Map 13
Njem Mgbasa Ozi-Ọma nile nke Onye-ozi PỌl
N
Ọtụghe-ụzọ nke Map 13
Njem nke mbụ
Njem nke abụọ
Njem nke atọ
Njem ịga Rom
Itali
Oke Osimiri Ojii
Rom
Masedonia
Pọntọs
Ụlọ-nri Atọ
Bitaịnaịa
Nzukọ ikpe nke Apịọs
Tesalonaịka
Filipaị
Potioli
Troas
Biria
Galesia
Samothrace
Misia
Esia
Pegamọm
Kapadosia
Antịọk
Laidia
Frigia
Smaiana
Aikonịọm
Tasọs
Kaịọs
Efesọs
Pisidia
Laịstra
Atens
Kọrint
Leodisia
Regium
Akaịa
Militọs
Pamfilia
Deb
Laisia
Pega
Antịọk
Patmọs
Silisia
Saịracus
Maịra
Snidọs
Rodes
Saịprọs
Salamis
Melita (Malta)
Kret
Pafọs
Saịdọn
Siria
Taịa
Fair Havens
Fonisia
Damaskọs
Tolemaia
Oke Osimiri Mediterenia
Siseria
Samerịa
Jọpa
Jerusalem
Geza
Saịrin
Aleksandria
Ijipt
Libya
Kilomita nile
0 100 200 300 400
A B C D E F G H
1 2 3 4
●1
●2
●3
●4
●5
●6
●7
●8
●9
●10
●11
●12
●13
●14
●15
●16
●17
●18
●19
●20
●21
●22
●23
●24
●25
●26
●27
-
Geza Filip kwusara ozi-ọma nke Kraịst na mere otu nwoke bụ ọnọzi onye Etiopịa baptism n’ụzọ ya ịga Geza (Ọlndoz. 8:26–39).
-
Jerusalem Hụ map 12 maka ihe omume nile n’ime Jerusalem.
-
Jọpa Pịta natara otu òhù na Chineke na-enye ndị Jentaịlụ onyinye nke ncheghari (Ọlndoz. 10; 11:5–18). Pịta kulitere Tabita site na ndị nwụrụ anwụ (Ọlndoz. 9:36–42).
-
Samerịa Filip kwusara ozi-ọma na Samerịa (Ọlndoz. 8:5–13), na Pịta na Jọn n’ikpe-azụ kụziri ihe n’ebea (Ọlndoz. 8:14–25). Mgbe ha nyefesịrị onyinye nke Mụọ Nsọ, Saịmọn onye na-eme mgbasị chọrọ ịzụta onyinye a site n’aka ha (Ọlndoz. 8:9–24).
-
Siseria N’ebea mgbe otu Mụọ-ozi kwusasịrị ozi-ọma nye otu ọchị-agha nke otu narị ndị agha a kpọrọ aha ya Kọniliọs, Pịta kwere ya ka e mee ya baptism (Ọlndoz. 10). N’ebea Pọl mere mgbochi ya n’iru Agripa (Ọlndoz. 25–26; hụ kwa A—JS 1:24–25).
-
Damaskọs Jisus pụtara ìhè nye Sọl (Ọlndoz. 9:1–7). Mgbe Ananaias weghachisiri ịhụ-ụzọ Sọl, e mere Sọl baptism na ọ malitere nkwusa ozi-ọma ya (Ọlndoz. 9:10–27).
-
Antịọk (n’ime Siria) N’ebea ndị na-eso ụzọ ka a kpọrọ Ndị-otu-Kraịst nke mbụ (Ọlndoz. 11:26). Agabọs buru amụma ụnwụ (Ọlndoz. 11:27–28). Oke nghọtahie bilitere na Antịọk gbasara ibi-úgwù (Ọlndoz. 14:26–28; 15:1–9). Na Antịọk Pọl malitere mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ ya na Saịlas, Banabas, na Judas Basabas (Ọlndoz. 15:22, 30, 35).
-
Tasọs Obodo ebe obibi Pọl; Ndị Ụmụnna zigara Pọl n’ebea iji chekwaa ndụ ya (Ọlndoz. 9:29–30).
-
Saịprọs Mgbe a kpagbusịrị ha, ụfọdụ Ndị-nsọ gbalagara n’ibe ala nke a mmiri gbara okirikiri (Ọlndoz. 11:19). Pọl sitere na Saịprọs gaa njem mgbasa ozi-ọma ya nke mbụ (Ọlndoz. 13:4–5), dịka Banabas na Mak mere n’ikpe-azụ (Ọlndoz. 15:39).
-
Pafọs Pọl kọchara otu onye na-eme mgbasị n’ebea (Ọlndoz. 13:6–11).
-
Dabe Pọl na Banabas kwusara ozi-ọma ahụ n’ime nnukwu obodo a (Ọlndoz. 14:6–7, 20–21).
-
Laịstra Mgbe Pọl gwọrọ otu onye ngwọrọ, ya na Banabas ka e kelere dịka chi nile. A tụrụ Pọl nkume na chee na ọ nwụrụ anwụ kama dịkwara ndụ ọzọ na gara n’iru na-ekwusa ozi-ọma (Ọlndoz. 14:6–21). Ebe obibi Timọti (Ọlndoz. 16:1–3).
-
Aịkonịọm Na mgbasa ozi-ọma ha nke mbụ, Pọl na Banabas kwusara ozi-ọma n’ebea na a majara ha jiri ịtụ nkume (Ọlndoz. 13:51–14:7).
-
Leodisia na Kọlọsị Leodisia bụ otu n’ime ngalaba nke Nzukọ-nsọ nke Pọl letara na natara leta nile site n’aka ha (Ndị-Kọl. 4:16). Ọ bụ kwa otu n’ime nnukwu obodo asaa e depụtara n’ime akwụkwọ Mkpughe (ndị nke ọzọ bụ Efesọs, Smịama, Pagamọs, Taịataịra, Sadis, na Filadelfịa, hụ Mkpu. 1:11). Kọlọsị dị kilomita 18 na mpaghara Ọwụwa-anyanwụ nke Leodisia. Pọl degaara Ndị-nsọ ndị bi n’ebea akwụkwọ.
-
Antiọk (n’ime Pisidia) Na mgbasa ozi-ọma ha nke mbụ, Pọl na Banabas kụziere ndị Juu na Kraịst sitere na mkpụrụ nke Devid bịa. Pọl wetaara Israel ozi-ọma ahụ, mgbe ahụ nye ndị Jentaịlụ. Pọl na Banabas ka a kpagburu na chụpụrụ (Ọlndoz. 13:14–50).
-
Militọs Mgbe ọ nọ n’ebea na mgbasa ozi-ọma ya nke atọ, Pọl dọrọ ndị okenye nke Nzukọ-nsọ aka na ntị na “agụ ndị jọgburu onwe ha” ga-abata n’etiti igwe atụrụ ahụ (Ọlndoz. 20:29–31).
-
Patmọs Jọn bụụrụ onye mkpọrọ n’ibe ala a mmiri gbara okirikiri mgbe ọ natara ọ̀hù nile ahụ dị n’akwụkwọ nke Mkpughe (Mkpu. 1:9).
-
Efesọs Apọlọs kwusara ozi-ọma n’ebea jiri ike (Ọlndoz. 18:24–28). Pọl na mgbasa-ozi-ọma ya nke atọ kụziri ihe na Efesọs ruo afọ abụọ, na-agbanwe ọtụtụ mmadụ (Ọlndoz. 19:10, 18). N’ebea o nyere onyinye nke Mụọ-Nsọ site na-ibikwasị aka nile (Ọlndoz. 19:1–7), na rụrụ oru-ebube nile tinyere ịchụpụ mụọ-ọjọọ nile (Ọlndoz. 19:8–21). N’ebea ndị na-efe Daiana ofufe palitere ọgba-aghara megide Pọl (Ọlndoz. 19:22–41). Akụkụ nke akwụkwọ Mkpughe ka e degaara Nzukọ-nsọ ahụ dị na Efesos (Mkpu. 1:11).
-
Troas Mgbe Pọl nọ n’ebea na njem mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ, ọ hụrụ otu òhù nke otu nwoke nọ na Masedonia na-arịọ maka enyem-aka (Ọlndoz. 16:9–12). Mgbe ọ nọ n’ebea na mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro atọ, o kulitere Yutikọs site na ndị nwụrụ anwụ (Ọlndoz. 20:6–12).
-
Filipaị Pọl, Saịlas, na Timọti gbanwere otu nwanyị a kpọrọ aha ya Lidia, chụpụrụ otu mụọ ọjọọ, na e tiri ha ihe (Ọlndoz. 16:11–23). Ha natara enyem-aka dị nsọ ịgbanarị mkpọrọ (Ọlndoz. 16:23–26).
-
Atens Pọl mgbe ọ nọ na mgbasa ozi-ọma ya nke Ugboro abụọ na Atens, kwusara ozi-ọma n’Ugwu Mas (Areọpagọs) banyere “Chi nke na-amaghị ama” (Ọlndoz. 17:22–34).
-
Kọrịnt Pọl gara Kọrịnt na mgbasa ozi-ọma ya nke Ugboro abụọ ebe ọ nọdụrụ ya na Akwila na Prisila. O kwusara ozi-ọma n’ebea na mere ọtụtụ mmadụ baptism (Ọlndoz. 18:1–18). Site na Kọrịnt, Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi ya.
-
Tesalonaịka Pọl kwusara ozi-ọma n’ebea n’oge njem mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ. Ndị otu mgbasa ozi-ọma ya hapụrụ gaa Beria mgbe ndị Juu majara ọdị mma ha (Ọlndoz. 17:1–10).
-
Berìa Pọl, Saịlas, na Timọti chọtara mkpụrụ-obi nile a maara n’ihi omume ọma, ha ga-akụziri ihe n’oge njem mgbasa ozi-ọma Pọl nke ugboro abụọ. Ndị Juu sitere na Tesalonaika soro kpagbuo ha (Ọlndoz. 17:10–13).
-
Masedonia Pọl kụziri ihe n’ebea na njem ya nke ugboro abụọ na nke atọ (Ọlndoz. 16:9–40; 19:21). Pọl jara mmepụ-aka nke Ndị-nsọ Masedonịa mma ndị nyere ya na Ndị-nsọ bụ ogbenye nọ na Jerusalem ihe (Ndị-Rom 15:26; 2 Ndị-Kọ 8:1–5; 11:9).
-
Melita Ụgbọ-mmiri Pọl kpuru n’ibe ala a mmiri gbara okirikiri n’ụzọ ya ịga Rom (Ọlndoz. 26:32; 27:1, 41–44). Agwọ tara ya emerụghị ya arụ na gwọrọ ọtụtụ ndị arụ na-adịghị ike na Melita Ọlndoz. 28:1–9).
-
Rom Pọl kwusara ozi-ọma n’ebea maka afọ abụọ n’okpuru mmachibido ịpụ-ezi nke onye e jidere ejide (Ọlndoz. 28:16–31). O dekwara akwụkwọ-ozi nile ma-ọbụ leta nile, nye ndị Efesos, ndị Filipaị, na ndi Kọlọsị na nye Timọti na Faịlimọn mgbe ọ nọ na mkpọrọ na Rom, Pịta dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ site na “Babịlọn” nke bụụrụ ikekwe na Rọm, ngwa ngwa mkpagbu nile nke Nero megide Ndị-otu-Kraịst gasịrị n’afọ 64 ka a mụsịrị Kraịst. E kwenyere n’ọha na e gburu Pịta na Pọl n’ihi okwukwe ha n’ebea.