Map 10
Kenean n’ime Oge nIlE Testament Ochie
N
Saịdọn
Damaskọs
Ugwu nile nke Lebanọn
Ugwu Hemọn
Litani
Fepa
Taịa
Fonisia
Dan (Laish)
Hazọ
Ọdọ mmiri Hule (Mmiri nile nke Merọm)
Akọ
Basha
Oke Osimiri Kineret (Oke Osimiri Galili)
Kishọn
Ndagwurugwu nke Jezreel (Esdraelọn)
Gat-hefa
Ugwu Kamel
Endo
Ugwu Teboa
Yamọk
Megido
Ugwu Mọre
Jezreel
Bet-shan
Dotan
Ugwu Gilboa
Samerịa
Samerịa
Gilead
Mbara ale nke Sharọn
Shekem
Ugwu Ebal
Penuel
Mahaneim
Ugwu Geraizim
Jebọk
Jọpa
Shaịlo
Oke Osimiri Ukwu (Oke Osimiri Mediterenia)
Aijalọn
Betel (Luz)
Ai
Osimiri Jọdan
Raba (Aman)
Gibeon
Jeriko
Amọn
Sọrek
Jerusalem
Ashdọd
Ekrọn
Ugwu Olives
Ugwu Nebo
Gat
Betlehem
Askelọn
Ịla
Tekoa
Oke Osimiri Nwụrụ Anwụ
Geza
Shefela
Mbara-ala Filistia
Lekish
Hebrọn
En-gedị
Inọn
Gera
Gera
Juda
Moab
Besọ
Bịasheba
Kir-haraset
Aịdumia
Ebe nke Sọdọm na Gọmọra
Negev
Araba
Zered
Edọm
Kilomita nile
0 20 40 60
A B C D
1 2 3 4 5 6 7 8
●1
●2
●3
●4
●5
●6
●7
●8
●9
●10
●11
●12
●13
●14
●15
●15
●15
●15
●15
●16
●17
●18
●19
●20
●21
-
Dan (Laịsh) Jeroboan wuru otu nwa-ehi ọla-edo maka Ala-eze Elu elu nke a ga-akpọ-isi ala nye (1 Ndez. 12:26–33). Dan bụụrụ ebe ngwụcha nke Israel ochie.
-
Ugwu Kamel Elaịja guzogidere ndị nchụ-aja nke Beal na meghere elu-igwe nile maka mmiri ozuzo (1 Ndez. 18:17–40).
-
Megido Otu ebe nke ọtụtụ agha nile (Ndikp. 4:13–16; 5:19; 2 Ihem. 35:20–23; 2 Ndez. 23:29). Solomon nakọtara ụtụ isi iji wulite Megido (1 Ndez. 9:15). Eze Josaia nke Juda ka e merụrụ arụ nke ọnwụ n’agha imegide Fero Neko nke Ijipt (2 Ndez. 23:29–30). Na ọbịbịa nke Onye-nwe nke Ugboro abụọ, otu nnukwu na agha ikpe-azụ ka a ga-alụ n’ime ndagwurugwu Jezreel dịka otu mpaghara agha nke Ha-Magedọn (Joel 3:14; Mkpu. 16:16; 19:11–21). Aha ahụ Ha-Magedọn bụ asụsụ Grik a sụgharịrị site na nke Hibru Har Me-giddon, ma-ọbụ Ugwu nke Megido.
-
Jezreel Aha nke otu nnukwu obodo dị na ndagwurugwu dịkarịsịrị nnukwu na na-erupụta ihe ubi karịsịa na Israel nwere otu aha ahụ. Ndị eze nile nke Ala-eze Elu-elu ahụ wuru obi-eze n’ebea (2 Sam. 2:8–9; 1 Ndez. 21:1–2). Onye ajọọ-omume Eze nwanyị Jezebel biri ndụ na nwụrụ n’ebea (1 Ndez. 21; 2 Ndez. 9:30).
-
Bet-shan Israel chere ndị Kenean iru n’ebea (Josh. 17:12–16). Arụ Sọl ka e kedoro na mgbidi nile nke ebea a rụsiri ike (1 Sam. 31:10–13).
-
Dotan Josef ka ụmụnne ya ndị nwoke rere baa na-ịbụ oru (Jen. 37:17, 28; 45:4). Elaisha nwere otu ọ́hụ̀ nke ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya nile na ụgbọ-ala nile (2 Ndez. 6:12–17).
-
Samerịa Isi-obodo nke Ala-eze Elu-elu (1 Ndez. 16:24–29). Eze Ehab rụrụ otu temple nye Beal (1 Ndez. 16:32–33). Elaịja na Elaisha kwusara ozi-ọma (1 Ndez. 18:2; 2 Ndez. 6:19–20). N’afọ 721 Tutu a mụọ Kraist, ndị Asiria meriri ya n’agha, na mezuo ndọkpụ n’agha nke agbụrụ iri ahụ (2 Ndez. 18:9–10).
-
Shekem Abraham rụrụ otu ebe ịchụ-aja (Jen. 12:6–7). Jekọb biri na nso ebea. Simeon na Livaị gburu n’ìgwè ụmụ ndịkom nile nke nnukwu obodo a (Jen. 34:25). Ịgba-ume nke Joshua gbara ka “họrọ—n’ụbọchị taa” ife Chineke ofufe bịara na Shekem (Josh. 24:15). N’ebea ka Jeroboam hiwere isi-obodo nke mbụ nke Ala-eze Elu-elu (1 Ndez. 12).
-
Ugwu Ebal na Ugwu Geraizim Joshua kewasịrị Israel n’elu Ugwu abụọ ndịa—a mara ọkwa ngọzi nile nke iwu site n’Ugwu Geraịzim, ebe nkọcha ahụ nile sitere n’Ugwu Ebal bịa (Josh. 8:33). Ndị Samerịa n’ikpe-azụ wuru temple n’elu Geraịzim (2 Ndez. 17:32–33).
-
Penuel (Peniel) N’ebea ka Jekọb gbara mgba n’ime abalị ahụ dum ya na otu oje-ozi nke Onye-nwe (Jen. 32:24–32). Gideon bibiri ebe a rụsiri ike nke ndị Midian (Ndikp. 8:5, 8–9).
-
Jọpa Jona soro ụgbọ mmiri si n’ebea gawa Tashish iji zere mgbasa ozi-ọma na Nineve (Jona 1:1–3).
-
Shaịlo N’ìme oge nke Ndị-ikpe, isi obodo nke Israel na ụlọ-ofufe ahụ ka e tinyere n’ebea (1 Sam. 4:3–4).
-
Betel (Luz) N’ebea ka Abraham na Lọt kewara (Jen. 13:1–11) na nwere otu ọ̀hụ̀ (Jen. 13; Abr. 2:19–20). Jekọb nwere otu ọ̀hụ̀ nke otu ububu nke na-erute n’elu-igwe (Jen. 28:10–22). N’ebea ka e tinyere ụlọ-ofufe ahụ maka nwa oge (Ndikp. 20:26–28). Jeroboam wulitere otu nwa-ehi ọla-edo maka Ala-eze Elu-elu ife ofufe (1 Ndez. 12:26–33).
-
Gibeon Ndị Haivait sitere n’ebea ghogbue Joshua ikwenye ka e mee udo (Josh. 9). Anyanwụ guzoro duu mgbe Joshua meriri n’agha (Josh. 10:2–13). Nkea bụkwaara otu ọnọdụ ebe ụlọ-ọfụfe nwa ntịntị oge (1 Ihem. 16:39).
-
Geza, Ashdọd, Ashkelọn, Ekron, Gat (nnukwu obodo ise nke ndị Filistia) Site n’ime nnukwu oboda ndịa ka ndị Filistia lusoro ndị Israel agha kwa mgbe kwa mgbe.
-
Betlehem E liri Rechel nso ebea (Jen. 35:19). Rut na Boaz biri n’ebea (Rut 1:1–2; 2:1, 4). A kpọrọ ya nnukwu obodo nke Devid (Luk 2:4).
-
Hebrọn Abraham (Jen. 13:18), Aịsak, Jekọb (Jen. 35:27), Devid (2 Sam. 2:1–4), na Absalom (2 Sam. 15:10) biri n’ebea. Nkea bụụrụ isi obodo nke mbụ nke Juda n’okpuru Eze Devid (2 Sam. 2:11). E kwere na Abraham, Sera, Aịsak, Rebeka, Jekọb, na Lia ka e liri n’ebea n’ime ọgba nke Makpila (Jen. 23:17–20; 49:31, 33).
-
En-gedị Devid zonahụrụ Sọl na hapụụrụ Sọl ndụ ya (1 Sam. 23:29; 24:1–22).
-
Gera Abraham na Aịsak biri n’ebea nwa obere oge (Jen. 20–22; 26).
-
Bịasheba Abraham gwuru otu olulu mmiri n’ebea na gbara-ndụ ya na Abimelek (Jen. 21:31). Aịsak hụrụ Onye-nwe (Jen. 26:17, 23–24), na Jekọb biri n’ebea (Jen. 35:10; 46:1).
-
Sọdọm na Gọmọra Lọt họọrọ ibi na Sọdọm (Jen. 13:11–12; 14:12). Chineke bibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi ajọ omume (Jen. 19:24–26). Na ikpe-azụ Jisus jiri nnukwu obodo ndịa mee ihe akara nile nke ajọ omume (Mat. 10:15).