụnne m nwoke, nọdụnụ mma.