Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 13


Isi 13

Jisus wee kụziere ndị Nifaị Ekpere nke Onye-nwe—Ha ga-akpado akụ nile n’elu-igwe—Iri na abụọ ahụ na ije-ozi ha e nyere ha iwu nsọ ka ha ghara ichegbu onwe ha maka ihe nile nke ụwa a—Tulee Matiu 6. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 N’ezie, n’ezie, asị m na ọ dị m ka asị na unu ga-enye ndị ogbenye aonyinye; mana kpachara-anya ka unu ghara inye ndị ogbenye onyinye n’iru ndị mmadụ ka ha wee hụ unu; ma ọdịghị otu a, unu enweghị ụgwọ ọrụ nke Nna unu nke bi n’elu-igwe.

2 Ya mere, mgbe unu ga-enye ndị ogbenye onyinye egbula opi na-aga, dịka ndị iru-abụọ ga-eme n’ụlọ-nzukọ nile na n’okporo-ụzọ nile, ka ha wee nweta aotuto nke ndị mmadụ. N’ezie asị m unu, ha enwetawo ụgwọ ọrụ ha.

3 Ma mgbe unu na-enye onyinye ekwela ka aka ekpe unu mata ihe aka nri unu na-eme;

4 Ka onyinye unu nyere wee bụrụ na nzuzo; ma Nna unu onye na-ahụ na nzuzo, n’onwe ya ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ n’ebe anya-na-ahụ.

5 Ma mgbe unu ana-ekpe ekpere unu agaghị eme ka ndị iru-abụọ, n’ihi na ha hụrụ ikpe ekpere, iguzoro n’ụlọ-nzukọ nile na n’akụkụ okporo-ụzọ nile n’anya, ka ndị mmadụ wee hụ ha. N’ezie asị m unu, ha enwetawo ụgwọ ọrụ ha.

6 Mana unu, mgbe unu na-ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ-nta unu, ma mgbe unu mechiworo ụzọ, kpeere Nna unu onye nọ na nzuzo; ma Nna unu, onye na-ahụ na nzuzo, ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ n’ebe anya-na-ahụ.

7 Mana mgbe unu na-ekpe ekpere, ejila okwu-nkwukwasị na abaghị uru, dịka ndị na-ekweghị-ekwe, n’ihi na ha chere na a ga-anụ olu ha maka ikwu ọtụtụ okwu ha.

8 Unu adịkwala ka ha, n’ihi na Nna unu amatara ihe ndị dị unu mkpa tutu unu arịọ ya.

9 Ya mere n’ụdị ausoro nke a bna-ekpe nu ekpere: cNna anyị nke bi n’elu-igwe, ka e doo aha Gị nsọ.

10 Ka e mee ọchịchọ Gị n’ụwa dịka ọ dị n’elu-igwe.

11 Ma gbaghara anyị ụgwọ nile anyị ji, dịka anyị si na-agbaghara ndị ji anyị ụgwọ.

12 Ma aedubala anyị n’ime ọnwụnwa, kama napụta anyị site n’ihe ọjọọ.

13 N’ihi na nke Gị ka ala-eze bụ, ma ike, ma otuto, ruo mgbe nile. Amen.

14 N’ihi na, ọbụrụ na unu ana-agbaghara ndị mmadụ njehie ha nile Nna unu nke elu-igwe ga-agbaghakwara unu;

15 Mana ọbụrụ na unu agbagharaghị ndị mmadụ njehie ha nile ọbụghị ma Nna unu ọ ga-agbaghara njehie unu nile.

16 Nke ka nke, mgbe unu ana-ebu-ọnụ unu adịla ka ndị iru-abụọ, na-edebe mbara iru ha na mwute, n’ihi na ha na-emebi ụdị iru ha ka ha gosipụta ndị na-ebu-ọnụ n’iru ndị mmadụ. N’ezie asị m unu, ha enwetawo ụgwọ ọrụ ha.

17 Mana unu, mgbe unu na-ebu-ọnụ, tee isi unu mmanụ, ma saa iru unu;

18 Ka unu ghara igosipụta n’iru ndị mmadụ na unu na-ebu-ọnụ, kama nye Nna unu, onye nọ na anzuzo; ma Nna unu, onye na-ahụ na nzuzo, ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ n’ebe anya na-ahụ.

19 Akpadokwala akụ nye onwe unu n’elu ụwa, ebe ahụhụ na nchara na-emebi ihe, ma ndị-ori na-etịka baa ma zuo ori;

20 Mana debere onwe unu aakụ n’elu-igwe, ebe ma-ọbụ ahụhụ ma-ọbụ nchara na-adịghị emebi, na ebe ndị-ori na-anaghị etịka baa ma-ọbụ zuo ori.

21 N’ihi na ebe akụ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adị kwa.

22 aÌhè nke arụ bụ anya; ya mere, ọbụrụ na, anya unu elekwasị otu ebe, arụ unu nile ga ejupụta n’ìhè.

23 Mana ọbụrụ na anya unu dị njọ, arụ unu nile ga-ejupụta n’ọchịchịrị. Ya mere, ọ bụrụ na, ìhè nke dị n’ime unu bụrụ ọchịchịrị, lee otu ọchịchịrị ahụ ga-aha n’ịdị ukwuu!

24 Ọ dịghị onye nwere ike aife nna-ukwu abụọ; n’ihi na ma ọbụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, ma-ọbụ ma ọdịghị otu ahụ ọ ga-ejide otu ma lelịa nke ọzọ. Unu enweghị ike ife Chineke na Mamọn.

25 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu nile ndị a, o lekwasịrị iri na abụọ ahụ ndị ọ họrọworo anya, ma sị ha: Cheta okwu nile ndị m kwuworo. N’ihi na lee, unu bụ ndị nke m họrọworo aikwụsa ozi-ọma nye ndị a. Ya mere asị m unu, bechegbula onwe unu maka ndụ unu, ihe unu ga-eri, ma-ọbụ ihe unu ga-an̄ụ; ma-ọbụ kwa maka arụ unu, ihe unu ga-eyịkwasị. Ọ bụghị ndụ karịrị ihe oriri, na arụ ọ karịghị ihe oyiyi?

26 Lee anụ-ufe nile nke ikụkụ, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ọbụghị ma ha na-aghọ mkpụrụ ma-ọbụ kpokọta tiba n’ọba nile; mana Nna unu nke elu-igwe na-enyeju ha afọ. Ọ bụ na unu ejighi ihe dị ukwuu kara ha mma?

27 Onye n’ime unu site n’ichegbu onwe ya ga-enwe ike itinye otu kubit n’ogologo ya?

28 Ma gịnị mere unu jiri na-echegbu onwe unu maka ihe oyiyi? Tulee okoko-osisi nile nke ubi otu ha si na-eto; ha anaghị arụ ọrụ, ọbụghị ma ha na-akụ ogho;

29 Ma na asị m unu, na ọbụna Solomon, n’otuto ya nile, achọghị ya mma dịka otu n’ime ndị a.

30 Ya mere, ọbụrụ na Chineke siri otu ahụ yiwe ahịhịa nke ubi uwe, nke dị taa, ma echi atụba ya n’ite ọkụ, ọbụna otu ahụ ka ọ ga-esi yiwe unu uwe, ma ọbụrụ na unu abụghị ndị okwukwe nta.

31 Ya mere echegbula onwe unu, na-asị, Gịnị ka anyị ga-eri? Ma ọbụ, Gịnị ka anyị ga-an̄ụ? Ma ọbụ, Gịnị ka a ga-eji yiwe anyị uwe?

32 N’ihi na Nna unu nke elu-igwe matara na ihe ndị a nile na-akpa unu.

33 Mana buru nụ ụzọ chọọ aala-eze nke Chineke na ezi-omume ya, ma a ga-agbakwunyere unu ihe nile ndị a.

34 Ya mere echerela onwe unu maka echi, n’ihi na echi ga-echere onwe ya maka ihe nile nke onwe ya. Ihe ọjọọ dị na ya ezuworo ụbọchị.