Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
8. Jerusalem


8. Jerusalem

E legide anya na mpaghara elu-elu. N’ìme etiti nke foto ahụ ka otu ụlọ ndị Moslem na ebe idebe ihe nsọ ha dị nke nwere elu ụlọ dị gburu gburu e ji ọla edo kpuchie nke a kpọrọ Dome nke Nkume ahu. Ndị Juu fere ofufe na mgbe ochie n’ime temple nile e tinyere n’ebea. Mgbidi nile dị nso na Dome nke Nkume ahụ gbara nnukwu obodo Jerusalem ochie okiri kiri. Na aka nri nke mgbidi ahụ ka Ndagwurugwu Kidron dị. Na a gatee aka nri ahụ anya ka Ugwu nke Olive dị. N’elu elu ma a gafee Dome nke Nkume ahụ, bụ ọnọdụ nwere ike ịbụ ebe Gọlgọta, ma-ọbụ Kalvari dị.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Jerusalem ka a nabuuru akpọ Salem na mgbe ochie (Abụọma 76:2). Abraham kwụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’aka Melkizedek (Jen. 14:18–20). Abraham bịara iji Aịsak chụọ aja (Jen. 22:2–14). Eze Devid dọkpụụrụ Jerusalem n’agha site n’aka ndị Jebus (2 Sam. 5:4–9). Eze Solomon rụrụ otu temple (1 Ndez. 6–7). Lihaị hapụrụ gawa otu ala e kwere na nkwa (1 Nif. 1:4; 2). Onye Nzọpụta kwusara ozi-ọma, chụọ aja mgbaghara mmehie maka mmehie anyị nile, na e bilitere ya n’ọnwụ (Mat. 21–28). Dịka Onye-nzọpụta bụrụ amụma, e bibiri Jerusalem mkpirisi oge mgbe ọ nwụsịrị (JS—Mat. 1:3–20). A ga-abakpo Jerusalem n’agha n’ụbọchị nile ndị ikpe-azụ (Ezik. 38–39; Joel 2–3; Mkpu.11; 16). Onye-nzọpụta ga-apụta ìhè n’ebea ngwa ngwa tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ (Zek. 12–14; OznỌd. 45:48–53). (Lee Odudu nye Akwụkwọ-nsọ nile, “Jerusalem,” “Salem.”)

Foto, oyiyi
foto 8

8. Jerusalem Nnukwu obodo a ka okpukpe chi atọ tụlere na ọ dị nsọ—Okwukwe Ndị-otu-Kraịst, okwukwe ndị Juda, na okwukwe ndị Ala kụba.