Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map 11: Ala nsọ Ahụ n’ime Oge nile Testament Ọhụrụ


Map 11

ALA NSỌ AhỤ n’ime Oge nỊỊle Testament ỌhỤRỤ

Foto, oyiyi
Map Bible nsọ 11

N

Ọtụghe-ụzọ nke Map 11

Oke-ala nile nke ndọrọ-ndọrọ ọchịchị

Saịdọn

Abilini

Sarepta

Ugwu nile nke Lebanọn

Damaskọs

Litani

Siria

Ugwu Hemọn

Fapa

Taịa

Fonisia

Siseria Filipaị

Ndagwurugwu Hule

Galili

Tolemaịs (Akọ)

Kọrazin

Betsaịda

Kapanaum

Kishọn

Kena

Magdala

Oke Osimiri Galili (Kineret)

Ugwu Kamel

Nazaret

Taiberias

Ugwu Teboa

Yamọk

Nain

Gedara

Siseria

Ugwu Gilboa

Dekapolis

Samerịa

Selem?

Samerịa

Inọn?

Mbara ala nke Sharọn

Saika

Ugwu Ebal

Jebọk

Jọpa

Ugwu Geraizim

Arimatia?

Aịjalọn

Betel

Osimiri Jọdan

Peraia

Filadelfia

Jeriko

Oke Osimiri Ukwu (Oke Osimiri Mediterenia)

Azọtọs

Sọrek

Emeus

Betabara

Jerusalem

Ugwu Olives

Betfagi

Betani

Mbara-ala nke Moab

Ugwu Nebo

Askelọn

Ịla

Beltehem

Judia

Geza

Hebrọn

Makerọs

Gera

Aịdumia

Oke Osimiri Nwụrụ Anwụ

Aenọn

Besọ

Biasheba

Ọzara nke Judia

Nabataea

Zered

Kilomita nile

0 20 40 60

A B C D

1 2 3 4 5 6 7 8

●1

●1

●2

●2

●3

●4

●5

●6

●7

●8

●9

●10

●11

●12

●13

●14

●15

●16

●17

  1. Taịa na Saịdon Jisus tulere ịdị iche nke Korazin na Betsaịda na nke Taịa na Saịdọn (Mat. 11:20–22). Ọ gwọrọ ada nwanyị nke nwanyị Jentaịlụ (Mat. 15:21–28).

  2. Ugwu nke Mnwogharị E nwogharịrị Jisus n’iru Pịta, Jemes na Jọn, na ha natara ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ (Mat. 17:1–13). Ụfọdụ mmadụ kweere na Ugwu Mnwogharị ahụ bụ Ugwu Hemon; ndị-ọzọ kwenyere na ọ bụ Ugwu Teboa.

  3. Siserịa Filipaị Pịta gbara-ama na Jisus bụ Kraịst ahụ na ekwere ya nkwa ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ (Mat. 16:13–20). Jisus buru amụma maka ọnwụ nke ya onwe ya na Mbilite n’ọnwụ ya (Mat. 16:21–28).

  4. Mpaghara nke Galili Jisus biri nke karịsịrị na ndụ ya na ikwusa ozi-ọma ya n’ime Galili (Mat. 4:23–25). N’ebea ka o nyere Okwu Chukwu e kwuru n’elu Ugwu (Mat. 5–7); gwọrọ onye ekpenta (Mat. 8:1–4); na họọrọ, chie echichi, na zipụ Ndị-ozi Iri na abụọ ahụ n’ime ha nke Judas na-abụghị onye Galili (Mak 3:13–19). Na Galili ka Kraịst ahụ nke biliworo n’ọnwụ pụtara ìhè nye Ndị-ozi ahụ (Mat. 28:16–20).

  5. Oke Osimiri Galili, na ikpe-azụ a kpọrọ oke Osimiri Taiberịas Jisus kụziri ihe site n’ime ụgbọ-mmiri Pịta (Luk 5:1–3) na kpọrọ Pịta, Andru, Jemes na Jọn ịbụ ndị ọkụ azụ na-akụta mmadụ (Mat. 4:18–22; Luk 5:1–11). O mekwara ka ebili mmiri daa duu (Luk 8:22–25); kuziri akụkọ-ilu nile site n’otu ugbo-mmiri (Mat. 13), jere ije n’elu oke osimiri (Mat. 14:22–32), na pụtara ìhè nye ndi na-eso ụzọ ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ (Jọn 21).

  6. Betsaịda Pịta, Andru, na Filip ka a mụrụ na Betsaịda (Jọn 1:44). Jisus na Ndị-ozi ahụ pụrụ gawa na nke onwe ha na nso Betsaịda. Igwe ndị mmadụ ahụ sooro ya, na o nyejuru 5,000 ahụ afọ (Luk 9:10–17; Jọn 6:1–14). N’ebe a Jisus gwọrọ otu onye-ìsì (Mak 8:22–26).

  7. Kapanaum Nkea bụụrụ ebe obibi Pịta (Mat. 8:5, 14). Na Kapanaum, nke Matiu kpọrọ nnukwu “obodo nke Jisus”, Jisus gwọrọ otu onye arụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (Mat. 9:1–7; Mak 2:1–12), gwọrọ nwa odibo nke onye-na-achị otu narị ndị-agha, gwọrọ nne nke nwunye Pịta (Mat. 8:5–15), kpọrọ Matiu ịbụ otu n’ime Ndị-ozi ya (Mat. 9:9), Meghere anya ndi ìsì, chụpụrụ otu ekwensu (Mat. 9:27–33), gwọrọ aka nwụrụ anwụ nke otu nwoke n’ụbọchị izu-ike (Mat. 12:9–13), nyere mkparita ụka nke achịcha nke ndụ (Jọn 6:22–65), na kwere ịkwụ ụtụ-isi nile, site na-ịgwa Pịta ka o nweta ego ahụ site na ọnụ otu azụ (Mat. 17:24–27).

  8. Magdala Nkea bụụrụ ebe-obibi nke Meri Magdalin (Mak 16:9). Jisus bịara n’ebea mgbe o nyejụsịrị 4,000 ahụ afọ (Mat. 15:32–39), na ndị Farisi na ndị Sadusi rịọrọ ka o gosi ha otu ihe ịrịba-ama sitere n’elu-igwe (Mat. 16:1–4).

  9. Kena Jisus gbanwere mmiri ka ọ ghọọ mmanya (Jọn 2:1–11) na gwọrọ nwa nwoke nke otu onye na-ejere eze ozi onye nọ na Kapanaụm (Jọn 4:46–54). Kena bụkwaara ebe obibi nke Nataniel (Jọn 21:2).

  10. Nazaret Nleta Ịma-ọkwa nke mụọ-ozi nye Meri na Josef mere na Nazaret (Mat. 1:18–25; Luk 1:26–38; 2:4–5). Mgbe ọ lọtara site n’Ijipt, Jisus biri ndụ nwanta ya na okorọbịa ya n’ebea (Mat. 2:19–23; Luk 2:51–52), Mara-ọkwa na ya bụ Mesaịa ahụ, na ndi nke ya jụrụ ya ajụ (Luk 4:14–32).

  11. Jeriko Jisus mere ka otu nwoke kpuru ìsì hụ ụzọ (Luk 18:35–43). Ya na Zakịọs rikọkwara nri-anyasị, “onye-isi n’etiti ndị ọ na-ụtụ” (Luk 19:1–10).

  12. Betabara Jọn O Me Baptism gbara-ama na ya bụ “olu otu onye na-eti mkpu n’ime ọzara” (Jọn 1:19–28). Jọn mere Jisus baptism n’ime Osimiri Jọdan, na gbara-ama na Jisus bụ Nwa-atụrụ nke Chineke (Jọn 1:28–34).

  13. Ọzara nke Judịa Jọn Ọ Me Baptism kwusara ozi-ọma n’ime ọzara a (Mat. 3:1–4), ebe Jisus buru ọnụ iri ụbọchị anọ, na a nwara ya ọnwụnwa (Mat. 4:1–11).

  14. Emeus Kraịst ahụ biliworo n’ọnwụ jere ije n’ụzọ gara Emeus ya na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya (Luk 24:13–32).

  15. Betfagi Mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ dutaara Jisus nwa ịnyịnya nke ọ nọ n’elu ya malite njem mmeri ya ịbanye n’ime Jerusalem (Mat. 21:1–11).

  16. Betanị Nke a bụụrụ ebe obibi nke Meri, Mata, na Lazarọs (Jọn 11:1). Meri nụrụ okwu nile nke Jisus, na Jisus gwara Mata okwu maka ịhọrọ ezi òkè ahụ (Luk 10:38–42); Jisus kulitere Lazarọs site na ndị nwụrụ anwụ (Jọn 11:1–44); na Meri tere ụkwụ Jisus mmanụ (Mat. 26:6–13; Jọn 12:1–8).

  17. Betlehem A mụrụ Jisus na nyibe ya n’ihe a na-etinye nri anụ-ụlọ (Luk 2:1–7); ndị mụọ-ozi ziri ndị ọzụzụ atụrụ ozi nke ọmụmụ Jisus (Luk 2:8–20); otu kpakpandọ duziri ndị nwoke maara ihe ụzọ gaa n’ebe Jisus nọ (Mat. 2:1–12); na Herọd gburu ụmụ ntakịrị (Mat. 2:16–18).