Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 19


Isi 19

Nifaị wee mee epekele nke ntụ igwe ma dee akụkọ nke ndị ya—Chineke nke Israel ga-abịa na narị afọ isii site n’oge Lihaị jiri hapụ Jerusalem—Nifaị wee kọọ maka ahụhụ nile na mkpọgide n’obe Ya—Ndị Juu ka a ga-eleda anya ma kposasịa ruo n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, mgbe ha ga-alaghachịkwute Onye-nwe. Ihe dịka n’afọ 588 ruo 570 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na Onye-nwe nyere m iwu, ya mere e mere m epekele nile nke ntụ igwe ka m wee kanye n’elu ha akụkọ-ndekọta nke ndị m. Ma n’elu epekele nile ahụ m mere a kanyere m akụkọ-ndekọta nke nna m, na kwa njem anyị nile n’ime ọzara, na amụma nile nke nna m; na kwa ọtụtụ ibu-amụma ndị nke m ka m kanyeworo n’elu ha.

2 Ma a mataghị m n’oge m mere ha na Onye-nwe ga-enye m iwu ka m mee epekele ndị a; ya mere, akụkọ-ndekọta nke nna m, na akụkọ-agbụrụ nke nna ya ha, ma ọtụtụ ihe mere mgbe anyị nọ n’ime ọzara ka a kanyere n’elu epekele ndị nke mbụ bụ ndị m kwuworo maka ha; ya mere, ihe ndị mere tutu mụ emee epekele ndị a bụ, n’ezi okwu, e kwuru ihe gbasara ya n’uju n’elu epekele ndị nke mbụ.

3 Ma mgbe m mesịworo epekele ndị ahụ dịka e si nye m n’iwu, mụ, Nifaị, natara iwu-nsọ nʼije-ozi na ibu-amụma nile, akụkụ ndị dị mfe nghọta na oke mkpa n’ime ha, ka a ga-ede n’elu epekele ndị a; ma na ihe ndị e dere kwesịrị idebe ka e were kuziere ndị m, onye ga-enwe ala ahụ, na kwa maka ebum-n’obi ndị ọzọ bara uru, bụ ebum-n’obi ndị Onye-nwe ma nke ọma.

4 Ya mere, mụ, Nifaị, dere akụkọ-ndekọta n’elu epekele ndị ọzọ, nke na-enye nkọwasị, ma-ọbụ nke na-enye nnukwu nkọwasị maka agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile na mbibi nile nke ndị m. Ma nke a ka m meworo, ma nye ndị m iwu ihe ha ga-eme mgbe m gafeworo; na kwa na epekele ndị a ka a ga na-enyefe site n’otu ọgbọ ruo n’ọzọ, ma-ọbụ site n’aka otu onye-amụma ruo n’ọzọ, ruo mgbe a ga-anata iwu-nsọ ọzọ site n’aka Onye-nwe.

5 Ma nkọwasị maka ime epekele ndị a ka a ga-enye ma emesịa; ma mgbe ahụ, lee, a na m a ga n’iru dịka ihe m kwuworo siri dị; ma nke a ka m mere ka ọtụtụ ihe ndị dị nsọ ga-abụ ihe e debere maka mmata nke ndị m.

6 Otu o sila dị, a naghị m ede ihe ọbụla n’elu epekele ma ọbụghị nke m chere na ọ dị nsọ. Ma ugbua, ọbụrụ na m dehie, ọbụna ndị ochie dehiekwara; ọ bụghị na m ga-agbanarị ụta n’ihi ndị ọzọ, ma n’ihi adịghị ike nke dị n’ime m, dịka n’anụ arụ, a ga m ewezuga onwe m n’ụta.

7 Maka ihe ndị nke ụfọdụ mmadụ chere na ha bụ nnukwu ihe, ma na arụ ma na mkpụrụ-obi, ndị ọzọ kpọrọ ya ihe efu na-azọgide ha n’okpuru ụkwụ ha. E, ọbụna Chineke nke Israel ahụ ka ndị mmadụ na-azọgide n’okpuru ụkwụ ha; A sị m, zọgide n’okpuru ụkwụ ha; ma a ga m ekwu n’ụzọ ọzọ—ha kpọrọ ya ihe efụ, ma ha anaghị an̄a ntị n’olu nke ntụzi-aka ya nile.

8 Ma lee ọ na-abịa, dịka okwu nke mụọ-ozi, n’ime narị afọ isii site na mgbe nna m hapụrụ Jerusalem.

9 Ma ndị ụwa, n’ihi ajọọ-omume ha, ga-ekpe ya ikpe ka ọ bụrụ ihe efu; ya mere ha ga-apịa ya ụtarị, ma ọ ga-ekwe ka ọ dị otu a, ma ha ga-akụ ya ihe, ma ọ ga-ekwe ka ọ dị otu a. E, ha ga-abụkwasa ya asụ n’arụ, ma ọ ga-ekwe ka ọ dị otu a, n’ihi ịhụ-n’anya na obi ebere ya na ogologo ntachi-obi ya n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ.

10 Ma Chineke nke nna anyị ha, ndị edupụtara site n’Ijipt, site n’ịbụ-oru, na kwa chekwa ha n’ime ọzara, e, Chineke nke Abraham, na nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, raara onwe ya nye, dịka okwu nile nke mụọ-ozi ahụ siri dị, dịka mmadụ, n’ime aka ndị ajọọ mmadụ, ka e bulie ya elu, dịka okwu nile nke Zinọk, na ka a kpọgide ya n’obe, dịka okwu nile nke Niụm, ma ka e lie ya n’ili, dịka okwu nile nke Zinọs, nke o kwuru gbasara ụbọchị atọ nke ọchịchịrị, nke ga-abụ ihe ịrịba ama e nyere maka ọnwụ ya nye ndị ga-ebi na ala ndị bi n’etiti oke osimiri nile, nke ka nke, nye ndị bụ nke ụlọ nke Israel.

11 N’ihi otu a ka onye-amụma ahụ kwuru: Onye-nwe Chineke n’ezie ga-eleta ụlọ nke Israel nile n’ụbọchị ahụ, ụfọdụ n’olu ya, n’ihi ezi-omume ha, ruo na nnukwu ọn̄ụ na nzọpụta ha, ma ndị ọzọ o ji egbe-elu igwe nile na amụma nile nke ike ya, site n’ebili mmiri, site n’ọkụ, na site n’anwụrụ ọkụ, na igirigi nke ọchịchịrị, na site mmeghe nke ala, na site n’ugwu ukwu nile nke a ga-ebuli elu.

12 Ma ihe nile ndị a n’ezie ga-emezurịrị, ka onye-amụma Zinọs kwuru. Ma okwute nile nke ala ga-agbawasịrịrị; ma n’ihi isu ude nke ala, ọtụtụ ndị eze nke ala ndị di n’etiti oke osimiri nile ka a ga-akwalite site na Mụọ nke Chineke ka ha tie mkpu sị; Chineke nke okike na-ata ahụhụ.

13 Ma ọbụrụ ma ndị bi na Jerusalem, ka onye-amụma ahụ kwuru, mmadụ nile ga-esogbu ha, n’ihi na ha na-akpọgide Chineke nke Israel n’obe, ma tụgharịa obi ha n’ebe ọzọ, jụ ihe iriba-ama nile na ihe-ebube nile, na ike na ebube nke Chineke Israel ahụ.

14 Ma n’ihi na ha tụgharịrị obi ha n’ebe ọzọ, ka onye-amụma ahụ kwuru, na kwa leda Onye-Nsọ nke Israel anya, ha ga na-akpagharị n’anụ arụ, ma laa n’iyi, ma ghọọ ihe ịma ọsụ na okwu gara-aga, ma bụrụ ndị a kpọrọ asị n’etiti mba nile.

15 Otu o sila dị mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa, ka onye-amụma ahụ kwuru, nke ha na-agaghị kwa atụgharị obi ha megide Onye-Nsọ nke Israel, mgbe ahụ ka ọ ga-echeta ọgbụgba-ndụ nile ahụ nke ya na nna ha gbaworo.

16 E, mgbe ahụ ka ọ ga-echeta ala ndị di n’etiti oke osimiri; e, ma ndị nile bụ ndị nke ụlọ nke Israel, ka m ga-achịkọbata, ka Onye-nwe kwuru, dịka okwu nke onye-amụma Zinọs, site n’akụkụ anọ nile nke ụwa.

17 E, ma ndị ụwa nile ga-ahụ nzọpụta nke Onye-nwe, ka onye-amụma ahụ kwuru; mba nile, ebo, asụsụ na mmadụ nile ka a ga-agozi.

18 Ma mụ, Nifaị, edowo ihe ndị a nye ndị m, na e leghị anya e nwere m ike gbaa ha ume ka ha cheta Onye-nwe, bụ Onye-mgbapụta ha.

19 Ya mere, a na m agwa ụlọ nke Israel nile okwu, ma ọbụrụ na ha ga-enwe ike inweta ihe nile ndị a.

20 Ma lee, e nwere m ọtụtụ ọrụ n’ime mụọ, nke mere ka ike gwụ m, ọbụna na njikọ arụ m nile esighị ike, maka ndị nke nọ na Jerusalem; n’ihi na ọ bụrụ na Onye-nwe enweghị obi ebere, igosị m gbasara ha, ọbụna dịka o si nwe ndị-amụma na mgbe ochie, a gara m alakwa nʼiyi.

21 Ma n’ezie o gosịrị ndị-amụma nile nke mgbe ochie ihe nile gbasara ha; na kwa o gosịrị ọtụtụ gbasara anyị, ya mere, ọ dị mkpa na anyị ma gbasara ha n’ihi e dere ha n’elu epekele bras ahụ.

22 Ugbua o wee ruo na mụ, Nifaị, kuziri ụmụ nne m nwoke ihe ndị a nile; ma o wee ruo na a gụụrụ m ha ọtụtụ ihe, ndị a kanyere n’elu epekele nile nke bras, ka ha wee mata ihe gbasara ihe-omume nile nke Onye-nwe n’ala ndị ọzọ, n’etiti ndị mgbe ochie.

23 Ma a gụụrụ m ha ọtụtụ ihe ndị e dere n’akwụkwọ nile nke Moses; ma ka m nwe ike gbaa ha ume n’uju ka ha kwere n’Onye-nwe bụ Onye-mgbapụta ha, a gụụrụ m ha ihe ndị onye-amụma Aịsaịa dere; n’ihi na e jiri m akwụkwo-nsọ nile tụnyere anyị onwe-anyị, nke ga-eme ka anyị nweta uru na mmụta.

24 Ya mere, a gwara m ha okwu, sị: Nụrụ nụ okwu nile nke onye-amụma, unu ndị bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Israel, ngalaba nke ekewapụrụ-ekewapụ; nụrụ nụ okwu nile nke onye-amụma, nke e dere nye ụlọ nke Israel nile, ma were nụ onwe unu tụnyere ha, ka unu wee nwe olile-anya na kwa ụmụnne unu nwoke bụ ndị esịrị n’arụ ha kewapụta unu, n’ihi n’ụdị a ka onye-amụma ahụ deworo.