2010–2019
Ịchọta Ọńụ Na-Ikwusa Oziọma
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Ịchọta Ọńụ Na-Ikwusa Oziọma

Anyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya, onye nke na-eche ka anyị bịakwute Ya wee nweta ngọzi na ndụ anyị nakwa na ndụ ndị nọ anyị nso.

Otu n’ime abụ nke ndị Praịmarị na-amasị m jiri okwu ndị a bido:

A bụ m onye otu Nzụkọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.

A ma m onye m bụ.

A maara m atụmatụ nke Chineke.

A ga m eso ya n’okwukwe.

Ekwere m na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta .1

Kedụ ụdịrị ọmarịcha okwu dị mfe banyere eziokwu ndị e kwuru anyị nabatara!

Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị maara ndị anyị bụ. Anyị maara na “Chineke bụ Nna nke mmụọ anyị. Anyị bụ… ụmụ Ya, Ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị [na Ya biiri n’eluigwe ] tupu anyị [abịa] n’ụwa.”

Anyị maara atụmatụ nke Chineke. Anyị na Ya nọọrọ mgbe O wepụtara ya. “Ebumnobi niile nke Nna anyị nke Eluigwe—ọrụ Ya na otuto Ya—bụ i nyere onye ọbụla n’ime anyị aka inwe ọńụ na ngọzi Ya niile. O … nyewo atụmatụ zuruoke maka imejupụta ebumnuuche Ya. Anyị ghọtara ma nabatakwa atụmatụ nke a … nke ọńụ, … nke mgbapụta, na nke … nzọpụta” tupu anyị abịa n’ụwa.

“Jizọs Kraịst bụ isi ntọala atụmatụ nke Chineke. Site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst mejupụtara ebumnobi nke Nna Ya wee mee ka ọ dịrị onye ọbụla n’ime anyị mfe inweta ndụ a nwụghị anwụ na mbuli elu. Setan, ma ọbụ ekwensu, bụ onye iro na-ebe atụmatụ nke Chineke nọ” otu ahụ ka ọ dị site na mmalite.

“Ohere nhọrọ, ma ọ bụ ike ime nhọrọ, bụ otu n’ime onyinye ndị kachasị ukwuu Chineke nyere ụmụ Ya. … Anyị ga-ahọrịrị ma anyị ga-esoro Jizọs Kraịst ma ọbụ soro Setan.”2

Ndị a bụ eziokwu doro anya anyị nwere ike ị kọwara ndị ọzọ.

Ka m kọọrọ unu maka otu mgbe nne m kọọrọ m akụkọ banyere ụdịrị eziokwu ahụ doro anya naanị site na-inye ohere ịkpa nkata ma nabata ohere mgbe ọ dapụtara.

Ọtụtụ afọ gara aga, nne m si Argentina na-alọta ebe ọ gara ileta nwanne m nwoke. Ọ naghị amasị nne m ị gba ụgbọ elu, ya mere ọ gwara otu n’ime ụmụ m ndị nwoke ka onye ya ngọzi nke nkasi obi na nchekwa. O metụrụ ya n’obi i nyekwa nne nne ya ngọzi inweta nduzi na ntụzi aka pụrụ iche site n’aka Mmụọ Nsọ i nye mgbam ume ma metụ mkpụrụ obi ọtụtụ ndị ọ na-amasị ịmụ ihe banyere oziọma aka.

Foto, oyiyi
Ezinaụlọ Pol

Na-ọdọ ụgbọ elu nke Salt Lake, nne m na nwanne m nwoke zutere nwata nwanyị- gbara- afọ asaa nke ya na ezinaụlọ ya si njem ime skiing na-alọta. Nne na nna ya hụtara na owego ọtụtụ oge nwa ha nwanyị na nne m na nwanne m nwoke nọ na-akpa nkata, ha ekpebie ị ga nọnyere ha. Ha kọwara onwe ha na nwa ha nwanyị dị ka Eduardo, Maria Susana nakwa Giada Pol. Enwere nnọọ ezi njikọ na-enweghị ọgbachi ha nwere na-ebe ọmarịcha ezinaụlọ a nọ.

Ezinaụlọ abụọ ndị a nwere obi ụtọ imekọrịta njem n’otu ụgbọ elu ahụ na-aga Buenos Aires, Argentina. Ka nkata ha garaniihu, nne m hụtara na ha anụtụbeghị ihe banyere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere, tutu ruo oge ahụ.

Otu n’ime ajụjụ mbụ Susana jụrụ bụ, “I nwere ike ịgwa m ihe banyere ọmarịcha mbarị ahụ nke mmadụ e jiri ọla edo kpụọ nọ n’elu?”

Nne m kọwara na ọmarịcha ụlọ ọkachsị mma ahụ a bụghị mbarị kama ọ bụ tempụl nke Onyenwe anyị ebe anyị na Chineke na-eme ọgbụgba ndụ nke anyị ga-eji nwee ike ịlọghachi ibinyere Ya otu ụbọchị. Susana gwara nne m na tupu ha amalite njem ahụ ị gawa na Salt Lake, na ya kpere ekpere maka ihe ga-enye mmụọ ya mgbam ume.

N’oge njem ụgbọ elu ahụ, nne m gbara ama ya doro anya ma sie ike banyere oziọma ma kpọkuo Susana ka ọ chọta ndị mgbasa oziọma dị na-ebe ha. Susana jụrụ nne m sị, “Kedụ ka m ga-esi chọta ha?”

Nne m zara sị, “Ị pụghị ịmala ha; ha nwere ike bụrụ ụmụ okoroọbịa abụọ yi uwe ọcha n’elu na taị ma ọ bụkwanụ ụmụ agbọghọbịa abụọ jikeziri nke ọma, mgbe niile ha na-eyi akara mgba ama na-egosị aha ha nakwa ‘Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.’”

Ndị ezinaụlọ ahụ nyekọrịtara onwe ha akara ekwe ntị ma sị ibe ha gaa nke ọma n’ọdọ ụgbọ elu nke Buenos Aires. Susana, onye nke mụ na ya ghọgoro ezigbo enyi ke mgbe ahụ, a gwago m ọtụtụ oge na o wutere ya nke ukwuu ịhapụ nne m n’ọdọ ụgbọ elu ahụ. Ọ sịrị na “Nne gị na-acha ọkụ. Apụghị m ịkọwa ya mana o nwere ihe na-amụke amụke n’ime ya nke m na-achọghị ịhapụ.”

Ngwa ngwa Susana larutere na-ebe o bi, ya na nwa ya nwanyị Giada gawara ị hụ nne Susana bi nso nso na-ebe ha bi ịkọwara ya nhụmiihe nke a. Ka ha nọ na-anyaje ụgbọala, Susana hụtara ụmụ okoroọbịa abụọ na-aga n’okporo ama jie ojiji dị ka nne m siri kọwaa. Ọ kwụsịrị ụgbọala ya na-etiti okporo ama ahụ, pụta, wee jụọ ụmụ okoroọbịa abụọ ndị a,“Adịghị ama ama unu si na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst?”

Ha zara, “Ee.”

Ọ jụrụ “Ndị mgbasa oziọma?”

Ha abụọ sara, “Ee, ọ bụ anyị!”

O wee sị ha, “Banyenụ n’ụgbọala m;unu na-aga na-ebe obibi m ikuziri m ihe.”

Foto, oyiyi
Ezinaụlọ Pol

Ka ọnwa abụọ gasịrị e mere Marịa Susana baptizm. Giada, nwa ya nwanyị mekwara baptizim mgbe ọ gbara afọ itolu. Anyị nọkwa n’ọrụ ebe Eduardo nọ, onye nke anyị hụrụ n’anya na-agbanyeghị ihe ọbụla.

Ke mgbe ahụ Susana aghọwo otu n’ime ndị mgbasa oziọma kachasị ukwuu m zuteworo na ndụ m. Ọ dị nnọọ ka ụmụ ndi ikom nke Mosaịa, na-akpọta ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst.

Na-otu n’ime nkata ndị anyị kpara, a jụrụ m ya, “Gịnị bụ akwamiike gị? Kedụ ka i si ekwusara ndị ọzọ oziọma?”

Ọ sịrị m, “Ọ dị nnọọ mfe nke ukwuu. Ụbọchị niile tupu m hapụ ụlọ m, a na m ekpe ekpere, na-arịọ Nna nke Eluigwe ka O duba m n’aka ndị nwere mkpa ịnata oziọma na ndụ ha. Mgbe ụfọdụ a na m ewere otu Akwụkwọ nke Mọmọn iji gwa ha okwu ma ọbụ nye ha kaadị nke ndị mgbasa oziọma—ma mgbe m bidoro ị gwa ndị mmadụ okwu, ihe m na-ajụ ha nnọọ bụ ma ha anụgo ihe gbasara Nzukọ nsọ ahụ.”

Susana sịkwara na, “Oge ndị ọzọ ọ na-amụ sọ amụ mgbe ọ na-eche ụgbọ oloko. Otu ụbọchị otu nwoke lere m anya wee sị, ‘Gịnị mere i ji na- amụ amụ?’ O jidere m nnọọ na mberede.

A sara m na, ‘A na m amụ amụ maka na obi dị m ụtọ!’

O wee sị, ‘Gịnị mere i ji enwe oke obi ụtọ?’

“A zara m ‘A bụ m onye otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, nke ahụ na-enye m obi ụtọ. Ị nụtụwo ihe banyere ya?’”

Mgbe ọ sịrị mba, o nyere ya kaadị were nyeduru m ma gwa ya ka ọ bịa nzukọ na Sọnde na-abịa abịa. Na Sọnde na-esota, o kelere nwoke ahụ n’ọnụ ụzọ ahụ.

Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru na:

E nwere ụzọ ihe atọ ndị otu niile nwere ike ime iji nye aka ịgbasa ozi ọma. …

Nke mbụ, anyị niile nwere ike ikpe ekpere maka inwe mmasị i ji nye aka na mpaghara ọrụ nke mgbapụta nke a dị mkpa. …

Nke abụọ, anyị nwere ike dobe iwu nsọ . … Ndị otu kwesịrị ntụkwasị obi ga na-enwe Mmụọ nke Onye Nzọpụta … ị nọnyere ha mgbe niile i duzi ha ka ha na-achọ i soro nye aka na nnukwu ọrụ nke ikwusa oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

Nke atọ, anyị nwere ike kpee ekpere maka mkpalite nke mmụọ n’ihe anyị nwere ike ime … iji kwusaara ndị ọzọ ozi ọma … [ma] kpee ekpere kpebie ime ihe site na mkpalite nke mmụọ [anyị] natara.”3

Ụmụnne m ndị nwoke, ndị nwanyị, ụmụntakịrị, nakwa ndị ntoroọbịa, anyị nwere ike ị dị ka enyi m Susana wee kwusaara ndị ọzọ oziọma? Anyị nwere ike kpọkuo otu enyi anyị na-abụghị onye otu okpukperechi anyị ị bịa soro anyị bịa ụka na Sọnde? Ikekwe anyị nwere ike kọwaara otu onye apụpa anyị ma ọbụ otu enyi anyị ihe dị na-otu kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn? Anyị nwere ike nyere ndị ọzọ aka chọpụta ndị nnanna ha na Nchọpụta Ezinaụlọ ma ọbụkwanụ kọwaara ndị ọzọ ihe ndị anyị mụtagoro n’ime izu ụka dị ka anyị nọ na-amụ Bịanụ, Soro M? Anyị nwere ike ị na-emekarị ihe dị ka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ma gwa ndị ọzọ ihe na-enye anyị ọńụ na ndụ anyị? Azịza banyere ajụjụ ndị a niile bụ ee! Anyị pụrụ ime ya.

Na-akwụkwọ nsọ anyị na-agụta na “ana ezipụ ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ‘ịrụ ọrụ n’ubi vine ya maka mgbapụta nke mkpụrụ obi ụmụ mmadụ’ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:56). Ọrụ nke mgbapụta nke a gụnyere ndị otu ịrụ ọrụ mgbasa oziọma, ime ka ndị atọghatara nọsie ike, ime ka ndị otu dara mba lọghachi, ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezinaụlọ, nakwa ikuzi ihe banyere oziọma.”4

Ezi ndị enyi m, Onyenwe anyị chọrọ anyị maka ịkpokọta Izrel. Na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Ọ sịwo na “Ọbụghị ma-ọbụ unu iche echiche tutu oge ahụ ihe unu ga-ekwu; mana kpakodo n’echiche unu mgbe nile okwu nile nke ndụ, ma a ga-enye unu ya n’awa ahụ akụkụ ahụ nke a ga-enyefe mmadụ nile.”5

Na mgbakwunye, O kwewo anyị nkwa sị:

“Ọ bụrụ na ị ga-arụsị ọrụ ike n’ụbọchị ndụ gị nile n’iti nchegharị nye ndị a, ma kpọta, ọbụna otu mkpụrụ-obi nye m, olee otu ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị ga-adị na ya n’ala-eze nke Nna m!

“Ma ugba a, ọ bụrụ na ọn̄ụ gị ga-adị ukwuu n’otu mkpụrụ-obi nke ị kpọbatara nye m n’alaeze nke Nna m, olee ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị ma ọbụrụ na ị kpọbata ọtụtụ mkpụrụ-obi nye m!”6

Abụ ndị Praịmarị m jiri bido jiri okwu nke a dị egwu bịa na mmechi:

Ekwere m na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta.

A ga m enye aha ya nsọpụrụ.

A ga m eme ihe ziri ezi;

A ga m agbasoro ihe ya.

Eziokwu Ya ka m ga-ekwusa.7

A na m agba aka ebe na okwu ndị a bụ eziokwu na anyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya, onye nke na-eche ka anyị tụgharịa n’ebe Ọ nọ wee nweta ngọzi na ndụ anyị nakwa na ndụ ndị nọ anyị nso. Ka anyị nwee mmasị ịkpọta ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nye Kraịst bụ ekpere m na-aha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst,” Akwụkwọ abụ nke Ụmụntakịrị, 77.

  2. Kwusaanụ Oziọma M: Ntụzi aka nyere Ozi Mgbasa Ozi ọma, rev. ed. (2018), 48.

  3. Dallin H. Oaks, “Ikwusa Ozi ọma ahụ nke Eweghachiworo,” Liahona, Nov. 2016, 58.

  4. Akwụkwọ ntụzi aka 2: Ilekọta Nzukọ nsọ ahụ, 5.0, NzukọnsọnkeJizọsKraịst.org; leekwa L. Whitney Clayton, “Ọrụ nke Mgbapụta: Mgbe ahụ na Ugbu a,” Laịhona, Sept. 2014, 23.

  5. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:85.

  6. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15–16.

  7. “Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst,” 77.