2010–2019
Inye Aha Ya Nsọpụrụ.
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Inye Aha Ya Nsọpụrụ.

Site na ị bụ ndị mere ọgbụgba ndụ na ndị a maara mere gbụgba ndụ, a kpọwo anyị na-aha Jizọs Kraịst.

Ka ndị nne na nna ji obi ụtọ na-eche ọmụmụ nwa, ha nwere oke na ọrụ ịhọpụta aha maka nwa ọhụrụ ha. Elemanya mgbe a mụrụ gị, e nyere gị aha nke si na ndị agbụrụ ezinaụlọ gị pụta. N’aka nke ọzọ e nwere ike aha ahụ e nyere gị bụ nke a maara nke ọma na-afọ a mụrụ gị ma ọbụ na mpaghara ebe a mụrụ gị.

Onye amụma Hilaman na nwunye ya nyere ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ ọhụụ Nifaị na Lihaị bụ ezigbo aha ndị si na ezinaụlọ ha. Hilaman mesịrị gwa ụmụ ya ndị dikom sị:

“E nyewo m unu aha nke ndị nne na nna anyị mbụ … nke bụ na mgbe ọbụla unu chetara aha unu unu ga-enwekwa ike cheta ha; ma mgbe unu chetara ha unu ga-enwe ike cheta ọrụ ha … na-ekwuwo ya, na-edewokwa ya, na ha rụrụ ọrụ ọma.

“Ọ bụ ya mere, ndị dikom m, ọ ga-amasị m ma unu mee ihe dị mma.”1

Aha ndị nke Nifaị na Lihaị nyeere ha aka icheta ọrụ ọma nke ndị nna nna ha ma gbakwaa ha ume ime ihe ọma.

Ụmụnne m ndị nwanyị, na-agbanyeghị ebe anyị bi, asụsụ anyị na-asụ, ma ọbụ na anyị gbara afọ 8 ma bụkwanụ108, anyị niile zakọtara aha pụrụ iche nwekwara otu ụdịrị ebumnuuche ndị a.

“N’ihi na [anyị] niile ndị e mere baptizim baa na Kraịst eyikwasịwo Kraịst … n’ihi na [anyị] niile bụ otu onye n’ime Kraịst Jizọs.”2

Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, “anyị ekwewo[rịị] nkwa na mbụ na anyị dị na njikere iwekwasị onwe anyị aha nke Kraịst … site na emume nsọ nke baptizm.”3 Site na-ọgbụgba ndụ nke a anyị ekwewo nkwa i cheta Ya mgbe niile, dobe iwu nsọ Ya niile, ma jeekwara ndị ọzọ ozi. Anyị na-egosị njikere anyị dị na-idobe ọgbụgba ndụ nke a ka anyị na-emegharị ọhụrụ Ụbọchị izuike ọbụla mgbe anyị so rie oriri nsọ ma ńụrịakwa ọzọ na ngọzi nke “ime[ihe] na ndụ ọhụrụ.”4

Aha e nyere anyị mgbe a mụrụ anyị na-egosị ihe eji mara onye ọbụla n’ime anyị ma nyekwa anyị ọnọdụ n’ime ezinaụlọ anyị n’elu ụwa. Kaosiladị, mgbe a “mụgharịrị anyị ọzọ” n’oge baptizm, nghọta anyị na-enwe banyere onye anyị bụ bawanyere. “N’ihi ọgbụgba ndụ nke unu gbaworo a ga-akpọ unu ụmụ nke Kraịst, … ma lee, … ọ mụwo unu na mmụọhe; unu asịwo na a gbanwego mkpụrụ obi unu site n’inwe okwukwe na-aha ya; ọ bụ ya mere, ọ mụwo unu ọzọ.”5

Ya bụ, site na ị bụ ndị mere ọgbụgba ndụ na ndị a maara mere gbụgba ndụ, a kpọwo anyị na-aha Jizọs Kraịst. Ma “e nwe[ghị] aha ọzọ e nyere ma-ọbụ ụzọ ọzọ ọbụla ma-ọbụ ụdị ọzọ nzọpụta ga-esi bịara ụmụ nke mmadụ, nanị n’ime nakwa site n’aha nke Kraịst, Onyenwe anyị nke Pụrụ Ime Ihe niile.”6

A maara aha Jizọs ọtụtụ oge tupu a mụọ Ya. Onye mmụọ ozi gbaara Eze Benjamin ama sị, “Ma a ga-akpọ ya Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke, … a ga-akpọ nne ya Meri.”7 Emekwara ka ụmụ Chineke mara maka “ịhụnaanya nke mgbapụta Ya”8 mgbe ọbụla e nwere ozi ọma n’ụwa, site n’oge Adam na Iv tutu ruo oge anyị ugbua, ka ha wee nwee ike “mara ebe ha ga-esi chọọ ụzọ ha ga-esi nweta mgbaghara mmehie ha.”9

Afọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson n’olu onye amụma rịọrọ ụmụnne ndị nwanyị ka ha“hazie ọdịniihu site na-inye aka na mkpokọta nke ndị Izrel ghasara aghasa.” Ọ kpọkuru anyị ka anyị gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn ma “kanye akara na amaokwu ọbụla kwuru okwu banyere ma ọbụ rụtụ aka n’ebe Onye Nzọpụta nọ.” Ọ sịrị anyị “nwee obi ikwu ihe gbasara Kraịst, na-ańụrị ọńụ n’ime Kraịst, na-ekwusa maka Kraịst anyị na [ezinaụlọ anyị] na ndị enyi anyị.” Ọ ga-abụkwa na-ibidogorịị ịmata uru nkwa ya na “a ga akpọketa gị na ha nso na-ebe Onye Nzọpụta nọ. … Mgbanwe, ọbụlaghị ọrụ-ebube nịịle , ga-ebido mewa.”10

Nkwa anyị kwere ị na-echeta Onye Nzọpụta mgbe niile na-enye anyị ume ịnọgide na- ezi omume na ihe ziri ezi—ọbụrụgodụ na anyị nọ na-ebe igwe mmadụ gbakọrọ ma ọbụ ebe anyị nọọrọ onwe anyị, ebe na-onweghị onye ma ihe anyị na-eme ewezuga Chineke. Mgbe anyị chetara Ya na aha Ya anyị na-aza, anyị enweghị ohere ibutu onwe anyị ala iji were ndị ọzọ tụnyere onwe anyị n’ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọbụ i kpe ikpe arụrụala. Anyị lekwasị anya na-ebe Onye Nzọpụta nọ, anyị na-ahụta nnọọ onye anyị bụ—onye dị n’obi Chineke.

Icheta ọgbụgba ndụ anyị gbara na-ebelata nsogbu nke ụwa, gbanwee e nweghị ntụkwasị obi ya abụrụ nkwamiike, ma nye olileanya n’oge nnwale.

Anyị kpọjie ụkwụ daa mgbe anyị na-aganiihu n’okporo nke ọgbụgba ndụ anyị, ihe anyị nwere bụ naanị icheta aha Ya na obi Ya jupụtara na ịhụnaanya n’ebe anyị nọ. Maka na o nwere ike niile, amamiihe niile, na ihe ihe pụtara niile; ọ ghtara ihe niile, ma ọ bụ Onye obi ebere … nyere ndị niile ga-enwe nchegharị kwere na-aha ya.”11 Na-ezia e nweghị ụda kacha dị ụtọ karịa aha Jizọs nye ndị niile ji, obi tiwara etiwa na mmụọ nke dị nchegharị, na-achọ “ime ihe kacha mma ma dịkwa mma karịchaa.”12

Onyeisi Nelson a kụziwo sị: “Oge ahụ agasịwo mgbe mmadụ nwere ike ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst mechiri ọnụ na-enweghị nsogbu. Ụzọ okpukpere chi gị a bụghị nnọọ naanị ị ga Nzukọ nsọ na Sọnde. Ọ bụ maka igosị onwe gị dị ka ezi onye na-eso ụzọ Kraịst site na ụtụtụ Sọnde ruo na abalị Satọde. … Enweghị ihe dị ka mmadụ ị sị na ya bụ onye na-eso ụzọ Kraịst mgbe ‘ọ sọrọ ya’.”13

Anyị ị dị na njikere iwekwasị onwe anyị aha Kraịst karịrị mgbanwe okwu n’ụzọ iwu kwadoro. Ọ bụghị nkwa a na-ekwe na-emeghị ihe ọbụla maka ya ma ọbụ ihe ehiwere n’ụkpụrụ omenaala. Ọ bụghị mmemme ndị ụka ma ọbụ ihe e dere aha tunye na-ahụ nke anyị na-etunye. Ọ bụghị ihe a na-ekwu ekwu nke anyị na-atụkwasị n’ebe a na-adọwa ihe ma ọbụ kowe na-ahụ ụlọ. Aha Ya bụ nke “a na-eyikwasị,”14 nke e dere na mkpụrụ obi anyị, na “nke a kanyere na mbara ihu [anyị].”15

E kwesịrị i cheta aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, mgbe niile, site na-echiche anyị, ihe ndị anyị na-eme, nakwa na mmekọrịta ihe nke anyị na ndị ọzọ. Ọ bụghị naanị na Ọ na-echeta aha anyị, kama Ọ na-echeta anyị mgbe niile. Onye-nzọpụta mara ọkwa sị:

“Ọ bụ na nwanyị o nwere ike ichefu nwa ya nke na-an̄ụ ara, nke ga-eme na-ọ gaghị enwe ọmịiko n’arụ nwa ya nwoke si na- akpa nwa ya? Ee, ha nwere ike ichefu, mana a gaghị m echefu gị, O ụlọ nke Israel.

“Lee, a kanyewo m gị n’ọba aka m.”16

Onyeisi George Albert Smith kuziri sị, “Kwanyere aha ahụ ị na-aza ugwu, maka na otu ụbọchị ị ga-enweta ohere dị iche na oke na ọrụ ị kọwara … Nna gị nke bi n’eluigwe … ihe i jigooro aha [ndị ahụ] mee .”17

Dị ka aha nke Nifaị na Lihaị ndị a kpachaara anya wee họrọ, e nwere ike ikwu ma ọbụ dee ihe banyere anyị na anyị bụ ezi ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst? Anyị na-enye aha Jizọs Kraịst onye nke anyị kpachaara anya wekwasị na-onwe anyị nsọpụrụ? Anyị bụkwa“onye ozi na onye mgba amaa ”18 nke ike nke mgbapụta Ya na obi Ya dị ịhụnaanya?

Mgbe na-adịghị anya, a nọọrọ m na-ege ntị banyere Akwụkwọ nke Mọmọn. Na nsọtụ nke Nifaị nke 2, a nụrụ m ka Nifaị kwuru ihe m na-agụtụbeghị mbụ na-ụdịrị ụzọ a tupu ruo oge ahụ. Na ozugbo ihe niile o dere na-akwụkwọ, ọ na-akuzi ma na-agba ama banyere “Onye Mgbapụta,” “Onye Nsọ nke Izrel,” “Nwa atụrụ nke Chineke,” na “Mesaịa ahụ.” Ma mgbe o mechiri akụkọ ya, a nụrụ m ka o kwuru okwu ndị a: “Ana m ańụrị ọńụ n’ikwu okwu dị mfe nghọta; A na m enwe ańụrị n’ezi okwu; Ana m enwe ańụrị na Jizọs m, n’ihi na ọ zọpụtawo mkpụrụ obi m.”19 Mgbe m nụrụ okwu ndị a, mkpụrụ obi m ńụrịrị ọńụ m wee gee ya ọtụtụ mgbe. A kọtara m ma mee ihe m kwesịrị ime banyere amaokwu ahụ dị nnọọ ka m siri mata ma zaa aha nke mụ onwe m.

Onyenwe anyị e kwuwo sị, “Ee, ngọzi dịrị ndị a ndị dị na njikere ịza aha m; n’ihi na n’aha m ka a ga-akpọ ha; ma ha bụ ndị nke m.”20

Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ka anyị “jiri obi ọma [yikwasị onwe anyị] aha nke Jizọs Kraịst”21 site na-iji ịhụnaanya, oke nrube isi, na-ịrụ ezi ọrụ nye aha Ya nsọpụrụ. A na m agba na Ọ bụ“Nwatụrụ nke Chineke, ee, ọbụla Ọkpara nke Nna dị Ebighị ebi.”22 Site na aha nke nwa Ya dị nsọ, Jizọs Kraịst, amen.