2010–2019
Njem-egwu Gị nke dị Ukwu
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Njem-egwu Gi nke di Ukwu

Onye Nzọpụta na akpọ anyị, ụbọchị nile, ka ị hapụ ndụ ụtọ anyị nile ma nchekwa anyị nile, ma soro Ya n’ime njem nke onye n’eso ụzọ.

Maka ndị Hobbits

Otu akụkọ-ifo nke ụmụntakịrị edere ọtụtụ afọ gara gara-aga bidoro site n’ahịrị nke-a “nime otu ọnụ-ewi dị n’ime ala ka, otu onye hobbit bibụrụ.”1

Akụkọ nke Bilbo Baggins bụ maka otu onye hobbit, onye n’enweghi ịhe ukwu a ga-ekwu gbasara ya, onye nke nwetere otu ohere pụrụ-iche—ohere njem dị egwu, nakwa nke nwere nkwa na ọ ga enwete nrite dị ukwuu.

Nsogbu dị nime ihe-a bụ na ọtụtụ ndị hobbit na-akwanyere onwe ha ugwu achọghị ịhe gbasara njem dị egwu. Ndụ ha bụ nanị maka ụtọ. Ọ na-amasị ha iri nri ugboro isii n’ụbọchị mgbe ha nwetere ya, ma nọrọ ụbọchị ha n’ime ubi-nta ha, n’akọrị akụkọ ha ndị nleta ha, n’abụ abụ, n’akụrịkọta ngwa-egwu, ma n’erite ọňụ niile dị mfe n’ime ndụ nke-a.

Kama, mgbe a gwara Bilbo maka ohere ị ga njem nke-a dị egwu, enwere otu ịhe gbajuru ya n’ime obi ya. Ọ ghọtara n’isi mbu ahụ na njem nke-a g’abụ nke ịma-aka. Tụmadị dị oke egwu. Enwere ike ọ gaghị alota ọzọ site na ya.

N’agbanyeghi, okù nke njem a dị egwu rubara n’ime ala-ala obi ya. N’ihi nke-a, onye hobbit nke-a, hapụrụ ndụ ụtọ ya ma tinye isi na ụzọ njem a dị egwu nke ga-akpọrọ ya ruo ụzọ niile “nke ebe ahụ ma laghachi ọzọ.”2

Njem Dị Egwu nke Gị

Enwere ike ịhe mere akụkọ nke-a n’eji emetụta ọtụtụ n’ime anyị bụ n’ihi na akụkọ nke-a bụkwa nke anyị.

Oge gbo gbo, tụtụ amụọ anyị, n’afọ nke oge menyụrụ ma nke uche anyị chefuru, anyịwa ka akpọrọ k’anyị bido otu njem. Ọ bụ Chineke, Nna anyị nke Igwe rọpụtara ya. Ị nabata njem-egwu nke-a pụtara n’anyị ga-ahapụ ndụ-ụtọ na nchekwa nke dị n’iru Ya. Ọ pụtara ị bịa n’ụwa maka njem nke ịhe egwu na mnwale juru n’ime ya.

Anyị maara na ọ gaghị a dị mfe.

Mana anyị makwara na anyị g’erite uru dị oke ọnụ-ahịa, tinyekwara ị nwete anụ-arụ nke mmadụ, ma ị nwete nhụmịhe nke oke ọňụ, na iri-uju nke ndụ anụ-arụ. Anyị ga-amụta otu esi anwa ike, achọta ịhe ma ị gba mbọ. Anyị g’abịa mata eziokwu nile gbasara Chineke, ma maka onwe anyị.

N’ezie, anyị maara n’anyị ga-eme ọtụtụ njehie mgbe anyị nọ n’ụzọ Mana ekwekwara anyị nkwa:na n’ihi nnukwu ịtụ aja nke Jizọs Kraịst, enwere ike ị sacha njọ anyị nile, mee mmụọ anyị adịrị ọhụrụ ma dịrị ọcha, ma, otu ụbọchị, bilie n’ọnwụ ma diri n’otu ọzọ anyị na ndị ahụ anyị hụrụ n’anya.

Anyị mụtara otu ịhụnanya Chineke siri dị n’ebe anyị nọ. Ọ nyere anyị ndụ ma Ọ chọrọ k’anyị merie. N’ihi nke-a, Ọ kwadoro anyị Onye Nzọpụta. “Na-agbanyeghi,” Nna anyị nke Igwe kwuworo, “ị nwere ike ị họrọ n’onwe gị, n’ihi na enyere gị ya.”3

A ga enwerịrị ọtụtụ akụkụ njem anụ-arụ nke-a nke nyere obi ụmụ Chineke mkpagbu m’ọbụgodi tụọ ha egwu nihi ọtụtụ ụmụnne anyị ndị nwoke na nwanyị ọzọ kpebiri megide ya.4

Site na onyinye na ike nke nhọrọ agwa, anyị matara na ohere nke dị n’ime ịhe anyị ga-amụta, ma ịhe anyị nwere ike ị bụ n’ebighi-ebi mere k’anyị mata na uru dị ya.5

Nihi nkea-, n’ịtụkwasị obi na nkwa nile, na ike nke Chineke na nime Ọkpara Ya ọ Hụrụ-N’anya, anyị nabatara aka-mgba ahụ.

A nabatara m ya.

Gị onwe gị nabatara ya.

Anyị kwere ị hapụ nchekwa nke ndụ mbụ ahụ ma jewe njem egwu nke anyị nke ije “ ebe ahụ ma laghachi azụ.”

Okù nke Njem Dị Egwu

N’agbanyeghi nke-a, ndụ nke anụ-arụ nwere ụzọ o si emefu anyị anya, akwaya? Ọ n’eme k’anyị chefuo ebumn’obi nnukwu ahụ, ma jidesi aka na ndụ-ụtọ ma hapụ ito-eto na ọganihu.

Emesịa-kwa, enwere ịhe anyị agaghị agọ n’odị ire n’ime ala-ala obi anyị, ịhe nwere oke agụụ maka ebumnuche dị elu ma dị ebube. Agụụ nke-a bụ otu n’ime ịhe mere ndị mmadụ jị anabata oziọma ahụ, tinyekwara Nzukọ Nsọ nke Jizọs Kraịst. Oziọma nke-a eweghachiri azụ, n’otu ụzọ, bụ mnwogharị ọhụụ emere okù nke njem ahụ dị egwu emere gbo-gbo. Onye Nzọpụta na akpọ gị, ụbọchị nile, ka ị hapụ ndụ ụtọ gị nile ma nchekwa gị nile, ma soro Ya n’ime njem nke onye n’eso ụzọ.

Enwere ọtụtụ ebe hiri-ahi n’ụzọ ahụ. Enwere ọtụtụ ugwu-nta, ndagburugbu,ma ọtụtụ ngagharị ụzọ. Enwere ike nwekwa ududo, dike-ọhịa, m’ọbụ dragon ole n’ole n’ụzọ ahụ. Mana ọ bụrụ na ị nọrọ n’ụzọ ahụ ma tụkwasị obi na Chineke, emesịa ị ga-ahụ ụzọ ga-eduba n’ime njedebe ebube gị ma laghachi n’ebe obibi igwe gị nọ.

N’ihi nke-a, kedụ otu isi ebido?

Ọ dị mfe.

Dobe Obi Gị N’ebe Chineke nọ.

Nke mbụ, ị kwesịrị ị họrọ ị dobe obi gị n’ebe Chineke nọ. Gba mbọ ụbọchị nile ị chọ Ya. Mụta otu isi ahụ Ya n’anya. Ma emesịa, hapụ ka ịhụnanya ahụ kpalie gị ị mụta, ị ghọta,ma ịsoro nkuzi Ya nile ma mụta i dobe iwu-nsọ Chineke nile. Oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachiri azụ bụ nke enyere anyị n’ụzọ doro-anya ma dị mfe nke nwata nwere ike ị ghọta N’agbanyeghi, oziọma nke Jizọs Kraịst nwere aziza nye ajụjụ ndị n’ara-ahụ na ndụ a, ma nwekwa omimi di nnukwu nke ị matacha ịhe nile dị ya nime agaghị adị mfe m’obụrụgodị na enwere ọmụmụ na ntule uche ruru ogologo ndụ nile.

Ọ bụrụ na ị nwe obi abụọ n’ihi na ịtụkwasịghị obi n’idi-ike gị, chetakwa na ndụ iso-ụzọ ya abụchaghị maka ị mee ịhe n’ụzọ zuru oke; ọ bụ maka iji obi mee ịhe. Ọ bụ nhọrọ gị nile n’egosi onye ị bụ, karịa ịdị-ike gị nile.6

Ọ bụrụgodi na ida n’ala, ị nwere ike ị họrọ na ị gaghị achili aka gị elu, kama ị ga-achọta ume, ma gaa n’ihu, ma kulie. Nke ahụ bụ mnwale dị ukwu nke njem ahụ.

Chineke mara na itozughi okè, na ị nwere ike ida n’ala mgbe ụfọdụ. Chineke hụrụ gị n’anya ma mgbe ị na agba mbọ, ma mgbe ị nwetere mmeri.

Dịka nne-na-nna nwere ịhụnanya, Ọ chọrọ ka ị gaa n’ihu na agba mbọ n’obi nke gị. Ndụ iso-uzọ ya dịka ị mụta otu esi apị pịano. Enwere ike na mbụ, nanị ịhe ị nwere ike ị pị bụ ụda-egwu mmadụ n’agaghị aghọta. Mana ọ bụrụ na ị ga n’ihu n’amụ ya, otu ụbọchị, ụda ndị ahụ ga emesịa bụrụ sonata, rhapsodies na concertos.

Gee nti, ụbọchị ahụ nwere ike ọ gaghị a bịa na ndụ a, mana ọ ga-abịa. Nanị ịhe Chineke chọrọ bụ ka ị n’agba mbọ akwụsịghị-akwụsị.

Setipụ aka Ịhụnanya nye Ndị-ọzọ

Enwere ịhe dị itunanya n’ime njem nke-a ị họrọ ijee: nanị ụzọ ị g’esi eto-eto nime njem oziọma gị, bụ ị nyere ndị-ọzọ aka too-kwa nke ha.

I nyere ndị-ọzọ aka bụ ụzọ nke onye n’eso ụzọ. Okwukwe, olilianya, ịhụnanya, omiko, na ije-ozi n’enwogharị anyị dịka ndị n’eso ụzọ.

Site na mbọ gị nile ị nyere onye ogbenye na onye mkpa aka, i setipụ aka nye onye nọ nime nsogbu, agwa gị ga n’adị ọcha ma n’apụta ịhè, mụọ gị na-abawanye, ma ị n’eje ije dị elu karịa.

Mana ị gaghị egosi ịhụnanya nke-a n’achọkwa ka akwụọ gị ụgwọ. Ọ gaghị abụ ụdị ije ozi ahụ nke n’achọ ka amata ya, nke n’achọ mkwanye ugwù, m’ọbụ chọọ nrite.

Ndị ezigbote ndị n’eso ụzọ Jizọs Kraịst na ahụ Chineke na ụmụ Ya n’anya n’achọghị ịhe nrite ma emesịa. Anyị na ahụ ndị ahụ na-agharịpụ anyị n’anya, ndị n’enweghi mmasị maka anyị. Tinyekwara ndị n’akọ anyị ọnụ, n’ekwu anyị ikwu, ma chọọ ị merụ anyị ahụ.

Mgbe unu jiri ịhụnanya dị ọcha nke Kraịst mejuo obi unu, agaghị enwe oghere maka ọgụ, ị ma ikpe, na ị kọ ọnụ. Ị n’edobe iwu nile nke Chineke n’ihi na ị hụrụ Ya n’anya. Mgbe nke a n’eme, wayọ-wayọ gị na-adị ka Kraịst, ma n’echiche, ma n’agwa.7 Kedụ njem dị egwu karịrị nke-a?

Kọọ Akụkọ Gị

Ihe atọ anyị ga-agba mbọ ị mata nke ọma n’ime njem a, bụ inyekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, ma enwekwala ihere n’ihi anyị bụ ndị otu ndị Nzukọ-nsọ nke Jisọz Kraịst.

Anyị anaghị ezo okwukwe anyị ezo.

Anyị anaghị eli ya n’ime ala.

Kama, anyị na ndị ọzọ n’ekwukọrịtara maka njem anyị n’ụzọ dị mfe na n’ụzọ mkparịkọta mmadụ na mmadụ si adị. Ọ bụ ịhe enyi na enyi n’eme—ha n’ekwukọrịta okwu maka ịhe nile ahụ dịịrị ha mkpa. Ịhe nile ndị ahụ dịịrị ha nso nime obi, ma na-abara ha uru.

Ọ bụ ịhe ị n’eme. Ị na-akọ akụkọ gị nile, na nhụmịhe gị nile dịka onye otù Nzukọ Nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

Mgbe ụfọdụ, akụkọ gị ga-atọ ndị mmadụ ọchị. Mgbe ụfọdụ ọ ga-enweta akwa-mmiri. Mgbe ụfọdụ ọ ga-enyere ndị mmadụ aka ị ga n’ihu n’ịnwe ndidi, ma nwe ume eji anagide awa ọzọ, ụbọchị ọzọ ma ruwe Chineke nso karịa.

Kwupụta nhụmịhe gị nile n’ihu n’ihu, na soshial midia, n’otù nile, ebe nile.

Otu nime ịhe ikpe azu Jizọs gwara ndị n’eso ụzọ Ya bụ na ha ga eje gburugburu ụwa nile ma kesaa akụkọ nke Kraịst onye biliworo n’ọnwụ.8 Taa anyị jikwara obi aňụrị nabata ikike ukwu ahụ.

Nke-a bụ ozi dị ebube nke anyị n’ekesa: n’ihi Jizọs Kraịst, nwoke ọbụla, nwanyị ọbụla, na nwata ga-alaghachi ụlọ n’ụdọ n’ebe obibi igwe ha nọ ma, n’ebe ahụ, bie n’ebube na eziomume!

Enwekwara ozi dị mma ọzọ a ga ekesa.

Chineke egosiwo onwe ya nye mmadụ taa! Anyị nwere onye amụma dị ndụ.

Ka m chetara gị na Chineke achọghị ka ị “reesị” mmadụ ozịọma eweghachiri azụ, m’ọbụkwanụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

Nanị ịhe Ọ chọrọ n’aka gị bụ ka ị ghara izucha ya n’okpruru bushel.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekpebie na Nzukọ Nsọ abụghị maka ha, nke ahụ bụ mkpebi ha.

Ọ pụtaghị na i dawo. Ị ga-aga n’ihu n’akpasị ha agwa n’obi ebere. Ọ pụtaghị na ị gaghị akpọkwa ha okù ọzọ.

Ịhe dị iche n’etiti mmekọta mmadụ-na-mmadụ na nke ndụ onye n’eso ụzọ bụ— ikpo-okù.

Anyị hụrụ n’anya ma na-akwanyere ụmụ nile nke Chineke ugwù, n’agbanyeghi ọnọdụ ha ndụ, n’agbanyeghi abụrụ ha m’ọbụ okpukperechi ha, n’agbanyeghi mkpebi-obi ha nke ndụ a.

Ọrụ anyị bụ, ikwu, “Bịa ma lere! Chọta n’onwe gị otu ije ije nke onye n’eso ụzọ g’esi agozi gi ma mee gị onye dị elu.”

Anyị n’akpọ ndị mmadụ okù ka unu “bịa ma nye aka, dịka anyị n’eme ụwa ka ọ bụrụ ebe dị mma karịa.”

Ma anyị n’ekwu, “Bịa ma nọrọ! Anyị bụ ụmụnne unu ndị nwoke na nwanyị. Anyị ezughi okè. Anyị tụkwasịrị obi na Chineke ma n’achọsi ike idobe iwu Ya nile.

“ Soro anyị, ma ị ga eme k’anyị dịrịmma karịa. Ma, mgbe nke-a n’eme, ị g’adị kwa mma karịa-kwa. K’anyị jikọ aka jee njem a dị egwụ.”

Kedụ Ebe M G’ebido?

Mgbe enyi anyị Bilbo Baggins nwetere mmetụta njem ahụ di egwu n’ime obi ya, o kpebiri obi ya izu ezigbo ike nke abalị, rie nri ụtụtụ juru eju, ma malite njem n’isi ụtụtụ

Mgbe Bilbo tetere, ọ hụrụ na ụlọ ya ghaghasịrị-aghaghasị, ma ọfọrọ ntakịrị ka ịhe a mefuo ya anya site na ebumn’uche ya.

Mana enyi ya Gandalf bịara ma jụọ ya, “oge ijikere ga emesịa bịawa?”9 N’ihi ọ chọrọ i zutenwu ndị enyi ya, Bbilbo kpebiri n’onwe ya ịhe ọ g’eme.

N’ihi nke-a, onye hobbit nke-a, onye n’enweghi ịhe a ga ekwu gbasara ya hụrụ onwe ya ka ị na agbapụ n’ihu ụzọ ya baa n’ime ụzọ njem ahụ dị egwu, nke mere o ji chefuo okpu ya, mkpara ya, ma akwa-nchicha-ihu ya. Ọ hapụdịrị nri ụtụtụ nke abụọ ya n’erighi ya.

Enwere ike enwere ịhe mmụta maka anyị nile nọ n’ebe a.

Ọ bụrụ na mụ na gị enwetawo mkpali ndịa isonye na njem a dị egwu nke ibi ndụ, na ị kesara ịhe nile Nna nke Igwe kwadoworo anyị kamgbe gboo, A nam akasi gị obi, taa bụ ụbọchị i soro Ọkpara nke Chineke ahụ, Onye Nzọpụta n’ụzọ Ya nke ije ozi na ndụ onye n’eso ụzọ.

Anyị nwere ike itufu ogologo ndụ n’eche maka oge ahụ mgbe ịhe nile ga-ahazi onwe ya n’ụzọ zuru okè . Mana ugbua bụ oge itinyecha obi nime ịchọ Chineke, ijere ndị ọzọ ozi nleta, ma ị kesa nhụmịhe anyị nye ndị ọzọ.

Hapụ okpu gị, mkpara gị, akwa nhicha ihu gi ma ụlọ gharasịrị-aghaghasị.10

Maka ndị ahụ n’eje ije n’ụzọ ahụ, nwee ume, gosi omiko, nwee obisike, ma ga n’ihu!

Maka ndị ahụ hapụworo ụzọ ahụ, biko laghachi, sorokwa anyị ọzọ, mee k’anyị sie ike.

Maka ndị ahụ n’ebidobeghi njem a, kedụ ịhe n’eche? Ọ bụrụ na ị chọrọ ị nwete nhụmịhe maka itunanya nile nke njem nsọ a, setipụ ụkwụ gị ma bido njem egwu nke gị! Kwuore ndị mgbasa-oziọma okwu. Kwuore ndị enyị gị bụ ndị Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ okwu. Kwuore ha maka ọrụ nke-a dị ebube ma nke dị ịtụnanya.11

Oge eruwo ibido!

Bia Sonye Anyi!

Ọ bụrụ na ichere na ndụ gị nwere ike ị nwe nkọwa dị elu, ebumnuche dị elu, njikọ ndị ezinụlọ siri ike, ma i n’orụ Chineke nsọ karịa otu ị nọ; biko, bia sonye anyi!

Ọ bụrụ na ị chọrọ igwe-mmadụ ndị n’agbalịsi ike ị bụ ndị ọma kachasị nke ha nwere ike ịbụ, ndị n’enyere ndị nọ na mkpa aka, ma ndị n’eme ka ụwa nke-a dịrị mma karịa, bia sonye anyi!

Bịa ma hụrụ otu idị-ebube na ịtụnanya njem a sịrị dịrị.

N’okporo ụzọ nke-a, ị ga-achọta onwe gị.

Ị ga-achọta nkọwa.

Ị ga-achọta Chineke.

Ị ga-achọta njem ndụ gị nke kacha ibe ya n’ịdị egwu na n’ịdị ebube

Nke a ka m n’agba-ama n’aha nke Onye Mgbapụta na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. J. R. R. Tolkien, The Hobbit or There and Back Again (Boston: Houghton Mifflin, 2001), 3.

  2. Subtitle of The Hobbit.

  3. Mozịs 3:17.

  4. See Job 38:4–7 (the sons of God shouted for joy); Isaiah 14:12–13 (“exalt my throne above the stars of God”); Revelation 12:7–11 (there was a war in heaven).

  5. “The Prophet Joseph Smith described agency as ‘that free independence of mind which heaven has so graciously bestowed upon the human family as one of its choicest gifts’ [Teachings of the Prophet Joseph Smith, comp. Joseph Fielding Smith (1977), 49]. This ‘free independence of mind,’ or agency, is the power that allows individuals to be ‘agents unto themselves’ (D&C 58:28). It encompasses both the exercise of the will to choose between good and evil or differing levels of good or evil and also the opportunity to experience the consequences of that choice. Heavenly Father loves His children so much that He wants us to reach our full potential—to become as He is. To progress, a person must possess the innate capacity to make his or her desired choice. Agency is so fundamental to His plan for His children that ‘even God could not make men like himself without making them free’ [David O. McKay, “Whither Shall We Go? Or Life’s Supreme Decision,” Deseret News, June 8, 1935, 1]” (Byron R. Merrill, “Agency and Freedom in the Divine Plan,” in Roy A. Prete, ed., Window of Faith: Latter-day Saint Perspectives on World History [2005], 162).

  6. In her novel Harry Potter and the Chamber of Secrets, author J. K. Rowling has Hogwarts headmaster Dumbledore say something quite similar to young Harry Potter. Nke-a bụkwa ezigbo ndụmọdụ nye anyị nile. I have used it in messages before and think it is worth repeating.

  7. “Ndị m hụrụ n’anya, ugbua ọ bụ n’anyị abụghị ụmụ nke Chineke, ma ọ pụtabeghi ihè ugbua ịhe anyị g’abụ: mana anyị mara na, mgbe ọ g’abịa, anyị g’adị ka ya; n’ihi n’anyị g’ahụ ya dịka otu ị dị” (1 Jọn 3:2; emphasis added).

    While such a transformation may be beyond our ability to comprehend, “the Spirit itself beareth witness with our spirit, that we are the children of God:

    “And if children, then heirs; heirs of God, and joint-heirs with Christ; if so be that we suffer with him, that we may be also glorified together.

    “For I reckon that the sufferings of this present time are not worthy to be compared with the glory which shall be revealed in us” (Romans 8:16–18; emphasis added).

  8. Lee Matiu 28:16–20.

  9. Tolkien, The Hobbit, 33.

  10. Lee Luk 9:59–62.

  11. See LeGrand Richards, A Marvelous Work and a Wonder, rev. ed. (1966).