2010–2019
Mgbe Mnwale nke Okwukwe Anyị Gasịrị
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Mgbe Mnwale nke Okwukwe Anyị Gasịrị

Dịka anyị n’eso olu nke Chineke ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgbandụ Ya, Ọ g’agba anyị ume site na mnwale nile anyị.

Mgbe m bụ nwata, Frank Talley, otu onye otú Nzukọ-nsọ onye nwere obi ọma sịrị ọ g’enyere ndị ezinụlọ anyị aka fee nime ụgbọ-elu, siri Puerto Rico ruo Salt Lake City k’anyị wee nwe ike rachie n’ime tempụl, mana oteghi-aka, ọdachị abịawa. Otu nime nwanne m nwanyị, Marvid dara ọrịa. N’obi nsogbu, ndị nne-na-nna m kpere epere maka ịhe ha g’eme ma ọ metụtara ha n’obi na ha g’eme njem ahụ. Ha tụkwasịrị obi n’obụrụ na ha soro mkpali nke Onye Nwe-anyị, a g’elekọta ndị ezinụlọ anyị anya ma gozie ha—ma nke-a mezuru.

N’agbanyeghi ọdachị cheere anyị n’ihu na ndụ a, anyị nwere ike ịtụkwasi-obi na Jizọs Kraịst g’akwado ụzọ n’ihu anyị, dịka anyị n’eje ije okwukwe. Chineke ekwewo nkwa na mmadụ nile ndị g’ebi ndụ ha dịka ọgbụgbandụ ha na Ya mere sịrị dị, ga, n’ogeYa, nata ngọzị nile Ọ kwere na nkwa. Elder Jeffrey R. Holland kwuru na, “Ụfọdụ ngọzị n’abịa ọsịsọ, ụfọdụ anaghị abịa ọsịsọ, ma ụfọdụ anaghị abịa n’ụwa; mana maka ndị ahụ nabatara oziọma nke Jizọs Kraịst, ha n’abịa.”1

Moronai kuziri na “okwukwe bụ ihe ndị atụrụ anya ha ma ahụghị ha anya; ya mere, arụla-ụka n’ihi na unu ahụghị, n’ihi na unu enwetaghị aka ebe ruo mgbe a nwalesiworo okwukwe unu.”2

Ajụjụ anyị bụ: “Kedụ ịhe kacha nma anyị kwesịrị ị mee iji megide mnwale nile n’abịara anyị?”

Na Ọnwa Jenuarị 16, 2018, mgbe o kwuru okwu oha nke mbụ ya dịka Onye Isi nke Nzukọ-nsọ, Onye Isi Russell M. Nelson kuziri: “ Dịka ndị otú Ndị Isi nke ọhụrụ, anyị chọrọ ibido ọrụ ma buru njedebe ya n’uche. N’ihi ebumnuche nke a, anyị n’ekwuru unu taa site n’otu tempụl. Ngwụcha ahụ nke onye ọbụla nime anyị n’agbalị bụ inwete onyinye ike n’ime ụlọ nke Onye-nwe-anyị, nrachịkọta dịka ezi-na-ụlọ, kwụsị ike n’okwukwe maka ọgbụgba-ndụ ndị emere n’ime tempụl nke na-eme anyị itoru maka onyinye nke Chineke kacha ibe Ya—nke bụ ndụ ebighị-ebi. Emume-nsọ niile nke tempụl na ọgbụgba-ndụ niile ị na-eme ebe ahụ bụ ihe dị mkpa eji agba ndụ gị ume, alụm dị na nwunye gị, na ezi-na-ụlọ gị, na ike gị iji guzogịde agha niile nke onye-iro. Ofufe gị n’ime tempụl na ije-ozi gị n’ebe ahụ maka ndị nna nna nna gị ga eji mkpughe bara ụba nke onwe na udo gọzie gị, ma ga emezi nkwenye gị ịnọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ ahụ.”3

Dịka anyị n’eso olu nke Chineke ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgbandụ Ya, Ọ g’agba anyị ume site na mnwale nile anyị.

Njem tempụl nke ezinụlọ anyị rara ezigbo ahụ, ma mgbe anyị ruziri Tempụl nke Salt Lake City, Utah, nne m, onye jupụtara n’ọñụ n’okwukwe, kwuru, “Ọ g’adịrị anyị na nma; Onye Nwe-anyị g’echekwa anyị.” Anyị rachri anyị dịka ezinụlọ, ma nwanne m nwanyị gbakere n’ọrịa. Ịhe nke-a mere nanị mgbe anwara okwukwe nne-na-nna m ma mgbe ha rubere isi nye mkpali-mụọ nke Onye Nwe-anyị.

Ọmụmatụ nke nne na nna m, ka n’edu ndụ anyị ruo taa. Ọmụmatụ ahụ kụziri anyị uru ozizi nke oziọma, ma nyere anyị aka ghọta nkọwa, ebumnuche, na ngọzi nile nke oziọma n’ewete. Ị nwe nghọta maka uru dị nime oziọma nke Jizọs Kraịst g’enyere anyị aka iji okwukwe merie mnwale nile anyị.

N’ikpeazu, ịhe nile Chineke chọrọ k’anyị mee ma nye anyị n’iwu bụ ngosipụta ịhụnanya Ọ nwere maka anyị ma ọchịchọ-obi Ya ị nye anyị ngọzị nile nke O dobere ndị kwụsiri-ike n’okwukwe. Anyị ekwesịghị iche n’obi anyị na ụmụaka anyị g’eji aka ha mụta otu esi ahụ oziọma n’anya; ọ bụ oké-n’orụ anyị i kuziri ha. Dịka anyị n’enyere ụmụaka anyị aka ị mụta otu esi eme ezi nhọrọ nke ha, ọmụmatụ anyị g’akpali obi ha ị meekwa ezi nhọrọ nke ha. Ndụ okwukwe nke ha gakwa enyere ụmụ ha aka ị matakwa eziokwu nke oziọma maka onwe ha.

Ụmụ okorobịa nta na ndị ụmụ agbọghọ-nta, geenụ ntị ka onye amụma nagwa unu okwu taa. Chọọnụ ị mụta eziokwu nke dị nsọ, ma chọọnụ ka unu ghọta oziọma nke-a ofụma maka onwe unu. Oge n’eteghi-aka, Onye isi Nelson nyere ndụmọdụ nke-a: “Kedụ amamịhe nke kọọrọ unu? … Soro ọmụmatụ nke Onye amụma Josef. Chọta ebe dara jụụ. … Nwedata onwe gị n’umeala n’ihu Chineke. Wụpụta obi gi nile nye Nna gị nke Igwe. Gakwuru Ya maka aziza nile.”4 Dịka unu n’achọ odudu n’aka Nna gị nke Igwe, onye dị ịhụnanya, n’ege ntị nye ndụmọdụ nile nke ndị amụma dị ndụ, ma n’ahụta ọmụmatụ nke nne-na-nna ndị eziomume, gị onwe gị g’abụkwa onye siri ike nime njikọ nile nke ezinụlọ gị.

Maka ndị nne na nna nwere ụmụaka ndị hapụoro ụzọ ọgbụgbandụ ahụ, jiri wayọ laghachi azụ. Nyere ha aka ị nwe ezi nghọta nke eziokwu nile nke oziọma. Bido ugbua; oge ya agwụbeghi.

Ọmụmatụ nke ndụ eziomume anyị nwere ga-arọpụta ezi ịhe. Onye Isi Nelson ekwuwo: “Dịka ndị Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazua, anyị ebidowo íché na ‘nzukọ-nsọ’ bụ ịhe n’eme nime ụlọ-ọgbakọ anyị, nke ịhe n’eme n’ime ezinụlọ na-akwado. Anyị kwesịrị ị ghazigharị ụdị usoro nke-a. Oge eruwo maka nzụkọ-nsọ nke ezinụlọ, nke a na-akwado site ihe n’eme n’ime ụlọ-ọgbakọ nile ngalaba ụka-nta na stek nile.”5

Akwụkwọ-nsọ n’akụzi, “Zulite nwata nụzọ ọ kwesịrị ijee: ma mgbe ọ ga-etolite, ọ gaghị esi nime ya pụọ.”6

Ha n’ekwukwa, “Ma ugbua, dịka ịkwusa okwu ahụ nwere nnukwu ike idu ndị ahụ ime ihe ahụ nke zịrị-ezi—e, o nweworịị nsonazụ kara sie ike n’obi nile nke ndị ahụ karịa mma-agha ahụ, ma-ọbụ ihe ọzọ ọbụla, nke meworo ha—ya mere Alma chere na ọ dị mkpa na ha ga-anwale ezigbo omume nke okwu Chineke ahụ.”7

Enwere akụkọ akọrọ maka otu nwanyị onye iwe were n’ihi nwa ya nwoke n’eri ọtụtụ kandi. N’agbanyeghi ọtụtụ oge ọ gwara ya k’ọkwụsị, ọ gara n’ihu n’eri ịhe ụtọ-ụtọ. N’obi oke mkpagbu, ọ kpebiri ị kpọga nwa ya nwoke ka ọ jee hụ otu nwoke nwere akọnuche onye ọ na-enye ezigbo nsọpụrụ.

Ọ jekwuru ya ma kwuo, “ Nna-ukwu, nwa m nwoke n’eri ọtụtụ kandi. Biko ị nwere ike ị gwa ya ka ọ kwụsị iri ya?”

Ọ kpachapụrụ anya gee ntị, ma gwa nwa ya nwoke okwu sị, “Laa ụlọ, ma bịaghachi n’izu-ụka abụọ.”

Ọ kpọọrọ nwa ya nwoke ma laa ụlọ, ma nwee itụn’anya ịhe mere o ji ọ gwaghị nwa-nwoke ahụ ka ọ kwụsị iri ọtụtụ kandi.

Mgbe izu-ụka abụọ gafere, ha laghachiri. Nwoke akọnuche ahụ lebara nwa nwoke ahụ n’anya ma kwuo, “Nwa nwoke m, ị kwesịrị ị kwụsị iri ọtụtụ kandi. Ọ dịghị nma maka ahụ isi-ike gị.”

Nwa nwoke ahụ kwere n’isi ma kwe nkwa na ọ ga eme otua.

Nne nwa nwoke ahụ jụrụ, “Gịnị mere ị gwaghị ya nke-a izu-ụka abụọ gara-aga?

Nwoke akọnụche ahu rara ihu ọchị. “Izu-ụka abụọ gara-aga, mụ onwe m ka n’eri ọtụtụ kandi.”

Nwoke ahụ biri ndu eziokwu nke mere o jiri mara na ndụmọdụ ya ga enwe ike nanị m’ọbụrụ na o n’esorokwa ndụmọdụ nke ya.

Mmetụta nke anyị ga-enwe nime ndụ ụmụ anyị ga esi ike mgbe ha na ahụ anyị n’eje iji ije okwukwe n’ụzọ nke ọgbụgbandụ ahụ. Onye amụma Jekọb nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ezigbo ọmụmatụ nke ụdị eziomume ahụ. Nwa ya nwoke bụ Inos dere maka mmetụta nke Jekọb nwere na ndụ ya:

“Lee, o wee ruo na mụ, Inọs, ebe m matara nna m na ọ bụ nwoke ziri-ezi—n’ihi na ọ kụziri m n’asụsụ ya, na kwa na nzulite na ịdọ-aka na-ntị nke Onye-nwe—Ma ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m maka ya. …

“… Ma okwu ndị ahụ nke m nụworo ugboro-ugboro ka nna m na ekwu ya gbasara ndụ-ebighi-ebi, na ọn̄ụ nke ndị nsọ nile, mibara ala-ala n’ime obi m.”8

Ndị nne nile nke ụmụ okorobịa ndị agha ahụ, biri ndụ nke oziọma, ma ụmụ ha jupụtara na nkwenye. Onye isi agha ha dere:

“Akụziworo ha site n’aka ndị nne ha nile, na ọbụrụ na ha enweghị obi-abụọ, Chineke ga-anapụta ha.

“Ma ha kwugharịrị nye m okwu nile nke ndị nne ha nile, na-asị: Anyị enweghị obi-abụọ ndị nne anyị matara ya.”9

Inọs nakwa ụmụ okorobịa ndị agha ahụ bụ ndị agbara ume site n’okwukwe nke nne-na-nna ha, nke nyere ha aka i meri mnwale nile nke okwukwe ha.

Anyị bụ ndị agọziri n’ihi oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachiri n’ụbọchị anyị, nke n’ebuli anyị elu mgbe obi anyị dara mba m’ọbụ nwe mkpagbu. A na akasị anyị obi na mbọ anyị nile ga-amị mkpụrụ n’oge Onye Nwe-anyị m’ọbụrụ n’anyị gaa n’ihu nime mnwale nile nke okwukwe anyị.

N’oge n’eteghi aka, mụ na nwunyem na Ndị Isi Nduzi Area, soro Okenye David A. Bednar gaa ofufe-nro nyefe nke Tempụl nke Haiti Port-au-Prince. Nwa anyị nwoke onye so anyị bịa, kwuru maka nhụmịhe ya: “ Ọ dị egwu, Mpa! Otumgbe ahụ Okenye Bednar bidoro ekpere nyefe ahụ, Ọ metụtaram n’obi dịka ihé na ekpom-ọkụ nabata nime ime-ụlọ ahụ. Ekpere ahụ gbakwụnyere ọtụtụ ịhe n’elu ịhe m mụtara gbasara ebumnobi tempụl. N’ezie, Ọ bụ ụlọ nke Onye-nwe-anyị.”

Nime Akwụkwọ nke Mọmọn, Nifaị n’akụzi na dịka anyị n’achọ ị mata uche nke Chineke, Ọ ga-agba anyị ume. Ọ dere, “Mụ, Nifaị, ebe m ka bụ nwata … ma nwe kwa ọchịchọ ịmata ihe omimi nile nke Chineke, ya mere, ebekuru m Onye-nwe; ma lee ọ bịara leta m, mee kwa ka obi m dị nro na m kwenyere okwu nile nke nna m kwusịworo; ya mere, e nupụghị m isi megide ya dịka ụmụnne m nwoke ndị ọzọ.”10

Ụmụnne nwoke na nwanyị, k’anyị nyere ụmụ anyị na ndị ọzọ nọ n’akụkụ anyị aka ka ha soro ụzọ ọgbụgbandụ nke Chineke, ka Mụọ ahụ wee nwe ike ị kuziri ha ịhe ma mee ka obi ha dị nro, ka ha nwe ọchịchọ-obi i soro Ya ogologo ndụ ha.

Mgbe m n’eche maka ọmụmatụ nke nne-na-nna m, a bịara m mata na okwukwe nke anyị nwere na Jizọs Kraịst n’egosi anyị ụzọ laghachi azụ n’ebe obibi nke igwe anyị. A mam na ọrụ-ebube n’abịa mgbe anwawosịrị okwukwe anyị.

A na m agba ama maka Jizọs Kraịst ma maka aja mmehie Ya. A mara m na Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Ya na Nna anyi nke Igwe bịakwutere Joseph Smith nta onye amụma nke Mnweghachi n’ụtụtụ ahụ nke afọ 1820. Onye Isi nduzi Russell M.Nelson bụ onye amụma nke ụbọchị anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen