2010–2019
Ndị-Aka-ebe nile, Kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn, na Klasị nile nke ndị Ụmụ agbọghọ-nta
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Aka-ebe nile, Kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn, na Klasị nile nke ndị Ụmụ agbọghọ-nta

Nhazigharị ndị anyị n’ama ọkwa ha ugbua nwere ebumnuche ị nyere ndị ụmụ okorobịa-nta na ndị ụmụ agbọghọbịa-nta aka iwulite akaraka nsọ nke onwe ha.

Ụmụnne ọma ndị nwoke na nwanyị, ọ bụ ịhe ịma ị nọnyere unu ọzọ na ọgbakọ zuru-ọha. Na mbido izu-ụka nke-a, amara ọkwa nye ndị otú Nzukọ-nsọ maka mgbanwe iwu nke gbasara onye nwere ike ị bụ onye aka-ebe nke emume-nsọ baptizim na nke nrachi. Ọ ga-amasịm ị kwu obere ọkpụrụkpụ maka okwu atọ ahụ.

  1. Onye nwere tempụl rekọmend dị kọrent, tinyekwara limited rekọmend nwere ike ị bụ ọnye aka-ebe mgbe a n’eme baptizim nnochi onye nwụrụ-anwụ.

  2. Ọnye otú nweteworo onyinye-nsọ ma jirikwa tempụl rekọmend dị kọrentị nwere ike ị bụ onye aka-ebe na emume-nsọ nile nke nrachi, ma nke ndị dị ndụ ma nke nnochi-anya.

  3. Ọnye otú ọbụla nke Nzukọ-nsọ nwere ike ị bụ onye aka-ebe maka baptizim nke onye dị ndụ. Mgbanwe nke-a bụ maka baptizim nile nke a n’eme n’ezi tempụl.

Mgbanwe iwu nile ndịa gbasara nanị usoro eji e mee ịhe. Ozizi na ọgbụgbandụ nilre nke n’akwado ha agbanweghi. Ha ga-arọpụtakwa otu mpụta-ihe nime emume-nsọ nile. Mgbanwe ndịa kwesịrị iwulite ohere ezinụlọ nwere ị mekọta emume-nsọ ndịa ọnụ.

A chọkwara m ikwuru unu okwu n’oge a maka nhazigharị nile nke gbasara ndị ntorobịa anyi na ndị ndu ha nile.

Unu g’echeta na akpọrọ m ndị ntorobịa ndị Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ụbọchị Ikpeazụ a okú ka ha bata nime ndị agha-ntorobịa nke onye Nwe-anyị, ka ha soro nime ọrụ nke kachasị mkpa n’ụwa—mkpọkọta nke Izrel.1 E kwupụtaram okú a nye ndị ntorobịa anyị n’ihi ha nwere onyinye pụrụ-iche nke isetịpụ aka ruo ndị ọzọ ma kesara ha ịhe ha kwenyere n’ụzọ kwere nnabata. Ọrụ nke mkpọkọta bụ otu nime ịhe dị mkpa n’enye aka n’ịkwado uwa nke-a na ndị mmadụ ya maka Ọbịbịa nke Abụọ ahụ nke Onye Nwe-anyị.

Nime ngalaba ụka ọbụla, onye n’edu ndị-agha ntorobịa nke Onye Nwe-anyị bụ bishọpụ, ezigbote onye oru nke Chineke. Ọrụ mbụ ya nke kachasị mkpa bụ ịlekọta ndị okorobịa-nta na ndị agbọghọ nta nke ngalaba ụka nta ya. Bishọpụ na ndị ndụmọdụ ya n’atuzi aka maka ọrụ nke kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọm ma nke klasị nile nke Ụmụ Agbọghọ-nta.

Nhazigharị ndị anyị n’ama ọkwa ha ugbua nwere ebumnuche ị nyere ndị ụmụ okorobịa-nta na ndị ụmụ agbọghọbịa-nta aka iwulite akaraka nsọ nke onwe ha. Anyị chọkwara ị gba ume nye kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn na klasị nile nke Ụmụ Agbọghọ-nta ma nyekwa bishọpụ nile na ndị okii ndi ndu nile nkwado dịka ha n’ejere ndị ogbo n’eto-eto ozi.

Okenye Quentin L. Cook gazi ekwu maka nhazigharị ndị nke gbasara ụmụ okorobịa-nta. Ma n’abalịa, na ọgbakọ zuru-ọha nke ndị ụmụnwanyị nile, Nwanne-nwanyị Bonnie H. Cordon Onye Isi Zuru-ọha nke otú Ụmụ Agbọghọ-nta, g’ekwu maka nhazigharị nke gbasara ụmụ agbọghọ-nta.

Otú Ndi Isi Nduzi nke Mbụ na Ndị Iri Abụọ jikọtara aka n’ịkwado mbọ ndịa nile emere maka ị gba ndị ntorobịa anyị ume. Oh, otu anyị sị hụ ha n’anya ma n’ekpere ha ekpere! Ha bụ “Olileanya nke Izrel, ndị agha nke Zaịọn, ụmụaka nke ụbọchị ahụ ekwere.”2 Anyị n’ekwupụta ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ndị ntorobịa anyị nọ ma ekele anyị nwere maka ha. Site na aha di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. See Russell M. Nelson, “Hope of Israel” (worldwide devotional for youth, June 3, 2018), HopeofIsrael.ChurchofJesusChrist.org.

  2. “Hope of Israel,” Hymns, no. 259.