Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 20


Isi 20

Ụfọdụ ụmụada ndị Leman ka ndị nchụ-aja nke Noa tọọrọ—Ndị Leman wee buso Lịmhaị na ndị ya agha—Igwe ndị Leman ahụ ka a chụghachịrị azụ ma mee ka ha daa juu. Ihe dịka n’afọ 145 ruo 123 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua e nwere ebe dị na Shemlọn ebe ụmụada nile nke ndị Leman na-akpọkọta onwe ha ọnụ ịbụ abụ, na ite-egwu, na ime onwe ha obi ụtọ.

2 Ma o wee ruo na o nwere otu ụbọchị ọnụ-ọgụgụ nta n’ime ha gbakọtara ọnụ ịbụ abụ na ite egwụ.

3 Ma ugbua ndị nchụ-aja nke eze Noa, ebe ihere na-eme ha ilagachị n’obodo-ukwu nke Nifaị, e, na kwa n’ịtụ egwu na ndị ahụ ga-egbu ha, ya mere ha anwaghị anwa ịlaghachịkwuga ndị nwunye ha na ụmụ ha.

4 Ma ebe ha biworo n’ime ọzara ahụ, na ebe ha chọpụtaworo ụmụada nke ndị Leman ahụ, ha dinara ala ma lewe ha.

5 Ma mgbe ha dị nanị ole na ole n’ime ha gbakọrọ ọnụ ite egwu, ha pụtara site n’ebe nzuzo ha nile ma kpọrọ ha ma bubaga ha n’ime ọzara ahụ; e, iri abụọ na anọ nke ụmụada nile nke ndị Leman ahụ ka ha bubagara n’ime ọzara ahụ.

6 Ma o wee ruo na mgbe ndị Leman chọpụtara na ụmụada ha na-efurịị efu, iwe were ha n’ebe ndị nke Lịmhaị nọ, n’ihi na ha chere na ọbụ ndị nke Lịmhaị.

7 Ya mere ha zigara ndị-agha ha; e, ọbụna eze ahụ n’onwe ya gafere n’iru ndị ya; ma ha galitere ruo ala nke Nifaị, ibibi ndị nke Lịmhaị.

8 Ma ugbua Lịmhaị achọpụtawo ha rị site n’ụlọ-elu tọwa ahụ, ọbụna njikere ha nile maka agha ka ọ chọpụtara; ya mere ọ kpọkọtara ndị ya ọnụ, ma zoo chere ha n’ubi nile ahụ ma n’ime ọhịa nile ahụ.

9 Ma o wee ruo na mgbe ndị Leman bịaliteworo, nke mere na ndị nke Lịmhaị malitere ịdakwasị ha site n’ebe nche ha nile, ma malite igbu ha.

10 Ma o wee ruo na agha ahụ siri ike karịa, n’ihi na ha lụrụ ọgụ dịka ụmụ ọdụm maka anụ ha ji akpa nri.

11 Ma o wee ruo na ndị nke Lịmhaị malitere ịchụ ndị Leman n’iru ha; ma na ha erughị ọkara n’ọnụ ọgụgụ dịka ndị Leman. Mana ha alụrụ ọgụ maka ndụ ha, na maka ndị mwunye ha, na maka ụmụ ha; ya mere ha tinyere onwe ha n’ezigbo ọrụ ma dịka nkita-ọhịa ka ha lụrụ ọgụ.

12 Ma o wee ruo na ha chọtara eze ahụ nke ndị Leman n’etiti ọnụ-ọgụgụ nke ndị ha nwụrụ anwụ; ma na ọ nwụghị anwụ, ebe e merụworo ya arụ ma hapụ ya n’ala ahụ, oke ọsọ ka ndị ya jiri gbapụ.

13 Ma ha kpọọrọ ya ma kechie ọnya ya nile, ma kpọta ya n’iru Lịmhaị, ma sị: Lee, n’ebe a ka eze nke ndị Leman ahụ nọ; ya ebe o nwetaworo mmeru arụ adabawo n’etiti ndị ha nwụrụ anwụ, ma ha ahapụwo ya; ma lee, anyị akpọtawo ya n’iru gị; ma ugbua ka anyị gbuo ya.

14 Mana Lịmhaị sịrị ha: Unu agaghị egbu ya, kama kpọta ya n’ebe a ka m wee hụ ya. Ma ha kpọtara ya. Ma Lịmhaị sịrị ya: Gịnị kpatara unu jiri buru agha bịa ịmegide ndị m? Lee, ndị m emebibeghị aiyi nke m n̄ụụrụ gị, ya mere, gịnị mere unu ga-eji mebie iyi unu n̄uru nye ndị m?

15 Ma ugbua eze ahụ sịrị: Emebiwo m ịn̄ụ-iyi ahụ n’ihi na ndị gị bupụrụ ụmụada nile nke ndị m; ya mere, n’iwe m e mere m ka ndị m buru agha bịakwute ndị gị.

16 Ma ugbua Lịmhaị anụbeghị ihe ọbụla gbasara ihe nke a; ya mere ọ sịrị: A ga m achọ n’etiti ndị m ma onye ọbụla meworo ihe nke a ga-ala-n’iyi. Ya mere o mere ka e mee nchọpụta n’etiti ndị ya.

17 Ugbua mgbe aGịdiọn nụworo ihe ndị a, ebe ọ bụ ọchị-agha eze, ọ gara n’iru ma sị eze ahụ: A rịọ m gị chere, ma emela nchọpụta n’etiti ndị a, ma e bokwasịla ihe nke a n’isi ha.

18 N’ihi na Ị chetaghị ndị nchụ-aja nile nke nna gị, ndị nke ndị a chọrọ ibibi? Ma ha anọghị n’ime ọzara ahụ? Ma ọ bụghị ha bụ ndị zuruworo ụmụada nile nke ndị Leman?

19 Ma ugbua, lee, ma gwa eze ahụ maka ihe ndị a nile, ka o wee gwa ndị ya ka ha wee daa juu n’ebe anyị nọ; n’ihi na lee ha na-akwadọrị ịbịa megide anyị; ma lee kwa anyị dị nanị ole na ole.

20 Ma lee, ha na-abịa n’igwe ọtụtụ ọnụ ọgụgụ; na, ma ọbụghị na eze ahụ mere ka ha daa juu n’ebe anyị nọ, anyị ga-alarịrị n’iyi.

21 N’ihi na okwu nile nke Abịnadaị o amezubeghị, nke o buru amụma megide anyị—ma ihe nile ndị a n’ihi na anyị anaghị an̄a ntị n’okwu nile nke Onye-nwe, ma tụgharịa site n’ajọọ-omume anyị nile?

22 Ma ugbua ka anyị mee ka eze ahụ daa juu, ma anyị mezuo iyi ahụ nke anyị n̄ụworo nye ya, n’ihi na ọ ka mma na anyị ga-anọ n’ịbụ-oru karịa na anyị ga atufu ndụ anyị nile; ya mere, ka anyị kwusị ịkwafu oke nnukwu ọbara.

23 Ma ugbua Lịmhaị gwara eze ahụ ihe nile gbasara nna ya, na andị nchụ-aja ndị nke gbabaworo n’ime ọzara ahụ, ma bogide ha mbụpụ nke ụmụada ha.

24 Ma o wee ruo na eze ahụ dajụrụ n’ebe ndị ya nọ; ma ọ sịrị ha: Ka anyị gaa n’iru izute ndị m, na-ejighi ngwa-ọgụ; ma a na m adụrụ gị isi site n’ịn̄ụ iyi na ndị m agaghị egbu ndị gị.

25 Ma o wee ruo na ha soro eze ahụ, ma gaa n’iru na-ejighi ngwa-ọgụ izute ndị Leman. Ma o wee ruo na ha zutere ndị Leman ahụ; ma eze ndị Leman ahụ kpọrọ isi ala n’iru ha, ma rịọ arịrịọ n’aha ndị nke Lịmhaị.

26 Ma mgbe ndị Leman hụrụ ndị nke Lịmhaị, na ha ejighi ngwa-ọgụ, ha nwere aọmiko n’arụ ha ma wee daa juu n’ebe ha nọ, ma laghachị ha na eze ha n’udo lawa n’ala nke aka ha.