Isi 5
(Jun–Oktoba 1830)
Adam na Iv amụta ụmụ—Adam achụọ aja nye ma fee Chineke ofufe—A mụọ Ken na Ebel—Ken enupu isi, hụ Setan n’anya karịa Chineke, ma ghọọ nwa nwoke nke ila n’iyi—Igbu mmadụ na ime ihe ọjọọ a gbaa mbara—Ozi-ọma ahụ ka e zisara site na mmalite.
1 Na o wee ruo na mgbe mụ, Onye-nwe Chineke, chụpụsịworo ha site n’ogige ubi Iden ahụ, Adam wee malite ịkọ ọrụ n’ala ahụ, na inwe ike ọchịchị n’elu anụ ọhịa nile, na-iri achịcha ya site na ọsụsọ nke iku anya ya, dịka mụ Onye-nwe nyeworo ya na iwu. Ma Iv, nwunye ya kwa nọnyeere ya na-ịrụ ọrụ.
2 Ma Adam wee mara nwunye ya, ma o wee mụọ ụmụ ndịkom nile nye ya na ụmụ ndịnyom nile, ha weekwa malite ịba ụba na na-ejupụta ụwa.
3 Ma site mgbe ahụ gawa, ụmụ ndịkom nile, na ụmụ ndịnyom nile nke Adam malitere na-ekewa abụọ na abụọ n’ime ala ahụ, ma na-arụ ọrụ n’ala ahụ, na-elekọtakwa igwe anụ ụlọ nile, ma ha mụtakwara ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom nile.
4 Ma Adam na Iv, nwunye ya, wee kpọkuo aha Onye-nwe, ma ha nụrụ olu okwu nke Onye-nwe site n’ụzọ ahụ ebe Ogige Ubi Iden dị, ka ọ na-ekwu okwu nye ha, ma ha ahụghị ya anya; n’ihi na-emechibidowo kwa ha ụzọ site n’iru ya.
5 Ma o wee nye ha iwu-nsọ nile, na ha ga-efe Onye-nwe Chineke ha ofufe, na ha ga-enye ụmụ mbụ nile nke igwe ewu na atụrụ ha ka ha bụrụ ihe onyinye nye Onye-nwe. Na Adam rubere isi nye iwu-nsọ nile nke Onye-nwe.
6 Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị otu mụọ ozi nke Onye-nwe wee pụtakwute Adam, na-asi: Gịnị mere ị na-achụ aja nile nye Onye-nwe? Ma Adam wee sị ya: Amataghị m, ewezuga na Onye-nwe nyere m iwu ka m mee nke a.
7 Ma mgbe ahụ mụọ ozi ahụ wee kwuo okwu na-asị: “Ihe nke a bụ nnọchite anya nke aja ahụ nke Onye ahụ Nna Mụrụ Nanị Ya chụrụ, onye nke jupụtara na amara na ezi-okwu”.
8 Ya mere, i ga-eme ihe ọbụla i na-eme n’aha nke Ọkpara ahụ, ma ị ga-echegharị ma kpọkuo Chineke n’aha nke Ọkpara ahụ ruo mgbe nile karịa.
9 Ma n’ụbọchị ahụ Mụọ Nsọ wee dakwasị Adam, nke na-agba ama banyere Nna na Ọkpara ahụ, na-asị: Abụ m Onye ahụ Nna mụrụ nanị ya site na mmalite, site ugbụ a gaa n’iru ma ruo mgbe nile n’ihi na dịka i daworo, ka e wee gbapụta gị na mmadụ nile, ọbụna ọtụtụ bụ ndị a ga-agbapụta.
10 Ma n’ụbọchị ahụ Adam wee gọzie Chineke, na wee jupụta na Mụọ Nsọ, na wee malite ibu amụma gbasara ezi na ụlọ nile nke ụwa, na-asị: Ngọzi na-adịrị aha nke Chineke, maka n’ihi njehie m anya m nile emeghewo, ma n’ime ndụ nke a ka m ga-enwe ọn̄ụ, ọzọ kwa n’anụ arụ ka m ga-ahụ Chineke.
11 Ma Iv, nwunye ya, wee nụrụ ihe ndịa nile ma nwee obi ụtọ, na-asị: Ma ọbụghị n’ihi njehie anyị, anyị-agaraghị enwe mkpụrụ, anyị agaraghị ama ezi ihe na ihe ọjọọ, na an̄ụrị nke mgbapụta anyị, na ndụ ebighi-ebi nke Chineke na-enye ndị nile na-erubere ya isi.
12 Ma Adam na Iv wee gọzie aha nke Chineke, ma ha wee mee ka ụmụ ndịkom ha nile ma ụmụ ndịnyom ha nile mara ihe nile.
13 Ma Setan bịara n’etiti ha, na-asị: Abụkwa m nwa Chineke; O wee nye ha iwu na-asị: Unu ekwerekwala nke a, ma ha ekwereghi nke a, ha wee hụkwa Setan n’anya karịa Chineke. Ma mmadụ wee malite site mgbe ahụ gaa n’iru ịbụ nke anụ arụ, nke mmetụta ma ndị na-eso ekwensu.
14 Ma Onye-nwe Chineke wee kpọkuo ndị mmadụ site na Mụọ Nsọ ebe nile ma nye ha iwu na ha ga-echegharị;
15 Ma ka ha ra bụ ndị kweere n’Ọkpara ahụ ma chegharịa site na mmehie ha nile, ka a ga-azọpụta; ma ka ha ra bụ ndị na-ekweghị ma chegharịghị, ka a ga-ama ikpe ọkụ ala mụọ; ma okwu nile ahụ sitere n’ọnụ nke Chineke pụọ n’iwu ọkụ dị ike; ya mere a ga-emezurịrị ha.
16 Ma Adam na Iv, nwunye ya, a kwụsịghị ịkpọku Chineke. Ma Adam wee mara nwunye ya, o wee dịrị ime ma mụọ Ken, ma o wee sị: “Enwetawo m nwoke site n’aka Onye-nwe; ya mere ọ gaghị ajụ okwu ya nile”. Mana lee, Ken an̄aghị ntị, na-asị: Onye ka Onye-nwe bụ m ga-eji mara ya?
17 Iv wee dịkwa ime ọzọ ma mụọ nwa nne ya nwoke Ebel. Ma Ebel n̄ara ntị n’olu okwu nke Onye-nwe. Ma Ebel bụ onye na-edebe atụrụ, mana Ken bụ onye na-akọ ala ubi.
18 Ma Ken hụrụ Setan n’anya karịa Chineke. Setan wee nyekwa ya iwu sị: Nye Onye-nwe onyinye.
19 Ma mgbe oge na-aga, o wee ruo na Ken wetara site na mkpụrụ nke ala ihe onyinye iji nye Onye-nwe.
20 Ma Ebel, ya onwe ya kwa wee weta ụmụ mbụ nke igwe ewu na atụrụ ya na mmanụ abụba nke si na ha, ma Onye-nwe wee nwee nsọpụrụ nye Ebel na onyinye ya;
21 Mana nye Ken, na onyinye ya, o nweghị nsọpụrụ. Ugbua Setan matara nke a, ma o wee masị ya. Ma Ken were oke iwe, ma iru ya wee gbarụọ.
22 Ma Onye-nwe wee sị Ken: Gịnị mere ị na-ewe oke iwe? Gịnị mere iru gị ji gbarụọ?
23 Ọbụrụ na i mere nke ọma, a ga-anara gị. Ma ọbụrụ na i meghị nke ọma, mmehie dina na ọnụ ụzọ, ma Setan na-achọ ịnara gị; ewezuga ma ị ga-an̄a ntị nye iwu nsọ m nile, aga m enyefe gị, ma ọ ga-adịrị gị dịka ọchịchọ ya siri dị. Ma ị ga-achị isi nye ya.
24 N’ihi na site n’oge nke a gaa n’iru i ga-abụ nna nke okwu ụgha ya nile, a ga-akpọ gị nke Ịla n’Iyi; n’ihi na ị nọkwa tutu ụwa adịrị.
25 Ma a ga-ekwu n’oge na-abịa—Na ihe arụ nile ndịa ka e nwetara site n’aka Ken; n’ihi na ọ jụwo ndụmọdụ nke kacha, nke e nwetaworo site na Chineke; ma nke a bụ ọbụbụ-ọnụ nke m ga-edebe n’isi gị, ewezuga ma i chegharịrị.
26 Ma Ken were oke iwe, ma o geghị kwa ntị ọzọ n’olu okwu nke Onye-nwe, o geghị kwa Ebel nwa nne ya nwoke ntị, onye na-eje ije na-ịdị nsọ n’iru Onye-nwe.
27 Ma Adam na nwunye ya wee ruo uju n’iru Onye-nwe n’ihi Ken na ụmụnne ya.
28 Na o wee ruo na Ken lụrụ otu n’ime ụmụ ndịnyom nke ụmụnne ya ndịkom dịka nwunye ya, ma ha wee hụ Setan n’anya karịa Chineke.
29 Ma Setan wee gwa Ken okwu sị: N̄ụọ iyi nye m site na-iji akpịrị gị, ma ọbụrụ na ị ga-agwa mmadụ nke a na ị ga-anwụ; mee ka ụmụnne gị ndị nwoke jiri isi ha nile n̄ụọ iyi, na site na-iji Chineke dị ndụ, na ha agaghị agwa ya mmadụ; n’ihi ọbụrụ na ha agwa ya mmadụ, ha ga-anwụ anwụ n’ezie; na nke a, ka nna gị ghara ịmara maka ya; ma taa ka m ga-enyefe nwanne gị nwoke Ebel n’aka gị nile.
30 Ma Setan wee n̄ụọ iyi nye Ken na ya ga-eme dịka o nyere n’iwu. Ma ihe nile ndịa ka e mere na nzuzo.
31 Ma Ken wee sị: N’ezi-okwu abụ m Mahan, onye-isi ihe oke nzuzo nke a, na m ga-egbụ mmadụ ma nweta úrù. Ya mere e wee kpọọ Ken Onye isi Mahan, ma ọ wee na-anya isi n’ime ajọọ-omume ya.
32 Ma Ken wee baa n’ime ubi, kwuo kwa okwu ya na Ebel, nwanne ya nwoke. Ma o wee ruo na mgbe ha nọ n’ala ubi ahụ, Ken wee bilie megide Ebel, nwanne ya nwoke, wee gbuokwa ya.
33 Ma Ken wee na-anya isi n’ime ihe nke ahụ nke o meworo, na-asị: Enwerewo m onwe m; n’ezie igwe ewu na atụrụ nile nke nwanne m nwoke adabawo n’aka m nile.
34 Ma Onye-nwe wee sị Ken: Olee ebe Ebel nwanne gị nwoke nọ? Ma o wee sị: Amataghị m. Abụ m onye nche nwanne m nwoke?
35 Ma Onye-nwe wee sị: Gịnị ka i meworo? Olu okwu ọbara nwanne gị nwoke na-ebe akwa nye m site n’ala.
36 Ma ugbua ị ga-abụ onye abụworo ọnụ site na ala ahụ nke megheworo ọnụ ya ịnara ọbara nwanne gị nwoke site n’aka gị.
37 Mgbe i na-akọ ala ubi site ugbua gaa n’iru ọ gaghị enye gị ike ya ọzọ. Gị onwe gị ga-abụ onye mgbagharị ọsọ na Onye njegharị n’ime ụwa.
38 Ma Ken wee sị Onye-nwe: Setan nwara m ọnwụnwa n’ihi igwe ewu na atụrụ nile nke nwanne m nwoke. Ma oke iwe wee weekwa m; n’ihi onyinye ya ahụ nke gị onwe gị natara ya ma ị nataghị nke m; ahụhụ m adịwo ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.
39 Lee ị chụpụwo m na ezi taa site n’iru nke Onye-nwe, site kwa n’iru gị ka a ga-ezo m, ma aga m abụ onye mgbagharị ọsọ na onye njegharị n’ime ụwa; ma ọ ga-eru na onye ahụ nke ga-achọta m ga-egbu m, n’ihi ajọọ-omume m nile, n’ihi na e zoghị ihe ndịa nile site n’Onye-nwe.
40 Ma mụ, Onye-nwe, wee sị ya: Onye ọbụla nke na-egbu gị, ka a ga abọ ọbọ okpukpu asaa n’arụ ya. Na mụ, Onye-nwe wee dobe ákàrà n’arụ Ken, ka onye ọbụla nke na-ahụ ya wee ghara igbu ya.
41 Na e wee mechibido Ken ụzọ site n’iru nke Onye-nwe, ma ya na nwunye ya na ọtụtụ n’ime ụmụ nne ya ndịkom wee biri n’ime ala nke Nod, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Iden.
42 Ma Ken wee mara nwunye ya, o wee dịrị kwa ime ma mụọ Inọk, ma o wee mụtakwa ọtụtụ ụmụ ndịkom nile na ụmụ ndịnyom nile. Ma o wee wuo otu obodo, ma kpọọ obodo ahụ aha dịka aha nwa ya nwoke si dị, Inok.
43 E wee mụọ Irad nye Inọk, na ụmụ ndịkom nile ndị ọzọ na ụmụ ndịnyom nile. Ma Irad wee mụta Mahujel, na ụmụ ndịkom ọzọ nile na ụmụ ndịnyom nile. Ma Mahujel wee mụta Metushael na ụmụ ndịkom ọzọ na ụmụ ndịnyom nile. Ma Metushael wee mụọ Lemek.
44 Ma Lemek wee lụọ ndị nwunye abụọ nye onwe ya, aha otu bụ Eda, ma aha nke ọzọ bụ Zila.
45 Ma Eda wee mụọ Jebel; ọ bụ nna nke ndị ahụ na-ebi n’ụlọ ikwụụ nile, ha bụkwa ndị nile na-edebe anụ ụlọ; ma aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye bụ nna nke ndị nile ahụ na-akpọ ụbọ akwara na ọja.
46 Ma Zila mụtakwara Tubal Ken, onye nkụzi nke ndị nile na-eme nka nke bras na igwe. Ma aha nwanne nwanyị nke Tubal Ken bụ Neama.
47 Ma Lemek wee sị ndị nwunye ya, Eda na Zila: Nụrụ nụ olu okwu m, unu ndị nwunye Lemek, n̄aa nụ ntị n’okwu m; n’ihi na egbuwo m onye nwoke n’ihi mmeru arụ m, ọ bụkwa nwaokoroọbịa ka m gburu n’ihi ntirụ arụ m.
48 Ọbụrụ na a ga-abọ ọbọ Ken okpukpu asaa, ezie Lemek ga-abụ iri okpukpu asaa na asaa.
49 N’ihi na Lemek na Setan abanyewo na ọgbụgba ndụ na-omume nke Ken, nke mere na ọghọwo Onye-isi Mahan, onye isi nke oke ihe nzuzo ahụ nke Setan nyere n’aka Ken; ma Irad, nwa nwoke Inọk onye mataworo izuzu nzuzo ha, malitere ikpughe ya nye ụmụ ndịkom nile nke Adam.
50 Ya mere Lemek, n’ihi iwe wee gbuo ya, ọbụghị dịka Ken ji gbuo nwanne ya nwoke Ebel, n’ihi iji nweta uru, mana o gburu ya n’ihi ịn̄ụ iyi ahụ.
51 N’ihi, site n’ụbọchị nile nke Ken, e nwere ntụgwa nzuzo, ma ọrụ ha nile na-abụkwa n’ọchịchịrị, ma ha mataworo nwoke ọbụla nwa nne ya nwoke.
52 Ya mere Onye-nwe wee bụọ Lemek na ụlọ ya ọnụ; ma ha nile bụ ndị ha na Setan meworo ọgbụgba ndụ; n’ihi na ha edebeghị iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ọ masịghị Chineke, ma o kwusaghịkwa ozi ọma nye ha, ma ọrụ ha nile wee bụrụ ihe arụ nile, na wee malite ịgbasa n’etiti ụmụ ndịkom nile nke ndị mmadụ. Ma o wee dịrị n’etiti ụmụ ndịkom nile nke ndị mmadụ.
53 Ma n’etiti ụmụ ndịnyom nile nke ndị mmadụ, ekwughị ihe ndị a nile, n’ihi na Lemek e kwupụtawo ihe nzuzo ahụ nye ndị nwunye ya, ma ha wee nupu isi megide ya, ma kwusaa ihe ndịa nile gaa n’ezi, ma ha emeghị ebere;
54 Ya mere na-eledara Lemek anya, chụpụ kwa ya, ma ọ bataghị kwa n’etiti ụmụ ndịkom nile nke ndị mmadụ, adịghị ama-ama na ọ ga-anwụ.
55 Na otua ka ọrụ nile nke ọchịchịrị malitere iwere ọnọdụ n’etiti ụmụ ndịkom nile nke mmadụ.
56 Ma Chineke wee bụọ ụwa ọbụbụ ọnụ iwe ma o wee weso ndị ajọ mmadụ iwe tinyere ụmụ ndịkom nile nke mmadụ ndị nke o meworo.
57 N’ihi na ha enweghi ike ịn̄a ntị n’olu okwu ya, ma-ọbụ kwere na Ọkpara ọ Mụrụ Nanị Ya, ọbụna onye ahụ onye o kwupụtaworo ga-abịa n’etiti oge a kara aka, onye a kwadoworo site tutu ntọ-ala nke ụwa.
58 Na otua ka esi malite izisa Ozi-ọma, site na mmalite, nke ndị na-ekwusa ya bụ ndị mụọ ozi nile dị nsọ ndị ezitaworo site n’iru nke Chineke, na site n’olu okwu nke ya, na site n’onyinye nke Mụọ Nsọ.
59 Na otua ka e mesịrị ihe nile ike nye Adam, site na emume nsọ, ma Ozi-ọma nke ekwusaworo, na iwu ọkụ e zipuworo, ka ọ dịrị n’ime ụwa, tutu ruo na-ọgwụgwụ ya; na otua ka ọ dịworo. Amen.