Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 17


Isi 17

Jisus wee tụziere ndị ahụ aka ịtụgharị-uche n’okwu ya nile ma kpee ekpere maka nghọta—O wee gwọọ ndị ọrịa ha—O wee kpeere ndị ahụ ekpere, jiri asụsụ nke a na-enweghị ike ide ede—Ndị mụọ-ozi wee kwusaa ozi-ọma ma ọkụ wee gbachibido ụmụ-ntakịrị ha gburu-gburu. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Lee, ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu nile ndị a, o lekwara anya gburu-gburu ọzọ n’igwe-mmadụ ahụ, ma ọ sịrị ha: Lee aoge m adịwo nso.

2 Ahụrụ m na unu adịghị ike, na unu enweghị ike aịghọta okwu m nile nke Nna nyere m iwu ịgwa unu n’oge nke a.

3 Ya mere, gaa nụ n’ụlọ unu nile, ma atụgharịa-uche n’ihe nile nke m kwuworo, ma jụọ Nna, n’aha m, ka unu wee ghọta, ma bkwado echiche unu nile maka cechi, ma aga m abịakwute unu ọzọ.

4 Mana ugbua ana m aagakwuru Nna, na kwa bigosi cagbụrụ nile nke Israel ndị furu efu onwe m, n’ihi ha efunarịghị Nna efunarị, n’ihi na ọ matara ebe ọ kpọgara ha.

5 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo otu a, ọ lepụkwara anya ya gburu-gburu ọzọ n’igwe-mmadụ ahụ, ma hụ na ha nọ n’anya-mmiri, ma lekwasịgide ya anya dịka ha ga-asị ya nọnyere kwuo ha nwa ogologo oge.

6 Ma ọ sịrị ha: Lee, afọ m nile jupụtara an’ọmiko n’ebe unu nọ.

7 Unu nwere ndị na-arịa ọrịa n’etiti unu? Kpọtanụ ha. Unu nwere ndị dara ngwọrọ, ma-ọbụ kpuru-isi, ma-ọbụ ndị na anaghị a ga ije, ma-ọbụ ndị na-enwezughị ụkwụ na aka, ma-ọbụ ndị ekpenta, ma-ọbụ ndị arụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ma-ọbụ ndị ntị chiri, ma-ọbụ ndị nwere nsogbu n’ụdị ọbụla? Kpọta nụ ha ma a ga m agwọ ha, n’ihi na enwere m obi ọmiko n’ebe unu nọ; afọ m nile jupụtara n’obi ebere.

8 N’ihi na ahụrụ m na unu chọrọ ka m gosị unu ihe m meworo ụmụnne unu nọ na Jerusalem, n’ihi na ahụrụ m na aokwukwe unu bzuru-ezu na m kwesịrị ịgwọ unu.

9 Ma o wee ruo na mgbe o kwuworo otu a, igwe-mmadụ ahụ nile, n’otu obi, gara nʼiru kpọrọ ndị ọrịa ha na ndị ha nwere mkpagbu, na ndị ngwọro ha, ma kpọrọ ndị ha kpuru-isi, ma kpọrọ ndị ha dara ogbu, ma kpọrọ ndị ha nile nwere mkpagbu n’ụdị ọbụla; ma ọ agwọro ha, onye ọbụla dịka e siri kpọtara ya ha.

10 Ma ha nile, ma ndị ahụ a gwọworo ma ndị arụ siri ike, kpọrọ isi-ala n’ụkwụ ya, ma fee ya; ma ka ha ra bụ ndị nwere ike ịbịa site n’igwe-mmadụ ahụ asutụrụ ụkwụ ya ọnụ, nke mere na ha jiri anya-mmiri ha saa ụkwụ ya arụ.

11 Ma o wee ruo na o nyere iwu ka a kpọta aụmụ-ntakịrị ha.

12 Ya mere ha kpọtara ụmụ-ntakịrị ha ma dozie ha ọdụ n’ala gbaa ya gburu-gburu, ma Jisus guzoro n’etiti; ma igwe-mmadụ ahụ nyere efe ruo mgbe a kpọtasịworo ha nye ya.

13 Ma o wee ruo na mgbe a kpọtasịworo ha, ma Jisus guzoro n’etiti ha, o nyere igwe-mmadụ ahụ iwu ka ha asekpuru n’ala ahụ.

14 Ma o wee ruo na mgbe ha sekpuruworo n’ala ahụ, Jisus suru-ude n’ime onwe ya, ma sị: Nna ana m enwe ansogbu n’ihi ajọọ-omume nke ndị nke ụlọ nke Israel.

15 Ma mgbe o kwuworo okwu ndị a, ya n’onwe ya kwa sekpuru n’ala ahụ; ma lee o kpere ekpere nye Nna, ma ihe ndị o kpere e nweghị ike ide ya ede, ma igwe-mmadụ ahụ ndị nke nụrụ ya gbara-ama.

16 Ma n’ụdị a ka ha na-agba ama: aAnya ahụtụbeghị, ọbụghị ma ntị ọ nụtụwo mbụ, nnukwu ihe dị otu a na ihe ịtụ-n’anya nile dịka anyị hụrụ ma nụ Jisus gwara Nna;

17 Ma ọdịghị aire nwere ike ikwu, ọbụghị ma mmadụ o nwere ike ide ha, ọbụghị ma obi nile nke ndị mmadụ ha nwere ike ịghọta nnukwu ihe dị otu a na ihe ịtụ-n’anya nile dịka anyị hụrụ ma nụ Jisus kwuru; ma ọdịghị onye nwere ike ịghọta maka ọn̄ụ nke jupụtara mkpụrụ-obi anyị nile n’oge ahụ anyị nụrụ ka ọ na-ekpere anyị ekpere nye Nna.

18 Ma o wee ruo na mgbe Jisus bịara na ngwụcha nke ikpe-ekpere nye Nna ahụ, o bilitere; mana aọn̄ụ nke igwe-mmadụ ahụ dị nnukwu nke mere na ọ karịrị ha.

19 Ma o wee ruo na Jisus gwara ha okwu, ma sị ha bilie.

20 Ma ha bilitere site n’ala ahụ, ma ọ sịrị ha: Ngọzi na-adịrị unu n’ihi okwukwe unu. Ma ugbua lee, ọn̄ụ m juru-eju.

21 Ma mgbe o kwuworo okwu ndị a, ọ akwara akwa, ma igwe-mmadụ ahụ gbara ama maka ya, ma o kuuru ụmụ-ntakịrị ha, n’otu n’otu, ma bgọzie ha, ma kpeere Nna ekpere maka ha.

22 Ma mgbe o meworo nke a ọ kwara akwa ọzọ;

23 Ma ọ gwara igwe-mmadụ ahụ okwu, ma sị ha: Lee ụmụ-ntakịrị unu.

24 Ma dịka ha lere anya ịhụ, ha lepụrụ anya ha nile chee-iru n’elu-igwe, ma ha hụrụ elu-igwe nile ka o meghere, ma ha hụrụ ndị mụọ-ozi na-arịdata site n’elu-igwe dịka ọ bụ n’etiti ọkụ; ma ha agbadatara ma gbachibido ụmụ-ntakịrị ahụ gburu-gburu, ma e jiri ọkụ gbachibido ha gburu-gburu; ma ndị mụọ-ozi ahụ kwusaara ha ozi-ọma.

25 Ma igwe-mmadụ ahụ hụrụ ma nụ ma gbaa-ama; ma ha matara na ama ha bụ ezi-okwu n’ihi na ha nile hụrụ ma nụ, onye ọbụla n’onwe ya; ma ha dị n’ọnụ-ọgụgụ ihe dịka mkpụrụ-obi puku abụọ na nari ise; ma ndị nọ n’ime ha bụ ndịkom, ndịnyom, na ụmụ-ntakịrị.