Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 19


Isi 19

Ndị na-eso ụzọ iri na abụọ ahụ wee kwusaara ndị ahụ ozi-ọma ma kpee ekpere maka Mụọ Nsọ—E mere ndị na-eso ụzọ ya ahụ baptism ma ha anata Mụọ Nsọ na nkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi—Jisus wee kpee ekpere na-eji okwu nile nke a na-enweghị ike ide ede—Ọ gbara-ama maka nnukwu okwukwe karịrị-akarị nke ndị Nifaị. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus rigoroworo n’elu-igwe, igwe-mmadụ ahụ gbasara, ma nwoke ọbụla kpọọrọ nwunye ya na ụmụ ya ma laghachị n’ụlọ nke ya.

2 Ma e wee mee mkpọtụ maka ya ebe nile n’etiti ndị ahụ otu mgbe ahụ, tutu ọchịchịrị agbaa, na igwe-mmadụ ahụ ahụwo Jisus, ma na o ekwusawo ozi-ọma nye ha, ma na o ga-egosị kwa onwe ya igwe-mmadụ ahụ echi ya.

3 E, ma ọbụna abalị ahụ nile e mere mkpọtụ ebe nile gbasara Jisus; ma nke mere na ha zipụgakwuru ndị ahụ na e nwere ọtụtụ, e, nnukwu ọnụ-ọgụgụ karịrị akarị, rụrụ ọrụ karịa abalị ahụ nile, ka ha wee nwe ike n’echi ya ịnọ n’ebe Jisus ga-egosị igwe-mmadụ ahụ onwe ya.

4 Ma o wee ruo na n’echi ya, mgbe igwe-mmadụ ahụ gbakọtara, lee, Nifaị na nwanne ya nwoke onye o kuliteworo site na ndị nwụrụ-anwụ, onye aha ya bụ Timoti, na kwa nwa ya nwoke, onye aha ya bụ Jonas, na kwa Matonaị, na Matonaịha, nwanne ya nwoke, na Kumen, na Kumenọnhaị, na Jeremaịa, na Shemnọn, na Jonas, na Zedekaịa, na Aịsaịa—ugbua ndị a bụ aha nile nke ndị na-eso ụzọ ahụ ndị Jisus họrọworo—ma o wee ruo na ha gara nʼiru ma guzoro n’etiti igwe-mmadụ ahụ.

5 Ma lee, igwe-mmadụ ahụ dịịrị nnukwu nke mere na ha mere ka e kewa ha n’otu iri na abụọ.

6 Ma iri na abụọ ahụ kuziiri igwe-mmadụ ahụ, ma lee, ha mere ka igwe-mmadụ ahụ sekpuru n’elu iru ala, ma ka ha kpee ekpere nye Nna n’aha nke Jisus.

7 Ma ndị na-eso ụzọ ahụ kpekwara ekpere nye Nna n’aha nke Jisus. Ma o wee ruo na ha bilitere ma kwusaara ndị ahụ ozi-ọma.

8 Ma mgbe ha kụziworo otu okwu ndị ahụ nke Jisus kwuworo—na-enweghị ihe dị iche site n’okwu nile nke Jisus kwuworo—lee, ha sekpukwara ala ọzọ ma kpeere Nna ekpere n’aha nke Jisus.

9 Ma ha kpere ekpere maka ihe ahụ nke ha chọkarịchara; ma ha chọrọ ka enye ha aMụọ Nsọ.

10 Ma mgbe ha kpeworo otu a, ha gbadara ruo na nkọ mmiri ahụ, ma igwe-mmadụ ahụ sooro ha.

11 Ma o wee ruo na Nifaị gbadara an’ime mmiri ahụ ma e mee ya baptism.

12 Ma ọ pụtara site na mmiri ahụ ma malite ime baptism. Ma o mere ndị nile ahụ Jisus họrọworo baptism.

13 Ma o wee ruo mgbe e ameworo ha nile baptism ma ha apụtawo site na mmiri ahụ, Mụọ Nsọ dakwasịrị ha, ma ha jupụtara na bMụọ Nsọ na n’ọkụ.

14 Ma lee, a agbachibidoro ha gburu-gburu dịka ọbụ jiri ọkụ; ma o si n’elu-igwe gbadata, ma igwe-mmadụ ahụ hụrụ ya, ma gbaa-ama; ma ndị mụọ-ozi gbadatara site n’elu-igwe ma kuziere ha ozi-ọma.

15 Ma o wee ruo na mgbe ndị mụọ-ozi ahụ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ahụ ozi ọma, lee, Jisus bịara ma guzoro n’etiti ma kụziere ha ozi-ọma.

16 Ma o wee ruo na ọ gwara igwe-mmadụ ahụ okwu, ma nye ha iwu ka ha sekpuru kwa ọzọ n’elu ala, na kwa na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị isekpuru nʼelu ala ahụ.

17 Ma o wee ruo na mgbe ha nile sekpuruworo n’ala, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ikpe ekpere.

18 Ma lee, ha malitere ikpe ekpere; ma ha kpere ekpere nye Jisus, na-akpọ ya Onye-nwe ha na Chineke ha.

19 Ma o wee ruo na Jisus pụrụ site n’etiti ha, ma gapụtụ ntakịrị site n’ebe ha nọ ma kpọọ isi n’ala, ma ọ sị:

20 Nna, ekele m gị na i nyewo ndị a nke m họrọworo Mụọ Nsọ; ma ọ bụ n’ihi okwukwe ha na mụ ka m họrọworo ha site n’ụwa.

21 Nna, arịọ m gị ka inye ndị nile ga e kwere n’okwu ha nile Mụọ Nsọ.

22 Nna, i nyewo ha Mụọ Nsọ n’ihi na ha kwere na mụ; ma i hụrụ na ha kwere na mụ n’ihi na ịnụrụ olu ha, ma ha na-ekpere m; ma ha na-ekpere m n’ihi na mụ na ha nọ.

23 Ma ugbua Nna, ana m arịọ gị maka ha, na kwa maka ndị ahụ nile nke ga e kwere n’okwu ha nile, ka ha wee kwere na m, ka m wee nọrọ n’ime ha adịka gị, Nna, nọ n’ime m, ka anyị wee bụrụ botu.

24 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kpeworo otu a nye Nna, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, ma lee, ha gakwara n’iru, na-esepụghị aka, ikpere ya; ma ha aamụbaghị ọtụtụ okwu, n’ihi na e nyere ha ihe ha bga-ekpe, ma ha jupụtara n’inwe mmasị.

25 Ma o wee ruo na Jisus gọziri ha dịka ha na-ekpe ekpere nye ya; ma mbara-iru ya kekwasịrị ha iru-ọchị, ma ìhè nke ambara-iru ya mụkwasịrị ha, ma lee ha dị bọcha ka mbara-iru na kwa uwe-nsọ nile nke Jisus; ma lee ọcha ya karịrị ọcha nile, e, ọbụna onweghị ihe dị n’ụwa dị ọcha ka ọcha ya.

26 Ma Jisus sịrị ha: Na-ekpe ekpere; otu o sila dị, ha akwụsịghị ikpe ekpere.

27 Ma otụgharịkwara ọzọ site n’ebe ha nọ, ma gapụtụ ntakịrị ma kpọọ isi n’ala; ma o kpekwara ekpere ọzọ nye Nna, na-asị:

28 Nna, ekele m gị na i asachawo ndị ahụ m họrọworo, n’ihi okwukwe ha, ma a na m ekpere ha ekpere, na kwa ndị ahụ ga-ekwere n’okwu ha nile, ka e wee sachaa ha na m, site n’okwukwe n’okwu ha nile, ọbụna dịka a na-asachaa ha na m.

29 Nna anaghị m ekpe ekpere maka ụwa, kama maka ndị nke i nyeworo m asite n’ụwa, n’ihi okwukwe ha, ka e wee sachaa ha na m, ka m wee nọrọ n’ime ha dịka gị, Nna, nọ n’ime m, ka anyị wee bụrụ otu, ka e wee too m n’ime ha.

30 Ma mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a ọ bịakwutekwara ndị na-eso ụzọ ya ọzọ; ma lee ha kpesiri ekpere ike, esepụghị-aka, nye ya; ma o kekwasịkwara ha iru-ọchị ọzọ; ma lee ha dị aọcha ọbụna dịka Jisus.

31 Ma o wee ruo na ọ gapụtụkwara ntakịrị ọzọ ma kpee ekpere nye Nna;

32 Ma ire enweghị ike ikwu okwu nile nke o kpere, ọbụghị ma mmadụ o nwere ike aide okwu nile nke o kpere.

33 Ma igwe-mmadụ ahụ nụrụ ma na-agba ama; ma obi ha ghere oghe ma ha ghọtara n’ime obi ha okwu nile nke o kpere.

34 Otu o sila dị, nnukwu na ịtụ-n’anya ka okwu nile nke o kpere dị nke mere na e nweghị ike ide ha ede, ọbụghị ma mmadụ o nwere ike aịkwupụta ha.

35 Ma o wee ruo na mgbe Jisus bịaworo na ngwụcha nke ikpe ekpere, ọ bịakwutekwara ndị na-eso ụzọ ya ọzọ, ma sị ha: Nnukwu aokwukwe dị otu a ka m na-ahụtụbeghị n’etiti ndị Juu nile; ya mere enweghị m ike igosi ha ọrụ-ebube nile dị nnukwu otu a, n’ihi bekweghị-ekwe ha.

36 N’ezie asị m unu, onweghị ndị ọbụla n’ime ha nke hụworo nnukwu ihe ndị dịka ndị nke unu hụworo; ọbụghị ma ha nụrụ nnukwu ihe ndị dịka ndị nke unu nụworo.