2010–2019
Nogide n’Ekpere Mgbe Niile
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Nogide n’Ekpere Mgbe Niile (Alma 34:39; Moronaị 6:4; Luk 21:36)

Ịmụrụ anya mgbe niile bụ ihe achọrọ iji megide afọ ojuju na ime ihe n’ụkpọrọ.

A na m ekpesi ekpere ike maka enyem aka nke Mụọ Nsọ maka gị na mụ dịka anyị na ańụrịkọta ma na efe ufufe.

N’ime Eprel nke 1976, Okenye Boyd K. Packer kwuru okwu kpom kwem nye ndi ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ n’ime ọgbakọ zuruọha. N’ime ozi ya pụrụiche nke a kpọrọ “Agụ iyi Ime Mụọ,” ọ kọwara otu n’oge otu ọrụ n’ime Afrịka ọ hụtara agụ iyi zoro onwe ha nke ọma na-eche iri ndi n’ahụtaghị ha. Mgbe ahụ ọ kọwara agụ iyi ndi ahụ dịka Setan, onye na-edufu ndi ntoroọbịa n’adịghị ike site n’izo ọdịdị ọjọọ nke njọ.

Agbara m afọ 23 mgbe Okenye Packer nyere okwu ahụ, ma Susan ma mụ naara ele anya ọmụmụ nke nwa anyị mbụ nanị n’ime mkpụrụ ụbọchị ole ma ole. Ihe o kwuru n’ozi ya masịrị anyị nke gbasara izere njọ na ụzọ kacha elu o si jiri omume nkịtị nke ụmụ anụmanụ ji kuzie nkuzi ime mụọ dị mkpa.

Mụ na Susan emewokwa njem gaa Afrịka maka ọtụtụ ọrụ. Ma anyị enwewokwa ohere ịhụta ụmụ anụmanụ dị ebube ndi bi n’ime ụwa ebe ahụ. N’icheta mmetụta nke okwu Okenye Packer n’ime ndụ anyị, anyị anwawo ịmata ma mụta nkuzi ndi sitere na omume nke anụ ọha Afrịka.

A chọrọ m ịkọwa omume na ụzọ ndi agụogbu abụọ mụ na Susan lere ka ha n’eri anụ oriri ha ma kọwa ụfọdụ ihe ndi anyị hụtaworo n’ibi ndụ kwa ụbọchị nke oziọma nke Jizọs Kraịst.

Agụogbu na Topis

Agụogbu bụ anụ ala kacha agba ọsọ n’elu ụwa ma n’eru ịgba ọsọ ruru dịka 75 mph (120 km/h). Ọmarịcha anụmanụ ndi a nwere ike gbaa ọsọ ọsọ site na n’ọnọdụ ịkwụ ọtọ ruo n’ịgba ọsọ ihe dịka 68 mph (109 km/h) n’ihe n’erughị sekọnd atọ. Agụogbu bụ anụ n’eri anụ nke n’ejide anụ oriri ha ma wụọ ihe n’adịghị anya ịchụ ma jide.

Foto, oyiyi
Agụ-ogbu ndi Okenye na Nwanne nwanyị Bednar n’ele

Mụ na Susan gbụrụ ihe luru awa abụọ n’ele agụogbu abụọ n’esogharị otu igwe topis, ele Afrịka kacha diri ma gbasaa ebe niile. Ahịhịa toro ogologo, kpọrọ nkụ nke savanna nke Afrịka naara acha aja aja ma kpuchie kpamkpam anụ ndi ahụ n’eri anụ dịka ha n’achụ otu igwe topis. Agụogbu ndi ahụ ka ekewara site n’ibe ya n’ihe ruru yadị 100 (91 m) ma gaa ije n’azụ ibe ha.

Ebe otu agụogbu nọdụrụ nke ọma n’ime ahịhịa ma o megharịghị ahụ, agụogbu nke ọzọ agbada ala ma jiri nwayọ riruo nso n’ebe topis n’elezighị anya. Mgbe ahụ agụogbu ahụ nke nọdụrụ ọdụ nke ọma efuo n’ime ahịhịa ahụ n’otu oge mgbe agụogbu nke ọzọ nọdụrụ nke ọma. Ọnọdụ nkea n’agbanwe nke otu agụogbu gbadara ala ma na-akpụ akpụ n’ihu ebe agụogbu nke ọzọ nọdụrụ nke ọma n’ime ahịhịa ahụ nọrọ ogologo oge. Izu ohi aghụghọ nke atụmatụ ahụ ka emere iji megharịa ma dufuo topis ahụ ma mgbe ahụ wepụ echiche ha pụọ site n’ihe egwu nke na-abịa n’ihu. Inwe ndidi na nkwụsi ike, agụogbu abụọ ndi ahụ rụrụ ọrụ dịka otu iji nwete nri ha n’oge ọzọ.

Ịnọzi n’etiti igwe otu topis ahụ na agụogbu ndi na-abịa n’ihu bụụrụ ọtụtụ topis toro eto ma sie ike karịa guzoro dịka ndi nche n’elu mkpọda akịka. Ebe ile anya dị elu nke ala ahịhịa ahụ site n’ugwu ntakịrị ahụ mere ka topis ndi n’eche nche lezie anya maka ihe iriba ama nke ihe egwu.

Mgbe ahụ na mberede, dịka agụogbu ndi ahụ bịara nọrọ nso pụtara ihé, igwe topis niile ahụ dum tụgharịrị ma gbafuo. A maghị m ma ma-ọbụ otu topis ndi n’eche nche si gwa nnukwu igwe ahụ okwu, kama n’otu ụzọ adọrọ ha aka na ntị, ma topis niile gbagara n’ebe nchekwa.

Ma gịnị ka agụogbu ndi ahụ mere ọzọ? N’egbughị oge, agụogbu abụọ ndi ahụ bidogharịrị usoro mgbanwe ha nke otu agụogbu gbadara ala ma kpụọ n’ala gaa n’ihu ebe agụogbu nke ọzọ nọdụrụ ọdụ nke ọma n’ime ahịhịa ahụ. Usoro nke ọchịchọ agaa n’ihu. Ha akwụsịghị. Ha ezughị ike ma ọbụ nwee oge ezumike. Ha asọlaghị azụ n’isoro atụmatụ nke mmegharị anya na ndufu. Mụ na Susan lere agụogbu ndi ahụ ka ha furu n’ime ogologo ụzọ, mgbe niile n’aga nso nso n’ebe igwe topis ahụ nọ.

N’abalị ahụ mụ na Susan kparịtara ụka kwesịrị ncheta gbasara ihe anyị hụtara ma mụta. Anyị tulerịtakwara nhumihe nkea anyị na ụmụ na ụmụ ụmụ anyị ma chọta ọtụtụ nkuzi ndi bara uru. Ugbua a ga m akọwa nkuzi atọ ndi ahụ.

Nkuzi #1—Lezie anya maka Mgbanwe Ihe-ọjọọ n’Adagide

Nye mụ onwe m, agụogbu bụ okike dị nwayọ, chapụ achapụ ma maa mma. Anụ ahụ agụogbu n’acha tan edo edo ruo ahịhịa-ọcha nwere ntụpọ ojii nọ dịka ọmarịcha mgbanwe na-eme ka aghara ịhụta anụmanụ ndia dịka ha n’esoro anụ oriri ha n’ime ala ahịhịa nke Afrịka.

Foto, oyiyi
Agụ-ogbu zokpuru onwe ha n’ahịhịa

N’ụzọ yiri nke ahụ, echiche na omume dị ọjọọ nke ime mụọ ugboro ugboro nwere ike dịka ha mara mma, dị mmasị ma ọbụ tọọ ụtọ. Ya mere, n’ime ụwa anyị dịkọrọ ndụ, onye ọbụla n’ime anyị kwesịrị ịmara maka aghụghọ ọjọ nke na eme ka ọ dị mma. Dịka Izaịa dọrọ aka na ntị, “Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị na-akpọ ihe ọjọọ ihe ọma, na ihe ọma ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị n’etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu!”1

N’ime oge mmegharị mgbe mmebi ịdị ụcha nke ndụ ka edoro dịka oke ma ọgba aghara dịka nnwere onwe, ụdị ngọzi ọ bụ na anyị bi n’ụwa n’ime ọgbọ ụbọchi ikpeazụ nkea mgbe oziọma eweghachitere nwere ike gbukee nke ọma n’ime ndụ anyị niile ma nyere anyị aka ịmata aghụghọ ojii na nduhie nke ekwensu.

“N’ihi na ndị ahụ maara ihe ma nabatawokwa ezi-okwu ahụ, ma werewokwa Mụọ Nsọ dịka onye-ndu ha, ma eduhieghi kwa ha—n’ezie a sị m unu, agaghị egbutu ha ma tụba ha n’ime ọkụ mana ha ga-anọ n’ụbọchị ahụ.”2

Nkuzi nke #2—Mụrụ anya ma Dịrị Njikere

Maka otu topi, otu nwa oge nke elezighị anya ma ọbụ egeghị ntị nwere ike kpọta mbuso agha ọsọ ọsọ site n’aka otu agụogbu. Dịkwaka, afọ ojuju ime mụọ na ime ihe n’ụkpọrọ na-eme anyị adị nrute n’aka nke ekwensu. Enweghị uche ime mụọ na-akpọku ihe egwu ukwuu n’ime ndụ anyị.

Foto, oyiyi
Topis mụ anya

iStock.com/Angelika

Nifaị kọwara otu n’ime ụbọchi ikpeazụ Setan ga-achọ ịnwa idajụ obi anyị ma duba ụmụ nke Chineke n’ime echiche asị nke “nchekwa anụ ahụ, na ha ga-ekwu: Ihe nile adịwo mma n’ime Zaịọn; e, Zaịọn na-eme nke ọma, ihe nile adịwo mma—ma otu a ka ekwensu si na-aghọgbu mkpụrụ-obi ha nile, ma jiri nwayọ na-eduga ha ịba n’ala mụọ.”3

Ịmụrụ anya mgbe niile bụ ihe achọrọ iji megide afọ ojuju na ime ihe n’ụkpọrọ. Ị mụ anya bụ ọnọdụ ma ọbụ omume nke ilezianya na mkpachapụ anya maka ihe egwu ma ọbụ ihe isi ike nwere ike ịbịa. Ma ilekọta n’egosi omume nke ịmụ-anya ichegide ma chekwaa. Ikwu okwu n’ime mụọ, anyị kwesịrị ịmụ anya ma dịrị njikere maka mmetụta nke Mụọ Nsọ na ihe iriba ama niile nke na-abịa site n’aka ndi nche nke Onye-nwe-anyị n’elu ụlọ-elu ahụ.4

“E, ma ana m arịọkwa unu … ka unu na-eche-nche baa nʼikpe-ekpere esepụghị-aka, ka a ghara idufu unu site n’ọnwụnwa niile nke ekwensu, … n’ihi na lee, ọ gaghị akwụ unu ụgwọ ọrụ ihe ọma.”5

Ịtụkwasị ndụ anyị n’ime na n’elu Onye-nzọpụta na oziọma Ya na-ekwe ka anyị merie ọchịchọ nke mmadụ ịdị nzuzu na umengwụ n’ime mụọ Dịka ejiri anya ịhụ ụzọ na ntị ịnụta ihe gọzie anyị,6 Mụọ Nsọ nwere ike imelite ike anyị ile anya ma gee ntị mgbe anyị nwere ike echeghị nnọ na anyị kwesịrị ile anya ma ọbụ ige ntị ma ọbụ mgbe anyị echeghị na enwere ihe a ga ahụ ma ọbụ gete.

“Chee nche, ya mere, ka ị wee nọrọ na njikere.”7

Nkuzi #3—Ghọta Ebumnuche nke Onye-iro

Agụogbu bụ anụ n’eri anụ nke n’eri ụmụ anụmanụ ndi ọzọ. Ụbọchị niile, ụbọchị ọbụla, agụogbu bụ anụ n’eri anụ.

Foto, oyiyi
Agụ-ogbu na-achụ anụ

Setan “bụ onye iro nke ezi omume na nke ndi niile na-achọ ime uche nke Chineke.”8 Ụbọchị niile, ụbọchị ọbụla ebumnuche na nzube ya nanị bụ ime ka ụmụ ndi nwoke na ụmụ ndi nwanyị nke Chineke taa ahụhụ dịka ya onwe ya.9

Atụmatụ nke ańụrị nke Nna bụ nke ahaziri iwete ntụzị-aka maka ụmụ Ya, inyere ha aka nwete ọńụ na anọgide, na ịkpọlata ha ụlọ n’udo nye Ya na mmadụ bilitere n’ọnwụ ebuliri elu. Ekwensu n’agba mbo ime ụmụ ndi nwoke na ụmụ ndi nwanyị nke Chineke nwee mgbagwoju anya na obi ọjọọ na imegide uto ebigh ebi ha. Onye iro n’arụ ọrụ adaghị mba imegide ururu ihe nke atụmatụ nke Nna ọ hụghị n’anya karịchaa.

Setan enweghị anụ ahụ, ma uto ebighị ebi ya kwụsịrị akwụsị. Dịka otu mmiri n’achị achị n’ime akpa mmiri ka dam kwụsịrị, otu ahụ ka uto ebigh ebi nke onye iro kwụsịrị n’ihi na o nweghị anụ ahụ. N’ihi mbuso agha ya, Lucifa gọnarịrị onwe ya ngọzi niile nke ndụ anụ ahụ na nhumihe nke nwere ike ịbịa site n’ahụ nke anụ ahụ na ọkpụkpụ. Otu n’ime nkọwa ime mụọ ziri ezi nke okwu ahụ abụrụ ọnụ ka egosiri n’ime enweghị ike ya ị ga n’ihu tolite ma diịrịzie dịka Nna anyị nke Eluigwe.

N’ihi na anụ ahụ bụ isi nke atụmatụ nke ańụrị nke Nna na ntolite nke mụọ anyị, Lucifa na-achọ imegide ntolite anyị site n’ịnwa anyị iji ahụ anyị n’ụzọ n’ezighị ezi. Onye Russell M. Nelson akuziwo na nchekwa nke ime mụọ kacha elu dabere na “‘agaghị ma ọlị ije nke mbụ na-adọ akpịrị gaba n’ebe ị n’ekwesịghị ịga na ime ihe ị n’ekwesịghị ime.’ … Dịka mmadụ anyị nwere ọchịchọ [anụ ahụ] dị mkpa maka ịdị ndụ anyị. ‘Ọchịchọ ndịa dị mkpa n’ezie maka ndụ ịga n’ihụ. Ya mere, gịnị ka onye iro ga-eme? … Ọ na-ebuso anyị agha site n’ọchịchọ anyị. Ọ na anwa anyị iri ihe ndi anyị ekwesịghị iri, ịńụ ihe ndi anyị ekwesịghị ịńụ, ma nwee ịhụnanya n’ụzọ n’ekwesịghị!’”10

Otu n’ime aghụghọ kacha ibe ya bụ na onye iro, onye na-ata ahụhụ n’ihi na o nweghị anụ ahụ, n’akpọku ma na adọ anyị akpịrị ikekọrịta n’ime ntaram ahụhụ ya site n’iji ahụ anyị mee ihe n’ezighị ezi. Ngwa ọrụ ahụ nke ọ n’enweghị ma o nweghị ike inwe bụ ebe obi ya nọ ebe uche ya nọ iduba anyị n’ime mbibi nke anụ ahụ na ime mụọ.

Ịghọta ebumnuche nke onye iro dị ezi mkpa ime njikere dị ire maka mbuso agha nwere ike ịbịa.11 N’ihi na kpọmkwem Onye-isi-agha Moronaị maara ebumnuche nke ndi Laman, ọ dịrị njikere izute ha n’oge nke ọbịbịa ha ma o nwere mmeri.12 Ma ụkpụrụ na nkwa nke ahụ kwa dabara nye onye ọbụla n’ime anyị

“Ma ọbụrụ na unu nọrọ na-njikere unu agaghị atụ-egwu.

“Ma ka unu nwe ike ịgbanarị ike nke onye-iro.”13

Ọkpụkpọ-oku, Nkwa, na Ọgbụgba ama

Nanị dịka enwere ike ịmụta nkuzi dị mkpa site n’ịmata omume nke agụogbu na topis, ya mere onye ọbụla n’ime anyị kwesịrị ịchọta nkuzi na ịdọ aka na ntị niile dị n’ime mmemme dị mfe kwa ụbọchị nke ndụ. Dịka anyị na-achọ mụọ na obi mepere emepe ịnata odudu nke eluigwe site n’ike nke Mụọ Nsọ, mgbe ahụ ụfọdụ iwu ndi kacha ukwuu nke anyị nwere ike ịnata na ọtụtụ ịdọ aka na ntị dị ike karịcha nke nwere ike ichekwa anyị ga-esi n’ime nhumihe nke onwe anyị pụta. Akụkọ dị ike karịcha dị n’ime akwụkwọ nsọ na n’ime ndụ anyị.

E kwupụtawo m nanị atọ n’ime ọtụtụ nkuzi nke e nwere ike ịmata n’ime njem Mụ na Susan mere n’ime Afrịka. A na m akpọku ma na-agba unu ume ịtụgharị uche n’akụkọ nke agụogbu na topis nkea ma chọpụta nkuzi ndị ọzọ agbakwunyere maka gị na ezinụlọ gị. Biko cheta mgbe niile na ebe obibi gị bụ ezi isi nke ọmụmụ na ibi ndụ nke ozi ọma.

Dịka unu n’aza ọkpụkpọ oku nkea n’okwukwe, echiche mụọ kwalitere ga-abịa n’ime obi gị, mmetụta nke ime mụọ ga amụba n’ime obi gị, ma ị ga-amata omume ndi ekwesịrị ime ma ọbụ nke ga aga n’ihu ka unu nwee ike “chilienụ ihe agha [ahụ] niile [nke Chineke], ka unu wee nwe ike ị nagide ajọọ ụbọchị ahụ, mgbe unu mesiworo ha nile, ka unu nwe ike iguzo.”14

A na m ekwe nkwa na ngọzi niile nke nkwado ziri ezi na nchekwa nke ime mụọ ga banye n’ime ndụ unu dịka unu na amụ anya ma gaa n’ihu nọgịde n’ekpere

A na m agba ama na ịga n’ihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ n’ewete nchekwa ime mụọ ma na-akpọbata ọńụ na anọgide n’ime ndụ anyị. Ma a na m agba aka ebe na Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ ma dịrị ndụ ga akwado ma gbaa anyị ume mgbe ọma na mgbe ọjọọ. Maka eziokwu ndia A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst, amen.