Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 7


Isi 7

Aịsaịa wee kwuo okwu dịka Mesaịa—Mesaịa ahụ ga-enwe ire nke onye nwere mmụta—Ọ ga-agbanyere ndị mmekpa-arụ azụ ya—Ọ gaghị enwe mgbagwọjụ-anya—Tulee Aịsaịa 50. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 E, n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: E wezugawo m unu, ma-ọbụ chụpụ unu ruo mgbe nile? N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: Olee ebe ọnụ ahịa edepụtara maka alụkwaghị m nke nne unu dị? Onye ka m wezugaworo unu nye, ma-ọbụ onye n’ime ndị m ji ụgwọ ka m resịworo unu? E, onye ka m resịworo unu? Lee, n’ihi ajọọ-omume nile unu ka unu areworo onwe unu, ma n’ihi njehie nile unu ka e wezugaworo nne unu.

2 Ya mere, mgbe m bịara, ọdịghị nwoke nọ; mgbe m akpọrọ oku, e, ọdịghị onye nọ ịza ya. O ụlọ nke Israel, aka m ọdịwo mkpụmkpụ ma olị nke mere na ọ gaghị enwe ịke ịgbapụta, ma-ọbụ enweghị m ịke ịnapụta? Lee, n’ịbasi mba ike m, a na m eme ka boke osimiri taa, a na m eme ka ciyi ha nile ghọ ọzara na dazụ ha ka ha na-esi isi n’ihi mmiri ahụ nile atasịwo, ma ha na-anwụ n’ihi akpịrị ịkpọ-nkụ.

3 A na m eyikwasị elu-igwe nile uwe di aojii, ma a na m eme bakwa uwe igba-mkpe ihe mkpuchi arụ ha.

4 Onye-nwe Chineke enyewo m aire nke ndị nwere mmụta, ka m nwe ike mata otu m ga-esi kwuo okwu n’oge ya nye gị O ụlọ nke Israel. Mgbe ike gwụrụ unu ọ na-eteta ụtụtụ kwa ụtụtụ. Ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe, dịka ndị nwere mmụta.

5 Onye-nwe Chineke emeghewo antị m, ma enupụghị m isi, ọbụghị ma m leghachiri anya n’azụ site n’ebe ọ nọ.

6 E nyere m azụ m aonye-otiti-ihe, ma nti m nile ka m nyere ha bụ ndị na-efopu ntụtụ-isi. E zopughị m iru m site n’ihere na ọbụbụ asụ.

7 N’ihi na Onye-nwe Chineke ga-enyere m aka, ya mere agaghị m enwe mgbagwọ-ju-anya, Ya mere, edoziwo m iru m dịka okwute, ma a ma m na ihere agaghị eme m.

8 Ma Onye-nwe nọ nso, ma Ọ gụnyewo m n’onye ezi-omume. Onye ga-adọso m ndọrọ-ndọrọ? Ka anyị gụzokọta. Onye bụ onye-iro m? Ka ọ bịa m nso, ma a ga m akụtu ya site n’ike nke ọnụ m.

9 N’ihi na Onye-nwe Chineke ga-enyere m aka. Ma ndị nile aga-ekwutọ m, lee, ha nile ga-aka nka dịka uwe, ma akịka ga-erichapụ ha.

10 Onye nọ n’etiti unu na-atụ egwụ Onye-nwe, nke na-erube isi an’olu oru ya, nke na-aga ije n’ọchịchịrị ma o nweghị ìhè?

11 Lee, unu nile ndị na-amụnye ọkụ, ndị na-eji icheku ọkụ gbaa onwe unu gburu-gburu, gaa nụ ije n’ime ìhè nke aọkụ na nke icheku ọkụ nke unu mụnyeworo. Nke a ka unu ga-enweta n’aka m—unu ga-edịna ala na mwute.