Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
29. Atens


29. Atens

Foto nkea na-egosi ọdịda mbibi nile nke Patenọn dị n’ime Atens. Atens bụụrụ isi obodo ochie nke Atika nke ndị Grik na n’ime oge nile nke Testament Ohụrụ bụụrụ nkewa nnukwu obodo ndị Rom nke Akaịa. E nyere ya aha na nnukwu ùgwù nke chi-arụsị-nwanyị ndị Grịk Atena. N’oge nile Testament Ọhụrụ ọtụtụ ịdị ukwuu na ebube nke Atens e funarịwo ya, mana nwere ihe akpụrụ akpụ nile na ihe ncheta nile nye chi nile na chi nwanyị nile, tinyere “chi nke na a maghị ama” (Ọlndoz. 17:23).

Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-ozi Pọl letara nnukwu obodo ahụ na kwusara ozi-ọma n’Ugwu Mas, nso nso Patenon ahụ (Ọlndoz. 17:15–34). E zipụrụ ndị mgbasa ozi-ọma site n’Atens gaa n’akụkụ Gris ndị-ọzọ (1 Ndị-Tes. 3:1–2).

Foto, oyiyi
foto 29

29. Atens Patenọn ahụ e sere foto n’ebe a, dị nso n’Ugwu Mas, ebe Pọl kwusara ozi-ọma ya banyere “chi nke na-amaghị ama” (hụ Ọlndoz. 17:15–34).