Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
2. Ugwu Saịnaị (Horeb) na Ọzara Saịnaị


2. Ugwu Saịnaị (Horeb) na Ọzara Saịnaị

Ugwu ukwu nile pụtara ìhè bụ Ugwu nke Jebel Musa (Ugwu nke Moses). E nwere ọtụtụ ọnọdụ kwesịrị ịbụ maka Ugwu Saịnaị. Otu n’ime nke a nakweere karịa bụ ebe e tinyere Jebel Musa.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Chineke pụtara ìhè nye Moses na nye ya Iwu-nsọ Iri ahụ (Ọpụ. 19–20). Moses, Erọn, abụọ n’ime ụmụ ndịkom nke Erọn, na 70 ndị okenye hụrụ na mekọrịtara ha na Chineke (Ọpụ. 24:9–12). Chineke nyere Moses ntụzi-aka maka iwu ụlọ-ofufe (Ọpụ. 25–28; 30–31). Ndị Israel kpọrọ isi ala nye otu nwa ehi ọla-edo nke ha kwagidere Erọn ka o mee (Ọpụ. 32:1–8). Elaịja gbagara n’ala a site na Ndagwurugwu Jezreel, ebe Eze nwanyị Jezebel biiri (1 Ndez. 19:1–18). Nkea bụ kwa ebe Elaịja na Chineke kwuru okwu (1 Ndez. 19:8–19).

Foto, oyiyi
foto 2

2. Ugwu Saịnaị (Họreb) na Ọzara Saịnaị Site n’iwu-nsọ Chineke nyere, Moses kpọtara ndị Israel n’ugwu a ịnata iwu Chineke. Foto nke a na-egosi ọnọdụ ebe ọdịnala nke Ugwu Saịnaị.