Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map 9: Ụwa nke Testament Ochie


Map 9

Ụwa nke Testament Ochie

Foto, oyiyi
Map Bible nsọ 9

N

Kaukasọs

Oke Osimiri Kaspịa

Ugwu Ararat?

Oke Osimiri Ojii

Uratu

Ndị Hoa

Troị

Ndị Het

Ua?

Heran (Pada-eram)

Asiria

Kakemish

Mesopotemịa

Nineve

Osimiri Yufretis

Ashọ

Akad (Akkad)

Mbara-ala nke Dọra

Shusan (Susa)

Osimiri Taigris

Babịlọn

Rodes

Kitim (Saịprọs)

Bebel (Shaina)

Siria

Kaftọ (Kret)

Ilam

Saịdọn

Fonisia

Damaskọs

Babịlọn

Taịa

Ọzara Arebịa

Ua?

Oke-osimiri Kineret (Oke Osimiri Galili)

Megido

Oke Osimiri ukwu ma-obu Elu elu (Oke Osimiri Mediterenia)

Jerusalem (Salem)

Oke Osimiri Ndịda (Gulf nke Pesia)

Kenean

Oke Osimiri Nnu (Oke Osimiri Nwụrụ anwụ)

Biasheba

Ala ọnụ mmiri nwere ọtụtụ Ngalaba nke Naịl

Goshen

Midian

Ọzala Libya

On

Ezion-geber

Ijipt

Naịl

Ugwu Sainai? (Họreb)

Oke Osimiri Uhie

Kilomita nile

0 100 200 300 400

A B C D E F G H

1 2 3 4

●1

●2

●3

●4

●5

●6

●7

●8

●9

●10

●11

●12

●13

●14

●15

●16

●17

  1. Ugwu Ararat Ọnọdụ ebe ọdịnala nke Ụgbọ Noa rutere ala (Jen. 8:4). Kpọm kwem ebe ahụ bụ nke na-amataghị.

  2. Ua Ebe mbụ nke Abraham biri, ebe ọfọdụrụ nwantịntị ka ọ bụrụ mmadụ e ji achụ aja, hụrụ otu mụọ-ozi nke Jehova, na natara Urim na Tumim (Jen. 11:28–12:1; Abr. 1; 3:1). (Rịba kwa ama ọnọdụ ebe ọzọ kwere omume ịbụ maka Ua na elu elu Mesopotemịa.

  3. Babịlọn, Bebel (Shaina) Kọsh, nwa nwoke nke Ham biri na ya nke mbụ, na Nimrọd. Ebe mmalite nke ndị Jared n’oge nke ụlọ-elu Tọwa nke Bebel na mbara-ala nile nke Shaịna. Na ikpeazụ isi-obodo nke nkewa nnukwu-obodo nke Babilonia na ebe obibi ndị eze nke Babilonia, tinyere Nebukadneza onye bupụrụ ọtụtụ ndị Juu na ndọkpụ n’agha baa n’ime nnukwu obodo nke a ka e bibisiri Jerusalem na 587 tutu a mụọ Kraịst. Ndị Juu nọgidere na ndọkpụ n’agha n’ime Babịlọn afọ dị 70 ruo n’oge nke Eze Sairọs, onye kwere ka ndị Juu lọta na Jerusalem iwugharị temple ahu. Daniel onye-amụma bi kwara n’ebea n’okpuru ọchịchị Nebukadneza, Belshaza, na Daraiọs I (Jen. 10:10; 11:1–9; 2 Ndez. 24–25; Jer. 27:1–29:10; Ezik. 1:1; Dan. 1–12; Ọmnaị 1:22; Ita 1:33–43).

  4. Shusan (Susa) Isi nnukwu obodo nke Mba ukwu ndị Pesia n’okpuru ọchịchị Daraiọs I (Daraiọs nke Nnukwu), Ksakses, (Ahasuerọs) na Ataksakses. Ebe obibi nke Ezenwanyị Esta, onye inwe ume na okwukwe ya zọpụtara ndi Juu. Daniel na n’ikpe-azụ Nehemaia fere ofufe n’ebea (Neh. 1:1; 2:1; Esta 1:1; Dan. 8:2).

  5. Mbara-ala nke Dọra Shedrak, Mishak na Abed-nego ka a tụbara n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu mgbe ha jụrụ ịkpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo nke Nebukadneza mere, ọkpara nke Chineke chekwara ha, na ha wee site n’ime ọkụ ahụ pụta na-emerụghị arụ (Dan. 3).

  6. Asiria Ashọ Bụụrụ isi obodo nke mbụ nke Asiria, nke Nineve sochiri. Ndị ọchịchị Asiria Shalmanesa V na Sagọn II meriri Ala-eze Elu-elu nke Israel n’agha na bupụrụ agbụrụ 10 ahụ na-ndọkpụ n’agha na 721 tutu a mụọ Kraịst, (2 Ndez. 14–15, 17–19). Asiria bụụrụ ihe-egwe nye Juda ruo 612 tutu a mụọ Kraịst, mgbe Babilọn meriri Asiria n’agha.

  7. Nineve Isi obodo nke Asiria. Asiria busoro ala nke Juda agha n’iwe n’oge ọchịchị Hezekaia na nkwusa ozi-ọma nke Onye-amụma Aịsaịa. Jerusalem, nnukwu isi obodo nke Juda ka a zọpụtara n’ụzọ ọrụ ebube mgbe otu mụọ-ozi mekpara igwe ndị-agha 185,000 nke Asiria arụ (2 Ndez. 19:32–37), Onye-nwe gwara Onye-amụma Jona ka ọ kpọta nnukwu obodo a na nchegharị (Jona 1:2; 3:1–4).

  8. Heran Abraham nọdụrụ ebea nwa oge tutu gawa Kenean. Nna Abraham na nwanne ya fọdụrụ ebea. Rebeka (nwunye Aịsak), na Rechel, Lia, Bilha, na Zilpa (ndị nwunye Jekob), sitere n’ebea bịa (Jen. 11:31–32; 24:10; 29:4–6; Abr. 2:4–5).

  9. Kakemish N’ebea ka Nebukadneza meriri Fero Neko n’agha, nke wetara na ngwụsị ike Ijipt na Kenean (2 Ihem. 35:20–36:6).

  10. Saịdọn Nnukwu obodo a bụ Saịdọn chọpụtara ya, otu nwa nwa Ham, na bụ nnukwu obodo Kenean dịkarịsịrị n’eluelu (Jen. 10:15–20). Ọ bụụrụ ebe obibi Jezebel, onye webatara ofufe Beal n’ime Israel (1 Ndez. 16:30–33).

  11. Taịa Nke a bụụrụ otu nnukwu obodo ịzụ-ahịa na ọdọ-ụgbọ mmiri na Siria. Hiram nke Taịa zigara Cedar na ọla-edo na ndị-ọrụ inyere Solomon aka na-iwu temple ya (1 Ndez. 5:1–10, 18; 9:11).

  12. Damaskọs Abraham dọpụtara Lot na nso ebea. Ọ bụụrụ isi nnukwu obodo Siria. N’ime oge ọchịchị Eze Devid, ndị Israel meriri nnukwu obodo a n’agha. Elaịja tere Hazeal mmanụ n’isi ịbụ eze nye Damaskọs (Jen. 14:14–15; 2 Sam. 8:5–6; 1 Ndez. 19:15).

  13. Kenean Abraham na ụmụ ya ka e nyere ala a maka inwere ya ruo mgbe-nile na-adịgide (Jen. 17:8).

  14. Ugwu Saịnaị (Horeb) Onye-nwe kwuuru Moses okwu site n’ọhịa na-ere ọkụ (Ọpụ. 3:1–2). E nyere Moses iwu na Iwu-nsọ iri ahụ (Ọpụ. 19–20). Onye-nwe kwusaara Elaịja okwu n’olu nta nke dị ezi nwayọọ (1 Ndez. 19:8–12).

  15. Ezion-geba Eze Solomon wuru “igwe ụgbọ-mmiri-agha” na Ezion-geba (1 Ndez. 9:26). Ikekwe na ọdọ ụgbọ mmiri a, ka eze-nwanyị nke Sheba mgbe ọ nụsịrị ezi-aha nke Solomon, bịaruru ịhụ ya (1 Ndez. 10:1–13).

  16. Ijipt Abraham jere ebea n’ihi oke ụnwụ dị na Ua (Abr. 2:1, 21). Onye-nwe gwara Abraham ka ọ kụziere ndị Ijipt ihe o kpugheworo nye ya (Abr. 3:15). Ụmụnne ndi nwoke nke Josef rere ya baa na-ịbụ oru (Jen. 37:28). Josef ghọrọ onye ọchịchị nke ụlọ Potifa n’ebea. A tụbara ya n’ime ụlọ mkpọrọ. Ọ kọwara nrọ Fero na e nyere ya ọnọdụ ikike n’Ijipt. A kpọkọtara Josef na ụmụnne ya ndị nwoke ọnụ. Jekọb na ezi na ụlọ ya gafere ebea (Jen. 39–46). Ụmụ Israel biri na Goshen nwantịntị oge ha nọdụrụ n’Ijipt (Jen. 47:6).

    Ndi Israel bara ụba na “nwee ume nke ukwu nke ukwu”; mgbe ahụ ndị Ijipt wee tinye ha n’oru (Ọpụ. 1:7–14). Mgbe ha nwesịrị otu usoro ahụhụ ajọ ọrịa. Fero kwere ka Israel hapụ Ijipt (Ọpụ. 12:31–41). A kpọgara Jeremaịa n’Ijipt (Jer. 43:4–7).

  17. Kaftọ (Kret) Ala ochie nke ndị Maịnoa.