Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 19


Isi 19

Aịsaịa wee kwuo dịka Mesaịa—Ndị mmadụ nọ n’ọchịchịrị ga-ahụ oke ìhè—A mụwo otu nwa nye anyị—Ọ ga-abụ Ọkpara-Eze nke Udo ma ọ ga-achị n’oche-eze Devid—Tulee Aịsaịa 9. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Otu o sila dị, mgbachu ya agaghị abụ ụdị ọ dịrị n’oge mkpasu iwe ya, mgbe mbụ ọ kpagburu aala Zebulọn ntakịrị ya na ala nke Naftalaị, ma mesịa kwa nye mkpagbu karịrị n’ụzọ Oke Osimiri Uhie n’ofe Jọdan dị na Galilee nke mba nile.

2 Ndị ahụ jegharịworo an’ọchịchịrị ahụwo nnukwu ìhè, ndị ahụ na-ebi n’ala nke onyinyo ọnwụ, ha ka ìhè mụkwasịworo.

3 I mewo ka mba ahụ baa ụba, ma amee ka ọn̄ụ ha bawanye ụba—ha na-an̄ụ ọn̄ụ n’iru Gị dịka ọn̄ụ oge owuwe ihe ubi, na dịka ndị mmadụ na-an̄ụ ọn̄ụ mgbe ha na-eke ihe akwatara n’agha.

4 N’ihi na I gbajisịwo nkekọta ahụ nke ibu-arụ ya, na mkpa-n’aka nke ubu ya, okporo nke onye-na-achị ya ọchịchị aka ike.

5 N’ihi na ọgụ ọbụla nke onye-agha mkpọtu mmegharị-anya na-eso ya, na uwe atụrụrụ n’ọbara; mana nke a ga-abụ nke nsure ọkụ na mmanu ọkụ nke ọkụ.

6 N’ihi na amụworo anyị otu anwa, enyewo anyị otu nwa-nwoke; ma bọchịchị ga-adị n’elu ubu ya; ma a ga-akpọ aha ya, Onye-ebube, Onye-ndụmọdụ, cChineke bụ Dike, dNna nke Mgbe nile na-adigide, eỌkpara-Eze nke Udo.

7 Maka mbawanye nke aọchịchị na udo ya bonweghị njedebe, n’elu oche-eze Devid, na n’elu ala-eze ya, ime ka o guzozie, na iwube ya n’ikpe na n’ikpe zịrị-ezi site ugbua ga n’iru, ọbụna ruo mgbe nile. Ọnụnụ ọkụ-n’obi nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha ga-emezu nke a.

8 Onye-nwe zigara okwu ya nye Jekọb ma o wee dakwasị aIsrael.

9 Ma ndị nile ga-amata, ọbụna Ifrem na ndị bi na Sameria, ndị na-ekwu site na mpako na obi ukwu sị:

10 Aja-ụlọ adasịwo, ma anyị ga-eji okwute atụrụ atụ wuo; osisi sicamọ nile ka egbutusịworo, ma na anyị ga-agbanwe ha ka ha bụrụ osisi sịda.

11 Ya mere, Onye-nwe ga-akpọta ndị-iro nile nke aRizịn megide ya, ma jikọta ndị-iro ya ọnụ;

12 Ndị Sirịa n’iru na ndị Filistịa n’azụ; ma ha ga-eghebe ọnụ ha oghe arichapụ Israel. N’ihe ndị a nile biwe ọkụ ya alaghachịghị azụ, ma aka ya ka setịpụtara.

13 N’ihi na ndị ahụ aanaghị atụgharịkwute ya bụ onye na-eti ha otiti ihe, ọbụghị ma ha na-achọ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha.

14 Ya mere Onye-nwe ga-ebepụ site n’Israel isi na ọdụdụ, ngalaba na igu nkwụ n’ime otu ụbọchị.

15 Ochịe ahụ, ọbụ ya bụ isi; ma onye-amụma ahụ nke na-akụzi nkuzi ụgha nile, ọ bụ ya bụ ọdụdụ ahụ.

16 N’ihi na ndị ndu nile nke ndị a na-akpatara ha mmehie; ma ndị ahụ ha na-edu ka ebibiri.

17 Ya mere Onye-nwe agaghị enwe ọn̄ụ n’ebe ụmụ-okorọbịa ha nọ, ọbụghị ma ọ ga-enwe aobi ebere n’ebe ndị-na-enweghị nna na ndịnyom isi-mkpe nọ; n’ihi na onye ọbụla n’ime ha bụ onye-iru-abụọ na onye ajọọ-omume, ma ọnụ nile na-ekwu okwu bnzuzu. N’ihi ihe ndị a nile, iwe ọkụ ya adịghị atụgharị, ma na caka ya ka setịpụtara.

18 N’ihi ajọọ-omume na-ere dịka ọkụ; ọ ga-erechapụ uke na ogwu nile, ma ọ ga-enwu ọkụ n’ime osisi nile dị agbidigbi na oke ọhịa nile, ma ha ga-akwụli elu dịka nkwụli-elu nke anwụrụ ọkụ.

19 Site n’oke iwe nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha ka ala gbajiri ojii, ma ndị mmadụ ahụ ga-adị ka mmanụ ọkụ nke ọkụ ahụ; aọdịghị onye ga-edobe nwanne ya.

20 Ma ọ ga-apụnara n’aka nri ma agụụ ga-agụ ya; ma a ga-eri ihe n’aka ekpe ma ha agaghị enwe afọ ojuju; ha ga-eri onye ọbụla anụ-arụ nke ogwe-aka onwe ya—

21 aManase, bIfrem, na Ifrem, Manase; ha ga-ejikọta megide cJuda. N’ime ihe nile ndị a iwe ya atụgharịghị azụ, ma na aka ya ka setịpụtara.