2010–2019
Mmetụaka nke Onye-nzọpụta
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Mmetụaka nke Onye-nzọpụta

Dịka anyị na-abịakwute na Ya, Chineke ga-abịa ịnapụta anyị, ma ịgwọ anyị ọrịa ma ọbụ inye anyị ume imeri ọnọdụ ọbụla.

Ihe ruru 2,000 afọ abụọ gara aga, Onye-nzọpụta gbadatara ala site n’elu ugwu mgbe ọ kuzichara okwu Ngọzi niile, na ụkpụrụ ozi ọma niile ndi ọzọ. Dịka Ọ na-aga ije, otu nwoke ọrịa ekpenta bịakwutere Ya. Nwoke ahụ gosipụtara nsọpụrụ na nkwanye ugwu dịka o sekpuoro n’ihu Kraịst, na-achọ enyem aka pụọ na nsogbu ya. Arịrịọ ya dịịrị mfe: “Onye-nwe-anyị, ọ bụrụ na ịchọọ, ị ga-eme m ụcha.”

Onye-nzọpụta mgbe ahụ setịpụrụ aka Ya ma, ịmetụ ya aka, kwuru, “A ga m; dịrị ụcha.”1

Anyị na-amụta ebe a na Onye-nzọpụta anyị chọrọ ịgọzi anyị mgbe niile. Ụfọdụ ngọzi nwere ike bịa ozugbo, ndi ọzọ nwere ike igbu oge, ma ụfọdụ nwere ike ịbịa ọbụna mgbe ndụ nkea gasịrị, kama ngọzi ga-abịa mgbe oge ya ruru.

Dịka nnọọ ka onye ekpenta ahụ, anyị nwere ike chọta ike na nkasi obi n’ime ndụ nkea site n’ịnabata uche Ya na ịmara na Ọ chọrọ ịgọzi anyị. Anyị nwere ike chọta ike igabiga aka mgba ọbụla, iji merie ọnwụnwa niile, na ịghọta ma nogide ọnọdụ anyị niile siri ike. N’ezie, n’oge nke ndụ Ya kacha dị egwu, ike nke Onye-nzọpụta ịnọgide bịara sie ezigbo ike dịka Ọ gwara Nna Ya, “Ka emee uche Gị.”2

Onye ekpenta ahụ emeghị arịrịọ ya n’ụzọ aghụghọ ma ọbụ omume anya ukwu. Okwu ya gosipụtara agwa dị umeala, nwere nnukwu ebumnobi kama jirikwa ezi ọchịchọ na uche nke Onye-nzọpụta ga-eme. Nkea bụ otu ọmụmatụ nke agwa nke anyị kwesịrị iji abịakwute Kraịst. Anyị nwere ike ịbịakwute Kraịst jiri eziokwu ahụ na ọchịchọ Ya ga-abụ ma bụrịrị nke kacha mma maka ndụ anụ ahụ na nke ebighị ebi anyị. O nwere nghọta ebighị ebi nke anyị enweghị. Anyị ga-abịakwuterịrị Kraịst jiri ọchịchọ ziri ezi na uche nke anyị ka uche nke Nna ga ekpugide, dịka otu Ọ nke ya dị.3 Nkea ga-akwado anyị maka ndụ ebighị ebi.

O siri ezigbo ike iche maka ntaram ahụhụ nke anụ ahụ na nke mụọ nke dakwasịrị onye ekpenta ahụ onye bịakwutere Onye-nzọpụta ahụ. Ekpenta n’emetụ akwara na akpụkpọ, n’akpata nrụrụ na nkwarụ. Na mgbakwunye, ọ kpatara nnukwu ihere n’ihu ndi mmadụ. Onye ọbụla ọrịa ekpenta bịara na-ahapụ ndi ọ hụrụ n’anya ma wepụ onwe ya site n’obodo. Ndi ekpenta ka ahụtara dịka ndi n’adịghị ọcha, ma na-ahụ ma ime mụọ. N’ihi nkea, iwu nke Mosis na-achọ ka ndi ekpenta yiri uwe dọwara adọwa ma kpọpụta “Adịghị Ụcha!” dịka ha gafere.4 Na nrịa nrịa na nleda anya, ndi ekpenta n’emesi biri n’ụlọ ajụrụ ajụ ma ọbụ ebe ili.5 Ọ raghị ahụ iche na onye ekpenta ahụ bịakwutere Onye-nzọpụta nwere obi mgbawa.

Mgbe ụfọdụ—n’otu ụzọ ma ọbụ ọzọ—anyị onwe anyị nwere ike nwee obi mgbawa, ma ọbụ maka omume nke onwe anyị ma ọbụ nke ndi ọzọ, n’ihi ọnọdụ niile anyị nwere ike ma ọbụ enweghị ike metazie. N’ụdị oge ahụ, anyị nwere ike tinye uche nke anyị n’aka Ya.

Afọ ole na ole gara aga, Zulma—nwunye m, onye mezuru m nkeọma, akụkụ m kachasị mma—natara ozi ndi siri ike nanị izu ụka abụọ ruo n’agbam akwụkwọ otu nwa anyị. O nweere ahụ otutu n’ime gland parotid ya, ma ọ naara amụba eleghị anya na-azụ. Ihu ya bidoro na-aza, ma o kwesịrị ịwa-ahụ siri ike ozugbo. Ọtụtụ echiche gara ya n’obi ma bụrụ ibu arụ nye obi ya. Akpụ ahụ ọ dị ọjọọ? Olee otu ahụ ya ga-esi gbakee? Ihu ya ọ ga-ada ngwọrọ? Olee otu ike ụfụ ahụ ga-adị? Ihu ya ọ ga-enwe ọnya ga-adịgide? Akpụ ahụ ọ ga-etopụta ọzọ ma ewepụchaa ya? Ọ ga-enwe ike galie agbam akwụkwọ nke nwa anyị nwoke? Dịka o dinara n’ime ọnụ ụlọ iwa-ahụ, obi gbawara ya.

N’ime oge ahụ dị oke mkpa, Mụọ ahụ gbaara ya ama na ọ dị mkpa na ọ nabatara uche nke Nna. Mgbe ahụ o kpebiri itinye ntụkwasị obi ya n’ime Chineke. O nwetere mmetụta siri ike na ihe ọbụla pụtara, uche Ya ga-akacha mma n’ihi ya. N’eteghị aka ọ dabara n’ime ụra nke ịwa-ahụ.

Emesịa, o dere dịka abụ n’ime akwụkwọ ndekọta ya: “N’elu okpokoro nke dọkinta ịwa-ahụ ka m kpọrọ isi ala n’ihu Gị, ma n’iyefe onwe m n’uche Gị, adabara n’ụra. A maara m na m ga-enwe ike tụkwasị obi na Gị, mara n’enweghị ihe ọjọọ nwere ike ịbịa site na Gị.”

Ọ chọtara ike na nkasị obi site n’inyefe uche ya n’aka nke Nna ahụ. Ụbọchị ahụ, Chineke gọziri ya nke ukwuu.

Ihe ọbụla bụ ọnọdụ anyị nwere ike ịbụ, anyị nwere ike nwee okwukwe ịbịakwute Kraịst ma chọta Chineke anyị nwere ike ịtụkwasị obi. Dịka otu n’ime ụmụ, Gabriel, m dere otu mgbe:

Dịka otu onye-amụma si kwuo, Ihu nke Chineke na-amuke karịa anyanwụ

ma ntụtụ Ya na-acha ọcha karịa snow

ma olu Ya na-ada dịka osimiri na-achị achị,

ma ọzọ n’ebe Ọ nọ enweghị ihe mmadụ bụ. …

Obi alawo m mmiri dịka m matara na ọbụna mụ onwe enweghị ihe m bụ.

Ma nanị mgbe ahụ ka m jiri ume mgwụ chọta ụzọ ruo na chineke m nwere ike ịtụkwasị obi.

Ma nanị mgbe ahụ ka m hụtara Chineke m nwere ike ịtụkwasị obi.6

Otu Chineke anyị nwere ike ịtụkwasị obi na-amasị olile anya anyị ike. Anyị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya ma na-achọ ihe kachasị mma maka anyị n’ime ọnọdụ niile.

Onye ekpenta bịara n’ihu n’ihi ike nke olile anya. Elu ụwa enweghị ngwọta o nyere ya, ọbụladị nkasị obi. Ya mere, mmetụaka dị mfe nke Onye-nzọpụta ga adịrịrị ya dịka mmetụaka nye mụọ ya niile. Anyị nwere ike chee nanị mmetụta miri emi nke obi ekele onye ekpenta ahụ nweteworo na mmetụaka nke Onye-nzọpụta, karịsịa mgbe ọ nụrụ okwu ndi ahụ “A ga m; dịrị ọcha.”

Akụkọ ahụ na-asị na “ozugbo ekpenta ya pụrụ.”7

Anyị onwe anyị nwere ike nwete mmetụta nke mmetụaka aka ịhụnanya na-agwọ ọrịa nke Onye-nzọpụta ahụ. Ụdị ọńụ, olile anya, na ojuju obi ekele na-abịa n’ime obi anyị n’ịmara na Ọ chọrọ inyere anyị aka dịrị ọcha! Dịka anyị na-abịakwute na Ya, Chineke ga-abịa ịnapụta anyị, ma ịgwọ anyị ọrịa ma ọbụ inye anyị ume imeri ọnọdụ ọbụla.

Otuosiladị, ịnabata uche Ya—n’abụghị nke anyị—g’enyere anyị aka ghọta ọnọdụ anyị. Enweghị ihe ọjọọ na-abịa site na Chineke. Ọ maara ihe kacha mma nke anyị. Elemanya Ọ gaghị ewepụ ibu anyị ozugbo. Oge ụfọdụ Ọ nwere ike mee ibu ndi ahụ adịrị mfe, dịka O meere Alma na ndi ya.8 N’ikpeazụ, n’ihi ọgbụgba ndụ, ibu ndi ahụ ka a ga ewepụ,9 ma ọbụ n’ime ndụ nkea ma ọbụ na Mbilite n’Onwụ dị nsọ.

Ọchịchọ ziri ezi na uche Ya ga-eme, tinyekwa nghọta ọdịdị dị nsọ nke Onye Mgbapụta anyị, n’enyere anyị aka ịmepụta ụdị okwukwe nke onye ekpenta gosipụtara iji nwee ike nwete nsachapụ. Jizọs Kraist bụ Chineke nke ịhụnanya, Chineke nke olile anya, Chineke nke ọgwụgwọ, Chineke onye chọrọ ịgọzi anyị ma nyere anyị aka ịdị ọcha. Nke ahụ bụ ihe Ọ chọbuuru tupu ịbịa n’elu ụwa a mgbe O wepụtara onye ya ịnapụta anyị mgbe anyị dabara n’ime njọ. Nke ahụ bụ ihe Ọ chọbuuru n’ime Getsemena mgbe O zutere oké mgbu n’enweghị atụ n’oge ntaram ahụhụ nke ịkwụ ụgwọ nke njọ. Nke ahụ bụ ihe Ọ chọrọ ugbua mgbe Ọ na-arịọ arịrịọ n’ihi anyị n’ihu Nna.10 Nke ahụ bụ ihe mere olu Ya sị na-adakwa ụda: “Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”11

O nwere ike ịgwọ anyị ma bulie anyị elu n’ihi O nwere ike ime ya. O wekwasịrị Onwe Ya mgbu niile nke anụ-ahụ na mụọ ka afọ Ya jupụta n’ebere iji nwee ike nyere anyị aka n’ime ihe niile na ịgwọ anyị na ibuli anyị elu.12 Okwu nke Aịzaịa, dịka Abinadaị kwuru, tinye ya n’ụzọ dị ọma ma kwe nghọta:

“N’ezie o buruwo arịrị anyị niile, ma buru mwute anyị niile. …

“… E merụrụ ya arụ n’ihi njehie anyị nile, e tirụrụ ya arụ n’ihi ajọọ-omume anyị nile; ịta nnukwu ahụhụ nke udo anyị dị n’isi ya, ma n’ihi ụfụ arụ ya a gwọwo anyị.”13

Ụdị echiche nkea kwa ka ekuziri n’ime abụ nkea:

“O Kapịnta nke Nazaret,

Obi nkea, nke gbawaworo gafee ngwọta,

Ndụ nkea, nke mebisiworo ruo ọnwụ,

O, I nwere ike mezie ha, Kapịnta?”

Ma site n’aka Ya dị obiọma ma dị njikere,

Ndụ nke Onwe ya mara mma ka etinyekọtara

Ndụ anyị dum, tutu ha eguzoro

Okike Ọhụrụ—“ihe niile adị ọhụrụ.”

“[Ururu] ihe niile mebiri emebi nke obi [ahụ],

Ọchịchọ, ebumnobi, olile anya, na okwukwe,

Kpụọ Gị ịbụrụ akụkụ zuru oke,

O, Kapịnta nke Nazaret!”14

Ọ bụrụ na i chee n’ụzọ ọbụla na ị dịghị ọcha, ọ bụrụ na ị dara mba, biko mara na enwere ike ime gị adị ọcha, enwere ike imezi gị, nihi na Ọ hụrụ gị n’anya. Nwee ntụkwasị obi na enweghị ihe ọjọọ ọbụla nwere ike ịbịa site na Ya.

N’ihi na Ọ “gbadatara n’okpuru ihe niile,”15 Ọ na-eme ihe niile nke mebiworo n’ime ndụ anyị dị mfe imezie, ma ya mere anyị nwere ike mezie adịnamma anyị na Chineke. Site na Ya, ihe niile ka emeziworo, ma ihe niile dị n’elu ụwa na ihe niile dị n’eluigwe, na-ewete “udo site n’ọbara nke obe ya.”16

Ka anyị bịakwute Kraịst, n’esoro usoro niile dị mkpa. Dịka anyị na-eme, ka omume anyị bụrụ otu nkwupụta, “Onye-nwe-anyị, ọ bụrụ uche gị, gị nwere ike ime m ọcha.” Ọ bụrụ ma anyị mee otu a, anyị nwere ike nwete mmetụaka ọgwụgwọ nke Nna Ukwu, ya na ọmarịcha ụda nke olu Ya: “A ga m; dịrị ọcha.”

Onye-nzọpụta bụ otu Chineke anyị nwere ike inwe ntụkwasị obi na ya. Ọ bụ Kraịst ahụ, Onye Etere Mmanụ, Mezaya ahụ, Onye nke m na-agba ama na aha Ya dị Nsọ, ọbụna Jizọs Kraist, amen.