2010–2019
Achọpụtara site na Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Achọpụtara site na Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn

Onye nile kwesịrị ị nwete nhụmihe ma bụrụ ndị achọtara site n’ike nke eziokwu nile jupụtara nime Akwụkwọ nke Mọmọn.

Dịka m n’aga n’ebe-obibi ndị nile agbanwere, otu n’ime ajụjụ nile Mụ n’achọ ịjụ ndị-agbanwere mgbe ọbụla bụ otu ha na ndị ezi-na-ụlọ ha nile jiri bụrụ ndị emere baptizim. Ọ dịghị mkpa m’onye ahụ n’oge ahụ ọ bụ onye otù kwụsiri ike m’ọbụkwanụ na ọ bịabeghị nzukọ-nsọ kamgbe ọtụtụ afọ. Aziza n’abụkarị otu ihe ahụ: ha n’eji ihu ọchị na nke n’egbuke-egbuke, ji bido kọwa akụkọ otu ejiri chọta ha. N’ezi ya, ọ na-adị ka akụkọ nke mgbanwe n’abụkarị akụkọ nke otu esi chọta anyị.

Jizọs Kraịst n’Onweya bụ Onye-nwe-anyị nke ihe ndị nile furu-efu. Ọ na-echekasị maka ihe nile furu-efu. Nke a bụrịrị ihe O ji kuzie ilu atọ nke anyị n’ahụ nime isi 15 nke Luk:: ilu ahụ nke atụrụ furu-efu, ego ahụ furu-efu, na, ikpeazụ, nwa-nwoke lara-niyi. Akụkọ nile ndịa nwere otu ịhe jikọrọ ha: ịhe kpatara ha jiri fuo abaghị uru. Ọ dịghịdị mkpa m’ọbụrụ na ha mara na ha bụ ndị furu-efu. Enwere ọñụ nke dị ukwuu nke n’eti n’olu ike, “Soro m ñụrịa; nihi a chọtawom [nke ahu] furu efu.”1 N’ikpeazụ, onweghị n’ezi-okwu ihe furu-efu nye Ya.2

Nye m ohere nehihie nke-a, ịkọrọ unu otu n’ime ihe ndị kachasị ọnụ nye m—akụkọ nke otu esi chọta Mụ onwe m.

Tupu m gba afọ 15, nwanne-nwoke nna m Manuel Bustos kpọrọ m, ịnọnyere ya na ezi-na-ụlọ ya na United States ebe-a. Nke a g’abụ ohere dị ukwuu maka mụ ịmụta ụfọdụ asụsụ Beke. Nwanne-nna m gbanwerela nye Nzukọ-nsọ ọtụtụ afọ gara-aga, ma o nwere mụọ nke ịgbasa ozi-ọma dị ukwuu. Nke a bụ ihe mere nne m, n’ekweghị ka m mata, kwuru ya okwu ma sị na ya ga-ekwe ka m gaa m’ọbụrụ n’emezuo otu ihe: na ọ gaghị anwa ime ka m kwenye ịbụrụ onye-otù nke Nzukọ-nsọ ya. Anyị bụ ndị Catholic, anyị kperela ya ọtụtụ ọgbọ, ma enweghị ihe mere m g’eji achọ igbanwe. Nwanne-nwoke nna m kwere nke-ọma ma dobe okwu ya n’ụdị na ọ chọghị ịza ajụjụ ọbụla gbasara Nzukọ-nsọ ahụ.

Nezi ya, ihe nwanne-nwoke nna m na ezi nwunye ya, Marjorie, enweghị ike izere bụ ịbụ ndị ha bụ.3

Ha nyere m otu ọnụ-ụlọ nke chekwara nnukwu ọba-akwụkwọ nke akwụkwọ nile. Ahụrụ m na n’ime ọba-akwụkwọ a enwere ihe dịka Akwụkwọ nke Mọmọn n’asụsụ nile dị iche-iche ruru 200, ebe edere 20 n’ime ha n’asụsụ Spain.

Otu ụbọchị, site na agụ-mmata, ewedatara m otu Akwụkwọ nke Mọmọn edere n’asụsụ Spain.

Foto, oyiyi
Akwụkwọ nke Mọmọn n’asụsụ Spain.

Ọ bụ otu n’ime ndị ahụ nwere akwụkwọ mkpuchi blue, nwere ụdị-mmadụ nke mụọ-ozi Moronaị n’ihu ya. Ka m meghere ya, ebe-ahụ na ihu-akwụkwọ nke-mbụ ka edere nkwa nke a: “Ma mgbe unu ga-anata ihe ndị a, aga m agba unu ume ka unu wee jụọ Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ihe ndị a ha abụghị ezi-okwu; ma ọbụrụ na unu ga-eji ezigbo obi, jiri ezigbo ebum-nʼobi, na-enwe okwukwe nʼime Kraịst, ọ ga-egosipụta ezi-okwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mụọ Nsọ.”

Ma mgbe-ahụ ọgbakwụnyere: “ Ma site nʼike nke Mụọ Nsọ unu ga-enwe ike mata ezi-okwu nke ihe nile.”4

O siri-ike ịkọwa ka akwụkwọ-nsọ nile ndị a jiri mmetụta echiche na obi m. Na-ezi-okwu, A naghị m achọ “ezi-okwu ahụ.” A bụrụ m nanị okorobia, nwere ańụrị n’ime ndụ ya, n’enwe ọńụ na omena-ala ọhụrụ nke a.

Agbanyeghị, ka m buru nkwa ahụ n’obi, E bidoro m ịgụ akwụkwọ ahụ na nzuzo. Dịka m n’agụ ya, a ghọtaram na ọ bụrụ na m chọrọ ị nwete ịhe site nime ihe-a, ekwesịrị m ibido kpewe ekpere. Manyị ma ịhe n’eme mgbe ị kpebiri n’ọbụghị nanị ịgụ ya ka ị g’eme kama ị ga ekpekwa ekpere gbasara Akwụkwọ nke Mọmọn. Ya mere, nke ahụ bụ ihe mere m. Ọ bụrụla ihe dị ebube ma gbapụrụ-iche----eh, otu ihe ahụ merela ọtụtụ puku nke ndị-ọzọ n’ime ụwa. A chọpụtara m site na ikike nke Mụọ-Nsọ na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ezi-okwu.

Mgbe ahụ a gakwuru m nwanne-nwoke nna m ịkọwara ya ihe merela ma na m ejikerela ime baptism. Nwanne-nwoke nna m enweghị-ike jikọta ịtụn’anya ya. Ọ banyere n’ime ụgbọ-ala ya, nyara ga ọdụ-ụgbọ-elu, ma jiri akwụkwọ ụgbọ-elu ga-ebula m, tinyere akwụkwọ o dere nne m sịrị,“ E nweghị m aka na nke a!”

N’otu ụzọ o kwuru ezi-okwu. A chọtara m site na ikike nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

Enwere ike enwere ọtụtụ ndị achọtara site n’aka ndị mgbasa-oziọma gburugburu ụwa, ụzọ obụla dị ebube na nke ya. Mọbụkwanụ achọtara ha site n’aka ndị enyi Chineke kpachara-anya dobe n’ụzọ ha. Enwere ike ọbụrụ na a chọtara ha site n’aka otu-onye nke ọgbọ a ma-ọbụ site n’aka otu-onye nke ndị-ichie ha nile.5 Ka osina dị, ọ bụrụ na achọrọ ị ga n’ihu ezi mgbanwe nke onye, mgbe adịghị anya, ha nile ga-enwerịrị mmetụta ma bụrụ ndị achọtara site na ikike nke ezi-okwu nile dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Na otu oge ahụ, ha ga-ekpebirịrị n’onwe ha ịkwụsike nye Chineke na ha ga-edobe iwu-nsọ Ya nile.

Ka m lọtara na Buenos Aires, nne m chọpụtara na ezi-okwu na a chọro M ime baptism. Nihi abụm ekwe-ekwe, ọ chọghị i nye m aka mgba, o jiri wayọ kpọta m nakụkụ ya. N’amaghị ama, ọ gbara m ajụjụ nile a n’ajụ onye a chọrọ ị mee baptizim. N’ezi ya, e kwenyere m na ajụjụ ya mmiri-emi karịa ndị nke ndị mgbasa-ozi-ọma anyị n’eme. Ọ gwara m: “Ọbụrụ na ịchọrọ ime baptism, A ga m akwado gị. Kama nke-mbụ a ga m ajụ gị ụfọdụ ajụjụ ma a chọrọ m ka iche-echiche nke-oma ma zaa m n’ezi-okwu. Ikpebiri na ị ga n’aga nzukọ-nsọ Sọnde ọbụla?”

A gwara m ya, “Eh, n’ezi ya, A ga m eme nke ahụ.”

“Ị mara ka nzukọ-nsọ siri tee aka?”

“Eh a ma M,” ka M kwuru.

Ọ zara, “ Ọ dị nma, ọbụrụ na ime baptism, a ga m ahụ na ị gara.” Mgbe ahụ ọ jụrụ m ma ndị njikere ịkwụsị ịńụ manya na anwụrụ.

A gwara m ya, “Eh, n’ezi ya, A ga m emekwa nke ahụ.”

Nke o jiri gbakwụnye, “ Ọbụrụ na ime baptism, a ga m ahụ na nke ahụ dị otu ahụ.” Ma o siri otu ahụ n’aga n’ihu na iwu-nsọ ọbụla.

Nwanne-nwoke nna m akpọwo nne m ịgwa ya ka onwela nsogbu, na m ga-echefu ihe ndị a. Mgbe afọ anọ gara, mgbe M natara ọkpụkpọ-oku m ije-ozi n’ime Mishịọn Uruguay Montevideo, nne m kpọrọ nwanne-nwoke nna m ịjụ ya mgbe m ga-echefu ihe ndị a. Nke bụ ezi-okwu bụ na site na oge m mere baptism, ọ bụrụla nne nwere ańụrị karịa.

A biara m mata na Akwụkwọ nke Mọmọn bara uru nime usoro mgbanwe site na ịmata na onwe m nkwa na “ na mmadụ ga-abịa Chineke nso site na ịnọgide n’usoro iwu ya nile.”6

Nifaị kọwara nzube nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’ụzọ a:

“N’ihi na anyị na-arụsi ọrụ ike idepụta, ikuziri ụmụ anyị, na kwa ụmụnne anyị, ka ha kwere na Kraịst, na ime udo n’ebe Chineke nọ. …

“Ma [Dịka] anyị na-ekwu maka Kraịst, anyị na-an̄ụrị-ọn̄ụ n’ime Kraịst, anyị na-ekwusa maka Kraịst,[ma] anyị na-ebu amụma maka Kraịst, … ka ụmụ anyị wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka nsachapụ nke mmehie ha nile.”7

Akwụkwọ nke Mọmọn nile nwejuru otu nzube ahụ dị-nsọ.

Ya mere, onye ọgụụ ọbụla kpebiri ezi obi ị mụ ya, jiri mụọ ekpere, agaghị amụta nanị maka Kraịst ma g’amụtakwa sita n’aka Kraịst—tụmadị m’ọbụrụ na ha nwe mkpebi obi ị “nwale ezigbo omume nke okwu ahụ”8 ma ghara ị jụụ ya ọsịsọ-ọsịsọ n’ihi nkwenye ndị nwere ntukpọ9 si n’aka ndị ọzọ n’ihi ịhe ha kwuru maka ịhe ndị ha n’agụbeghi mọlị.

Onye-isi Russeii M.Nelson kwuru:“ Mgbe ọbụla m chere-echiche maka Akwụkwọ nke Mọmọn, a na M eche maka mkpụrụ-okwu ahụ ike. Ezi-okwu nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn nwere ikike ịgwọ-ọrịa, nkasi-obi, weghachi, enyem-aka, gbaa-ume, inye-ańụrị, na ịbuli mkpụrụ-obi anyị nile elu.”10

Oku m n’akpọ n’ehihie a nye onye-ọbụla n’ime anyị, agbanyeghị mgbe anyị jiri bụrụ onye-otù nke Nzukọ-nsọ, bụ ka anyị nye ikike nke ezi-okwu nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn ohere ịchọta anyị ma makụọ anyị ọzọ kwa, ma kwa ụbọchị dịka anyị n’achọ mkpughe nke onwe. Ọ ga-eme otu ahụ ọbụrụ na anyị nye ya ohere.

E ji m nwayọ agba-ama na Akwụkwọ nke Mọmọn nwere uju nke ozi-ọma nke Jizọs Kraịst ma na Mụọ-Nsọ ga-egosi ezi-okwu nke ahụ ugboro ugboro nye onye-ọbụla nke, jiri ezigbo obi, chọọ ọmụma-ihe n’ime nzọpụta nke mkpụrụ-obi ha.11 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama nile

  1. Luke 15:6; see also Luke 15:9, 32.

  2. In its broadest sense, the scriptures account for prophecies that speak of the gathering of the lost tribes of Israel (see Russell M. Nelson, “The Gathering of Scattered Israel,” Liahona, Nov. 2006, 79–82). Even though they are lost, they are not lost to Him (see 3 Nephi 17:4). Also, it is interesting to note they don’t realize that they were lost until the time they are found, especially when they receive their patriarchal blessing.

  3. Elder Dieter F. Uchtdorf quoted Saint Francis of Assisi when he said, “Preach the gospel at all times and if necessary, use words” (“Waiting on the Road to Damascus,” Liahona, May 2011, 77; see also William Fay and Linda Evans Shepherd, Share Jesus without Fear [1999], 22).

  4. Moroni 10:4–5.

  5. The conversion story of our ancestor is also our own story. Elder William R. Walker taught, “It would be a wonderful thing if every Latter-day Saint knew the conversion stories of their forefathers” (“Live True to the Faith,” Liahona, May 2014, 97). Hence, all of us in some way have been found directly or through our ancestors, thanks to our Heavenly Father, who knows the end from the beginning (see Abraham 2:8).

  6. Introduction to the Book of Mormon; see also Alma 31:5.

  7. 2 Nefaị 25:23, 26.

  8. Alma 31:5.

  9. Lee Alma 32:28.

  10. Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị g’abụ m’ewepụ ya?Liahona, Nov. 2017, 62.

  11. Lee 3 Nịfaị 5:20.