2010–2019
Ndị nwanyị Gbara-ndụ, ndị N’arụkọ ọrụ ha na Chineke
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Ndị nwanyị Gbara-ndụ, ndị N’arụkọ ọrụ ha na Chineke

Ị bụ nwanyị gbara-ndu, onye ya na Chineke na-arụkọta ọrụ bụ otu ụmụ ndị nwanyị nwere ezi agwa ma dịkwa ukwu n’esi abụ nne, n’edu ma n’eje ozi nlekọta.

Enwere m obi ekele maka ngọzị mwetere ikwuru unu okwu, unu bụ ụmụ ndị nwanyị nke Chineke ndị gbara-ndụ. Na abalị a, ebumnuche m bụ ị gba unu ume n’ime ije ozi nke akpọrọ unu n’ọrụ. Eeh, nwa-nwanyị nke Chineke ọbụla n’ege olu m ntị enwetawo ọkpụkpọ okù site n’aka Onye nwe-anyị Jizọs Kraịst.

Ọkpụkpọ-okù bidoro mgbe edobere gị na ndụ anụ-arụ, n’ebe ma n’oge ahọpụtara maka gị site n’aka Chineke, onye mara gị n’ụzọ zuru-oke ma hụ gị n’anya dịka nwa Ya nke nwanyị. N’ụwa nke mụọ, Ọ mara gị ma kuziere gị ịhe ma dobe gị ebe ị ga-enwete ohere, nke pụrụ iche n’oge ụwa nke-a, k’ewe kpọọ gị okù i bata n’ime ebe mmiri baptizim. N’ebe ahụ, ị g’anụ nkwuputa okwu ndịa sitere n’ọnụ nke otu onye oru nke Jizọs Kraịst kpọrọ: “Ebe e nyere m ikike site na Jizọs Kraịst, e mee m gị baptism n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mụọ Nsọ. Amen.”1

Mgbe i sitere na mmiri pụta, ị nabatara okù ọzọ maka ije ozi. Dịka nwa-nwanyị nke Chineke gbarandụ ọhụrụ, ị kwere otu nkwa ma nabata otu ọrụ nime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, n’ihi nke-a ewee mee gị onye otù. Gị na Chineke gbarandụ na ị ga enyekwasị onwe gị aha nke Jizọs Kraịst, i dobe iwu Ya nile, ma ijere Ya ozi.

Maka onye ọbụla na-agba ụdị ndụ nke-a, ije ozi nke Onye Nwe kpọrọ ya ga-abụrụ nke ekepụtara n’ihi onye ahụ. Ndị ụmụ Chineke gbarandụ, ma ndị nke nwanyị na ndị nke nwoke, nwere otu ụdị ọkpụkpọ-okù dị mkpa ma nwekwa ọňụ. Ọ bụ ijere ndị ọzọ ozi maka Ya.

Mgbe ọ n’ekwuru ndị nwanne nwanyị okwu, Onye isi Nduzi Russell M. Nelson kwuru otu okwu nchịkọta dị nma nke kọwara ọkpụkpọ okù Onye nwe-anyị kpọrọ gị i sonye Ya na ọrụ Ya. Onyeisi Nelson kọwara ọkpụkpọ-okù gị n’ụzọ a: “Onye Nwe-anyị ekwuwo, ’Ọrụ m na ebube nke m bụ iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ.’ (Mozịs1:39.) N’ihi nke-a, nwa Ya nke nwanyị ọ hụrụ n’anya, onye oso ụzọ ya, nwere ike ikwu n’ezie na, ’Ọrụ m na ebube nke m bụ ị nyere ndị m hụrụ n’anya aka imezu ebumnobi nke igwe ahụ.’

“ Ị nyere mmadụ ọzọ aka rute ndụ selestial nke akwodoro ya ị bụ, bụ otu akụkụ dị mkpa n’ime ije ozi dị nsọ nke nwanyị. Dịka onye nne, onye nkuzi, m’ọbụ Onye Nsọ ọzụzụ, ọ na-akpụ ụrọ ka ọ nwee oyiyi dịka olileanya ya sịrị dị. Dịka ya na Chineke n’arụkọrịta ọrụ, ije ozi ya nke dị nsọ bụ ị nyere mụọ aka ka ha dị ndụ, ma bulie mkpụrụ-obi elu. Nke-a bụ immezucha ebunmnobi okike ya. Ọ n’enye ugwù, n’akuzi ịhe, ma n’ebuli elu.”2

Ị nweghi ike ị mata mgbe, m’ọbụ ogologo oge ya, mgbe ije ozi nke onwe gị ga-etinyechasi uche n’elu ọkpụkpọ okù dịka nne, onye ndu, m’ọbụ onye ije ozi nleta nke nwanne-nwanyị. Ọnye Nwe-anyị, n’ihi ịhụnanya, a naghị ahapụrụ anyị ohere ị họrọ oge ya, ogologo oge ya, m’ọbụ k’anyị hazie ọrụ anyị n’usoro masịrị anyị Kama, ị mara na site na akwụkwọ nsọ ma site n’aka ndị amụma dị ndụ na ọrụ nile ndịa g’abịara nwa nke nwanyị Chineke ọbụla, ma n’ụwa nke-a, mọbụna nke ọzọ. Ma ha nile bụ nkwado emere maka ndụ ebighi-ebi nime ezinụlọ ịhụnanya dị—“onyinye Chineke nke kachasị ibe ya.”3

Ọ g’adịrị gị nma ị gba mbọ nile ị nwere ị gba iji kwado ugbua, ma buru otu njedebe g’adị n’obi gị. Emewo ka ọrụ nke-a dị mfe n’ihi ọrụ ndịa n’otu n’otu chọro otu udị nkwado ahụ.

K’anyị bido n’oru nke ị bụ onye ije ozi nleta nke nwanne nwanyị. Ọbụrụgodi ma ị nwetere ọrụ ahụ dịka nwa-nwanyị dị afọ 10, onye nọ n’ime ezinulo nke nna ha nwụrụ, m’ọbụ dịka onye isi nduzi nke Otù Enyemaka, onye ọkụ renre obodo ya na nso nso a, m’ọbụ ị nọ n’ụlọ ọgwụ na-agbake site na ọrịa-surgery—ị nwere ohere imejupụta ọkpụkpọ okù sitere n’aka Onye Nwe-anyị ka ị bụrụ nwa-nwanyị Ya, onye ije ozi nleta.

Ọ dị nnọ ka ọrụ ije ozi nleta ndịa, ha dị iche iche. Otuosiladi, ha nile ka aga emejupụta site na nkwado obi dị ike, obi nwere ịhụnanya, okwukwe ụjọ n’adịghi n’ihi Onye-nwe anaghị enye iwu-nsọ, ma ọbụghị na ọ ga-edozi ụzọ, ya na ọchịchọ ị jee mere Ya ha.4

N’ihi na okwadoro-akwado, nwa-nwanyị afọ 10 ahụ konyere aka ya nile gburugburu nne ya ahụ bụ nwanyị isi-mkpe, ma kpee ekpere ị mata otu osi enyere ezinụlọ ya aka. Ma ọ na-aga n’ihu n’eme nke-a.

Onye isi nduzi Otù Enyemaka kwadoro onwe na mbụ ije ozi nleta tupu mberede inre ọkụ ahụ eme n’obodo ya. Ọ diwo na mbụ mara ma hụ ndị mmadụ n’anya. Okwukwe ọ nwere na Jizọs Kraịst etowo ka mgbe afọ ndịa ahụ, site na mgbe ọ natara aziza nile nke ekpere ọ kpeere Onye Nwe-anyị maka ị nyere ya aka nime obere ije ozi ọ jere Ya. N’ihi nkwado nkea ọ mere na gboo, ọ dị na njikere ma nwe ịnụ-ọkụ nke obi, ịhazi ụmụnne ya ndị nwanyị ka ha jee ndị mmadụ ozi nleta, tinyere ezinụlọ nọ na nsogbu.

Otu nwanne-nwanyị, onye na-agbake site n’ọrịa surgery ka-akwadoro ije ozi nleta nye ndị ọrịa ibe ya. Ọ biwo ogologo ndụ ya n’ijere Onye Nwe-anyị ozi nleta nye ndị ọ na-amaghị, dịka a ga-asị na ha bụ ndị agbata-obi na enyi. Mgbe ọ nwetere mmetụta nke-a n’obi ka ọ jee ozi nleta nime ụlọ-ọgwụ, ọ jiri obi siri ike na nnukwu ịhụnanya jeere ndị ọzọ ozi, nke mere ndị ọrịa ndị ọzọ bidoro kpewe ekpere ka ọ ghara ị gbakee ọsịsọ.

Otu ahu isi akwado ije ozi nleta, ka ị nwekwara ike iji kwado maka okù Onye Nwe-anyị ga-akpọ gị ị bụ onye ndu mgbe oge ya ruru. Ọ pụtara na ị g’enwe okwukwe na Jizọs Kraịst nke gbara mgbọrọgwu n’ime ịhụnanya ị nwere maka akwụkwọ nsọ, ka ịnwe ike duru ndị mmadụ ma kuziere ha okwu Ya n’atughị egwu. Mgbe ahụ a ga-akwado gị ị nwete Mụọ Nsọ dịka onye nso gị oge nile. Ọ ga-anụ gị ọkụ n’obi i kwu, “A gam akuzi,” mgbe onye ndụmọdụ gị n’otù Ndị Isi Ndị Iyom Nta jiri olu ụjọ kwuo, “Nwanne-nwanyị Alvarez ejighi ahụ taa. Onye ga-akuzi klasị ya?”

Ọ bụ-kwa otu mkwado ahụ ka a g’eme n’ụbọchị ọma ahụ Onye Nwe-anyị ga-akpọ gị maka ọrụ gị dịka onye nne. Mana ọ pụta-kwara na ị ga enwe obi ịhụnanya karịrị nke ị nwere na mbụ. Ọ pụta-kwara na okwukwe ị nwere na Jizọs Kraịst g’amụba karịa nke ị nweburu n’obi gị na mbụ. Ma ọ pụta-kwara na ike iji ekpe ekpere maka mmetụta, odudu, na nkasị-obi nke Mụọ Nsọ ga-akarị karịa otu icheburu na ọ kwere nnọọ omume.

Ị nwere ike jụọ ezigbo ajụjụ nke-a na kedụ otu nwoke ọbụla gbara afọ ọbụla g’esi amata mkpa ndị nne. Nke-a bụ ezigbo ajụjụ. Ụmụ nwoke agaghị amacha ịhe nille, mana anyị nwere ike ị mụta ufọdụ nkuzi site na mkpuhe sitere na Chineke. Ma anyị nwe-kwara ike ị mụta site n’ịle anya, mgbe anyị were ohere ị chọ Mụọ ahụ ka ọ nyere anyị aka ghọta ịhe anyị n’elere anya.

Kemgbe afọ 57 mụ na ya gbara-akwụkwọ ka m n’ele Kathleen Johnson Eyring anya. Ọ bụ nne ụmụ ndị nwoke anọ na ụmụ ndị nwanyị abụọ. Ruo taa, ọ nabatara okù i bụ onye nne nwere mmetụta nye ndị ezinụlọ ya karịrị otu narị, tinyekwara igwè ndị ezinụlọ ndị ọzọ ndị ọ nabatara n’obi ya dịka nne.

Ị n’echeta nkọwa zuru-okè nke Onye Isi Nelson kọwara maka ọrụ dị nsọ nke nwanyị—“Dịka onye nne,onye nkuzi, m’ọbụ Onye nsọ ọzụzụ, ọ na-akpụ ụrọ ka ọ nwee oyiyi dịka olileanya ya sịrị dị. Dịka ya na Chineke n’arụkọrịta ọrụ, ije ozi ya nke dị nsọ bụ ị nyere mụọ aka ka ha dị ndụ, ma bulie mkpụrụ-obi elu. Nke-a bụ immezucha ebunmnobi okike ya.”5

Dịka obi m nwere ike igbali chee, nwunyem Kathleen, emezuwo iwu ahụ, nke Nna nyere ụmụ ya ndị nwanyị. Echerem na ọkpụrụkpụ okwu nọ nime bụ nke-a “ ọ na-akpụ ụrọ ka ọ nwee oyiyi dịka olileanya ya sịrị dị … Mgbe ya na Chineke n’arụkọta ọnụ.” Ọ n’aghị eme ya ike-ike. Ọ na-akpụ ya akpụ. Ma ọ nwere ihe nlere-anya nke olile anya ya, na nye nke ọ gbalịrị ịzụpụta ndi ọ hụrụ nanya na ndi ọ bụụrụ nne. Ịhe nlere-anya ya bụ oziọma nke Jizọs Kraịst—nihi a na m ahụ nke-a site n’iji ekpere n’ele ya anya kamgbe ọtụtụ afọ.

Ị bụ nwanyị gbara-ndu, onye ya na Chineke na-arụkọta ọrụ bụ otu ụmụ ndị nwanyị nwere ezi agwa ma dịkwa ukwu n’esi abụ nne, n’edu ma n’eje ozi nleta, n’eje ozi n’ụzọ ọbụla ma n’ebe ọbụla Ọ kwadoworo ha. A nam ekwe gị nkwa na ị g’ahụ ọňụ n’ime njem gị nke nlaghachi ebe obibi nke igwe mgbe ị na-alaghachi n’ịrụ Ya dịka nwa Chineke nke nwanyị onye gbarandu

A na m agba ama na Chineke dị ndụ ma Ọ hụrụ gị n’anya. Ọ ga-aza ekpere gị niile. Ọkpara Ya ọ hụrụ n’anya, n’ụzọ nile, n’edu Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchị Ikpeazu. Onye Isi nduzi Russell M.Nelson bụ onye amụma Ya. Ma Josef Smit hụrụ ma kwukọrịta okwu ya na Chineke nke Nna na Jisọs Kraịst nime odo-osisi n’obodo Palmyra, New York. A na m agba ama na nkea bụ ezịokwu. A na m agbakwa ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta gị; Ọ hụrụ gị n’anya. Ma site n’Aja-mgbaghara-mmehie Ya, e nwere ike ịsachapụ gị ma bulie gị ruo n’ọkpụkpọ oku ndi dị elu ma dị nsọ nke ga-abịara gị. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.