Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 19


Isi 19

Gịdiọn wee chọọ igbu Eze Noa—Ndị Leman wee buso ala ahụ agha—Eze Noa wee taa-ahụhụ ọnwụ site n’ọkụ—Lịmhaị wee chịa dịka eze ụtụ. Ihe dịka n’afọ 145 ruo 121 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na ndị-agha nke eze ahụ laghachịrị, ebe ha chọworo n’efu ịhụ ndị nke Onye-nwe ahụ.

2 Ma ugbua lee, ndị-agha nile nke eze ahụ dị ntakịrị, ebe e welatara ọnụ-ọgụgụ ha, ma a malitere inwe nkewa n’etiti ndị mmadụ fọdụrụ.

3 Ma ọnụ-ọgụgụ nke ka nta malitere ikupụta ikuku-mmaja nile megide eze ahụ, ma a malitere inwe nnukwu ndọrọ-ndọrọ n’etiti ha.

4 Ma ugbua e nwere otu nwoke n’etiti ha nke aha ya bụ Gịdiọn, ma ebe ọ bụ nwoke siri ike na onye-iro nke eze ahụ, ya mere o sepụtara mma agha ya, ma n̄ụọ iyi n’oke iwe ya na ya ga-egbu eze ahụ.

5 Ma o wee ruo na ọ lụsoro eze ahụ ọgụ; ma mgbe eze ahụ hụrụ na ọ chọọla imeri ya, ọ gbafuru ma gbaa ọsọ ma rigoro n’elu aụlọ-elu tọwa nke dị n’akụkụ temple ahụ.

6 Ma Gịdiọn chụsoro ya ma ọ chọrọ irigoro n’elu ụlọ-elu tọwa ahụ ka o gbuo eze ahụ, ma eze ahụ legharịrị anya gburu-gburu chee iru n’ala nke Shemlọn, ma lee, ndị-agha nke ndị Leman nọ n’ime oke nke ala ahụ nile.

7 Ma ugbua eze ahụ tipụtara mkpu na ihe mgbu nke mkpụrụ-obi ya, na-asị: Gịdiọn, hapụ m, n’ihi na ndị Leman abịakwasịwo anyị, ma ha ga-ebibi anyị; e, ha ga-ebibi ndị m.

8 Ma ugbua eze ahụ anaghị echegbu onwe ya gbasara ndị ya dịka o siri na-eche maka ndụ nke onwe ya; otu o sila dị, Gịdiọn hapụrụ ndụ ya.

9 Ma eze ahụ nyere ndị ahụ iwu ka ha gbafuo n’iru ndị Leman ma ya n’onwe ya gara n’iru ha, ma ha gbabara n’ime ọzara ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha.

10 Ma o wee ruo na ndị Leman chụrụ ha ọsọ, ma chụfee ha, ma malite igbu ha.

11 Ugbua o wee ruo na eze ahụ nyere ha iwu na ndi nwoke nile ga-ahapụ ndị nwunye ha na ụmụ ha, ma gbafuo n’iru ndị Leman.

12 Ugbua e nwere ọtụtụ ndị na-ekweghị ịhapụ ha, kama ga-achọ ịnọdụ ma laa n’iyi ha na ha. Ma ndị nke fọdụrụ hapụrụ ndị nwunye ha na ụmụ ha ma gbafuo.

13 Ma o wee ruo na ndị ahụ nọdụrụ ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha mere ka ụmụ-ada ọma ha nile ga-eguzo ma rịọ ndị Leman ka ha ghara igbu ha.

14 Ma o wee ruo na ndị Leman nwere ọmiko n’arụ ha, n’ihi ịma-mma nke ndịnyom ha toro ha akpịrị.

15 Ya mere ndị Leman hapụrụ ndụ ha, ma kpọrọ ha na ndọkpụ n’agha ma buru ha laghachị azụ n’ala nke Nifaị, ma kwenyere ha na ha ga-enwere ala ahụ, n’ọnọdụ na ha ga-enyefe eze Noa n’aka nke ndị Leman, ma nyefekwa akụ na ụba ha, ọbụna otu ọkara nke ihe nile ha nwere, otu ọkara nke ọla-edo ha, na ọla-ọcha ha, na ihe ha nile dị oke-ọnụ-ahịa, ma otu a ha ga na-akwụ ụtụ nye eze nke ndị Leman site n’afọ ruo n’afọ.

16 Ma ugbua e nwere otu n’ime ụmụ-nwoke eze ahụ n’etiti ndị ahụ a dọkpụụrụ n’agha, nke aha ya bụ aLịmhaị.

17 Ma ugbua Lịmhaị chọsịrị ike ka a ghara ibibi nna ya; otu o sila dị, Lịmhaị anọghị na amaghị-ama nke ajọọ-omume nile nke nna ya, ya na onwe ya ebe ọ bụ nwoke ezi-omume.

18 Ma o wee ruo na Gịdiọn zigara ndị mmadụ n’ime ọzara ahụ na nzuzo, ịchọ eze ahụ na ndị ha na ya nọ. Ma o wee ruo na ha zuru ndị mmadụ n’ọzara ahụ, ndị nile ewezuga eze ahụ na ndị nchụ-aja ya.

19 Ugbua ha an̄ụwọrịị iyi n’obi ha na ha ga-alaghachị n’ala nke Nifaị, ma ọbụrụ na e gbuwo ndị nwunye ha na ụmụ ha, na kwa ndị ahụ ha na ha soro nọdụ, na ha ga-emegwara, na kwa soro ha laa n’iyi.

20 Ma eze ahụ nyere ha iwu ka ha ghara ịlaghachi; ma ha were iwe megide eze ahụ, ma mee ka ọ taa ahụhụ, ọbụna ruo an’ọnwụ site n’ọkụ.

21 Ma ha chọrọ ịkpọrọ ndị nchụ-aja ahụ kwa ma gbuo ha, ma ha gbafuru n’iru ha.

22 Ma o wee ruo na ha chọrọ ịlagachị n’ala nke Nifaị, ma ha zutere ndịkom nke Gịdiọn. Ma ndịkom nke Gịdiọn gwara ha maka ihe nile meworo ndị nwunye ha na ụmụ ha; ma na ndị Leman ekwewo ha rịị na ha ga-enwere ala ahụ site n’ịtụ ụtụ nye ndị Leman ruo otu ọkara nke ihe nile ha nwere.

23 Ma ndị ahụ gwara ndị nke Gịdiọn na ha egbuworị eze ahụ, ma ndị nchụ-aja ya agbafuwọrịị site n’ebe ha nọ baa n’ebe dị n’ime ime ọzara ahụ.

24 Ma o wee ruo na mgbe ha mechaworo emume ahụ, na ha lagachịrị n’ala nke Nifaị ahụ, na-an̄ụrị ọn̄ụ n’ihi na ndị nwunye ha na ụmụ ha e gbụghị ha; ma ha gwara Gịdiọn ihe ha meworo eze ahụ.

25 Ma o wee ruo na eze nke ndị Leman an̄ụuru ha iyi, na ndị ya agaghị egbu ha.

26 Na kwa Lịmhaị, ebe ọ bụ nwa nwoke nke eze ahụ. ebe e wereworo ala-eze ahụ nyefee ya asite n’aka ndị ahụ, n̄ụrụ iyi nye eze nke ndị Leman na ndị ya ga-atụ ụtụ nye ya, ọbụna otu ọkara nke ihe nile ha nwere.

27 Ma o wee ruo na Lịmhaị malitere iwu ala-eze ahụ na iweta udo n’etiti ndị ya.

28 Ma eze nke ndị Leman ahụ debere ndị nche gburu-gburu ala ahụ, ka o wee debe ndị nke Lịmhaị n’ala ahụ, ka ha ghara ịpụ baa n’ime ọzara ahụ; ma ọ na-akwado ndị nche ya site n’ụtụ ahụ nke ọ na-anata site n’aka ndị Nifaị.

29 Ma ugbua eze Lịmhaị nwere udo esepụghị aka n’ala eze ya ruo afọ abụọ, na ndị Leman akpasughị ha iwe ma-ọbụ chọọ ibibi ha.