Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
6. Elu Ala Judịa jupụtara n’ugwu


6. Elu Ala Judịa jupụtara n’ugwu

Elu ala Judịa ahụ jupụtara n’ugwu dị ihe dịka kilomita 56 n’ogologo na kilomita 27 na mbara. Nke buru ibu na ala ahụ bụ nkume na dị ike ịkọ ya ọrụ ubi. Ndagwurugwu nile kewasịrị ugwu ya nile n’ime ebe ala ya nwetụrụ ike ịmịta mkpụrụ. Ndị Israel gboo mbụ biri n’ime ugwu nile ndịa, na-eji ha mere mgbochi megide ndị mbakpo n’agha. Na ebea ka Jerusalem dị.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-nwe kwere Abraham na mkpụrụ ya nkwa ala a (Jen. 13:14–18; 17:8). Sera na Abraham ka e liri n’ọgbà Makpila, na Hebrọn (Jen. 23:19; 25:9). Devid dọkpụụrụ Jerusalem n’agha site n’aka ndị Jebus (2 Sam. 5:4–9). Nke karịrị n’ihe omume nile nke Testament Ochie ka e dekọtara na ha mere nime ugwu nile ndịa karịa na mpaghara ọzọ ọbụla.

Foto, oyiyi
foto 6

6. Elu Ala Judịa Jupụtara N’ugwu Ọdịdị nke ala na-adịghị larị dịka nkea kpuchiri ebe buru ibu nke Ala Nsọ ahu ruo ala ala na ọwụwa-anyanwụ nke Jerusalem.