Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map Nile na Ntụ-aka n’usoro nke Aha nile nke Ebe


Map Nile na Ntụ-aka n’Usoro nke Aha nile nke Ebe

Map nile ndịa na-eso pụrụ inyere gị aka ịghọta akwụkwọ-nsọ nile nke ọma karịa. Site n’ịmara maka ọmụmụ gbasara ala na omume ya nke ala nile a kpara nkata ha n’ime akwụkwọ-nsọ nile, ị pụrụ ịghọta ihe omume nile nke akwụkwọ-nsọ nke ọma karịa.

  1. Map nke ihe a na-Ahụ Anya nke ala nsọ Ahụ

  2. Ọpụpụ nke Israel site n’Ijipt na Mbanye n’ime Kenean

  3. Nkewasị nke Agbụrụ iri na Abụọ Ahụ

  4. Mba Ukwu nke Devid na Solomon

  5. Mba Ukwu ndỊ Asiria

  6. Mba Ukwu ỌhỤrỤ ndỊ BabỊlỌn (Nebukadneza) na ala-Eze nke Ijipt

  7. Mba Ukwu ndỊ Pesia

  8. Mba Ukwu ndỊ Rom

  9. Ụwa nke Testament Ochie

  10. Kenean n’ime Oge nIlE Testament Ochie

  11. ALA NSỌ AhỤ n’ime Oge nỊỊle Testament ỌhỤRỤ

  12. Jerusalem n’oge nke Jisus

  13. Njem Mgbasa Ozi-Ọma nile nke Onye-ozi PỌl

  14. ỊdỊ Elu nỊỊle nke Ebe NỊỊle nke ala NsỌ n’ime Oge nỊỊle nke Bible NSỌ

Ntụ-aka n’usoro nke abidịị nke aha nile nke ebe pụrụ inyere gị aka ịchọta otu ebe ọbụla n’elu map nile ahụ. Ndedata ọbụla gụnyere ọnụ-ọgụgụ nke map ahụ nke ntụnyere usoro map nile nwere akụkụ anọ ha otu nke ngwakọta otu mkpụrụ okwu-ọnụ-ọgụgụ mejupụtara ya sochiri. Maka ịma-atụ, ndedata maka Raba (Aman) n’elu map nke mbụ ka e depụtara dịka 1:D5; nke ahụ bụ, map 1, ihe nwere akụkụ anọ ha otu D5. Ị pụrụ ịchọta ụdị ihe nwere akụkụ anọ nile ahụ na map nke ọbụla site na-ịtụnyere nchịkwa nile ahụ dị n’ọnụ ọnụ n’akụkụ nke map ahụ. Aha nile nke ebe nile nke na-adị n’usoro ka e depụtara n’akara mkpuchi; maka ịma-atụ, Raba (Aman). Akara ajụjụ na-eso otu aha na-egosi na ebe ahu e gosiri na map ahụ kwere omume ma-ọbụ ikekwe kama o dochabeghị anya.

Nke na-eso bụ ọtụghe-ụzọ nke ịghọta akara dị iche iche na iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ e jiri mee ihe na map nile ahụ. Tinyekwa na map nke ọbụla nwere ike nwere ọtụghe-ụzọ nile na nkọwa nile nke akara nile ndị ọzọ so ya gbasara map nke ahụ.

Otu kpọm dị uhie uhie na-anọchi anya otu nnukwu obodo ma-ọbụ obodo. Otu ahịrị nwere ike n’oge ụfọdụ tụọ aka site na kpọm ahụ gaa n’aha nke nnukwu obodo ahụ ma-ọbụ ebe ọ dị.

Otu ihe nwere akụkụ atọ na-anọchị anya otu ugwu.

Oke Osimiri Nwụrụ-anwụ

Ụdị iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri mee ihe maka ebe nile nke ọmụmụ gbasara ala na omume ya nile dịka oke osimiri ukwu nile, oke osimiri nile, ọdọ-mmiri nile, osimiri nile, ugwu nile, ọzara nile, ndagwurugwu nile, ọzala nile na ibe ala nile mmiri gbara okiri kiri.

Jerusalem

Ụdị iru mkpụrụ mbipụta akwụkwo a ka e jiri mee ihe maka nnukwu obodo dum, na obodo nile (na maka ebe nile a kọwadaruru ala dị na map nnukwu obodo Jerusalem).

Moab

Ụdị-iru mkpụrụ mbipụta-akwụkwọ a ka e jiri mee ihe maka nkewasị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile dị obere karịa dịka mpaghara nile, ndị mmadụ nile na agbụrụ nile.

Judea

Ụdị-iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri mee ihe maka nkewasị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile buru ibu karịa dịka mba nile, ala nile, na kọntinenti nile.