Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 6


NAJS, Matiu 6:14 (tụlee ihe dị iche na Matiu 6:13; e mere mgbanwe nile dị otua na Luk 11:4)

(Onye-nwe anaghị eduba anyị n’ime ọnwụnwa.)

14 E kwe kwala ka e duba anyị n’ime ọnwụnwa, kama napụta anyị site n’ihe ọjọọ.

NAJS, Matiu 6:22 (tụlee ihe dị iche na Matiu 6:22)

(Ọbụrụ na anya anyị nile elekwasị nanị n’otuto nke Chineke, arụ anyị nile ga-ejupụta n’ìhè.)

22 Ìhè nke arụ bụ anya; ya mere ọbụrụ n’anya unu elekwasị nanị n’otuto nke Chineke, arụ unu nile ga-ejupụta n’ìhè.

NAJS, Matiu 6:38 (tụlee ihe dị iche na Matiu 6:33)

(Anyị kwesịrị ibu ụzọ chọọ ka e wuo ala-eze nke Chineke.)

38 Ya mere, unu achọla ihe nile nke ụwa nkea kama buru nụ ụzọ chọọ ka e wulite ala-eze nke Chineke, hiwekwa ezi-omume ya nile, a ga-atukwasị kwara unu ihe ndị a nile.