Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
11. Ugwu Olive, Ebe izu-ike Orson Hyde


11. Ugwu Olive, Ebe izu-ike Orson Hyde

Ebe a a na-ahụ na-ele anya ndịda-ọdịda anyanwụ site na Ebe izu-ike Orson Hyde n’elu Ugwu Olive ahụ gaa n’ebe Jerusalem dị. Na mkpọda nke ọdịda-anyanwụ nke Ugwu Olive ahụ ka ubị nke Getsemane dị. Na 24 Ọktoba 1841, Onye-okenye Orson Hyde jere ije rigo n’elu Ugwu Olive na kpee ekpere nke ibu-amụma nke ịrara nye Chineke maka nlọta nke ụmụ nke Abraham na nke iwu temple ahụ.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Rom bibiri Jerusalem n’afọ 70 ka a mụsịrị Kraịst dịka Onye-nzọpụta buru amụma (hụ JS—Mat. 1:23). Onye-nzọpụta ka ga-eguzo n’elu Ugwu Olive tutu mpụta ìhè ya nye ụwa dum. (Hụ Zek. 14:3–5; OznỌd. 45:48–53; 133:19–20; Nduzi gaa n’akwụkwọ-nsọ nile, “Olive, Ugwu nke.”)

Foto, oyiyi
foto 11

11. Ugwu Olive, Ebe Izu-Ike Orson Hyde Na nso ebea na 1841, Onye-okenye Orson Hyde raara Ala Nsọ ahụ nye Chineke maka nlọta nke ụmụ nke Abraham.