2010–2019
Ị kwụsị ike na Nkwa na Ọgbụgbandụ Anyị nile
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Ị kwụsị ike na Nkwa na Ọgbụgbandụ Anyị nile

A na m akpọ unu okú ka unu jiri obi-eziokwu cheegodi maka nkwa nile na ọgbụgbandụ nile nke gị na Onye Nwe-anyị na ndị ọzọ mere, wee mata na okwu-ọnụ gị bụ nkwa gị.

Ezi ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, dịka anyị na emechi nkeji nke-a, ọ g’adị nma m’anyị jide n’obi anyị akaebe nile agbara taa maka eziokwu nile nke oziọma Jizọs Kraịst. Ọ bụ ngọzị nye anyị n’anyị nwetere ohere nsọ nke-a iji kwegharịa ọzọ nkwa anyị kwere Onye Nwe Jizọs Kraịst, n’anyị bụ ndị oru Ya ma na Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị.

Mkpa ọ dị ịmee ma idobe nkwa nile na ọgbụgbandụ nile n’anyị m anrụ n’’ime uche m. Kedụ otu osi dịịrị gị mkpa idobe okwu-ọnụ gị? Ị dị ntụkwasị obi? Ị mee ịhe ikwuru na ị g’eme? Ị gba mbọ ikwanyere ọgbụgbandụ gị dị nsọ ugwú? Ị nwe ndụ eziokwu? Site n’idobe nkwa nile anyị kwere Onye Nwe-anyị ma mke anyị kwere mmadụ, anyị n’aga ije n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ ịlaghachi Nna anyị nke Igwe ma nwete mmetụta nke ịhụnanya Ya n’ime ndụ anyị.

Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst bụ nnukwu Ọnye Ịmụmatụ nye anyị mgbe ọ gbasara ị mee na idobe nkwa nile na ọgbụgbandụ nile. Ọ bịara n’ụwa ma kwee nkwa ị mee uche nke Nna. Ọ kuziri ukpuru nile nke oziọma ma n’okwu-ọnụ ma n’agwa. Ọ tụrụ aja mmehie maka mmehie nile anyị k’anyị wee dị ndụ ọzọ. Ọ kwanyewo ugwú nye nkwa Ya nile n’otu n’otu.

E nwere ike ikwu otu a gbasara onye ọbụla n’ime anyị? Kedụ ịhe ọghọm dị nime ị ghọ obere aghụghọ, ị jehie obere njehie, m’ọbụ emezughi kpam-kpam ịhe nile anyị kwere ị mee? Kedụ ịhe g’eme m’anyị si na ọgbụgbandụ anyị pụọ? Ndị ọzọ ha aga abịakwute Kraịst n’ihi ihé nke ọmụmatụ anyị? Okwu gi ọ bụ nkwa gị? Idobe nkwa gị nile abụghị agwa; ọ bụ otu ejirimara onye n’eso ụzọ Jizọs Kraịst.

N’ihi Onye Nwe-anyị mara adịghị-ike anyị nile nke anụ-arụ, Ọ kwere nkwa nke-a , “Nọrọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, ma atụla ụjọ, n’ihi na mụ Onye-nwe nọnyere unu, ma ga-eguzogide unu.”1 Enwetawo m nnọnye Ya mgbe m chọrọ mmeda-obi, nkasị obi, mọbụ mmụta-ịhe mọbụ ume nke nsọ, ma enwewom umeala ma obi ekele site na nnọnye Ya nke dị nsọ.

Onye Nwe-anyị ekwuwo, “ Mkpụrụ-obi ọbụla nke hapụrụ mmehie ya nile ma bịakwute m, ma na-akpọku aha m, ma na-erube kwa isi n’olu m, ma na-edebe kwa iwu-nsọ m nile, ga-ahụ iru m ma mata na a bụ m.”2 Enwere-ike, nke-a bụ nkwa Ya kachasị ibe.

A mụtaram mkpa ọ dị imezu okwu-ọnụ m na ntorobịa m. Otu n’ime ọmụmatụ ahụ bụ mgbe m guzoro dịka soja ma gụọ Iyi Scout ahụ. Njikota anyị na ndị Boys Scout nke Amerika, dịka ọ n’abịa na njedebe ugbua, ga-abụ, n’oge nile, otu nrite dị ukwu nye m ma nye Nzukọ-nsọ nke-a. Maka ndị Otú Scout, maka ndị nwoke na nwanyị ndị jere ozi dịka ndị ndu Scout, maka ndị nne nile—ọ bụ ha ka aga akacha ekele—ma maka ndị ụmụokorobịa-nta nile ndị sonyere nime Scout, anyị n’asị “Unu emela.”

N’ime nkeji nke-a, ezi onye amụma anyị, Onye Isi Russell M. Nelson, ma Okenye Quentin L. Cook amawo nkwa maka nhazigharị ndị g’ebugharị anyị uche maka ndị ntorobịa anyị ma hazịegharịa otú anyị dịka eziokwu ekpughere sịrị dị. Na mgbakwunye, ụbọchị Sọnde nke-a gara-aga, Onye Isi Nelson na Onye Isi M. Russell Ballard nyere Nzukọ-nsọ ụwa nile nkọwa maka atụmatụ ọhụrụ nke Ụmụaka na Ndị-ntorobịa nke Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. Ọ bụ atụmatụ zuru-ụwa nile nke dabeworo n’elu Onye Nwe-anyị na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst. Ndị Otú Ndi Isi Nduzi nke Mbụ na ndị Kworum Ndị Ozi Iri Abụọ were otu obi na ntuzi aka nke-a, ma mụ onwem n’agba aka-ebe na Onye Nweanyị eduwo anyị n’ụzọ anyị jere maka ya. Obi n’atọ m ụtọ maka ụmụaka na ndị ntorobịa nke Nzukọ-nsọ maka ị nwete ahụmịhe nke atụmatụ nke-a gbasara ha ma n’ebe obibi ma n’ebe nzukọ-nsọ—site na mmụta-ịhe nke oziọma, ije-ozi na egwuruegwu nile, ma mwulite nke onwe.

Isiokwu-mmụta nke ndị ntorobịa maka afọ 2020 n’abịa-abịa, n’ekwu maka nkwa Nifaị kwere ị “jee ma mee.” O dere, “Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, gwara nna m si: A ga m eje mee ihe ndị ahụ Onye-nwe nyere n’iwu-nsọ, n’ihi a ma m na Onye-nwe anaghị enye ụmụ nke mmadụ iwu-nsọ, ma ọbụghị na ọ ga-edozi ụzọ ha ga-esị mezuo ihe ndị ahụ o nyere ha n’iwu-nsọ.”3 N’agbanyeghi n’ekwuru nke-a oge tere aka, anyịwa bụ ndị Nzukọ-nsọ nke-a gbadokwara ụkwụ n’elu nkwa ahụ taa.

Ị “ jee ma mee” pụtara ibili elu karịa otu ụwa si eme ịhe, ị nata ma mezuo mkpuhe nile nke onwe, ijiri nchekwube na okwukwe maka ọbịanihu bie ndụ eziomume, ị mee ma idobe ọgbụgbandụ nile maka isoro Jizọs Kraịst, ma site otua mụbaa ịhụnanya anyị nwere maka Ya, Onye Nzọpụta nke ụwa ahụ.

Ọgbụgba-ndụ bụ nkwa nwere akala abụọ nke dị n-etiti anyị na Onye Nwe-anyị. Dịka ndị otú Nzukọ-nsọ, anyị n’agba ndụ n’oge baptizim anyị ịnyekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, ibi ndụ dịka O jiri bie. Dịka ndị ahụ emere baptizim n’ime Mmiri nile nke Mọmon, anyị n’agba ndụ ị bụ ndị nke Ya, “iburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya, ka ha wee dị mfe; … “isoro ndị na-eru uju iru uju; … kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi-obi, na iguzo dịka ndị aka-ebe nke Chineke n’oge nile na n’ihe nile.”4 Ozi-nleta nke anyị n’emekọrịtara onwe anyị nime Nzukọ-nsọ nkea n’egosi mkpebi obi anyị mere ị kwanye ugwú nye nkwa nile ndịa ahụ.

Mgbe anyị n’eri oriri nsọ, anyị n’enwogharị ọgbụgbandụ ahụ ị nyekwasị onwe anyị aha Ya ma ị kwe-kwa nkwa ọzọ n’anyị ga-adị nma karịa. Echiche na agwa anyị nke ụbọchị nile, ma nke ukwu ma nke nta, ga-egosi uchu anyị n’etinye n’ebe Ọ nọ. Nkwa Ọ kwere ma emesịa bụ, “Ma ọbụrụ na unu na-echeta m oge nile unu ga-enwe Mụọ m ka ọ na-anọnyere unu.”5

Ajụjụ m taa bụ, anyị ọ na-akwụsị ike n’elu nkwa na ọgbụgbandụ anyị nile, m’ọbụkwanụ ha bụ nkwa ndị a na-ejighi obi nile kwee, ndị ekwere n’igbirigbere-ọnụ, n’ihi nke-a, ọ dị mfe i i kebi ya? Mgbe anyị gwara onye ọzọ, “A ga m ekpere gị ekpere,” anyị ọ n’ekpe-kwa? Mgbe anyị kwere nkwa sị, “A ga m abịa ebe ahụ ị nye aka,” anyị ọ jee-kwa? Mgbe anyị ji mmadụ ụgwọ, anyị ọ n’akwụ-kwa? Mgbe anyị weliri aka anyị elu ị kwado onye otú n’okú ọhụrụ akpọrọ ya, nke pụtara ị nyere ya aka, anyị ọ n’enye kwa aka?

Otu mgbede mgbe m nọ na ntorobịa, nnem nọdụrụ n’akụkụ m n’ebe ụkwụ akwụ-ndina ya, ma kwuo okwu maka mkpa ọ dị idobe Okwu nke Amamịhe. “A mara m site na ahụmịhe ndị ọzọ, kamgbe ọtụtụ afọ gara-aga,” bụ ịhe o kwuru, “na-agaghị ewezi ike ị nụta mmetụta mụọ n’ihi mmadụ erubeghi isi nye iwu nke Okwu nke Amamihe.” Ọ lebara anya n’ime nkem, ma okwu ya nile rukpuru n’ime obi m: “Kwe mụ nkwa Ronnie, taa [ọ kpọrọ m Ronnie], na ị ga-edoberịrị iwu nke Okwu nke Amamịhe.” Ejiri m mkpachapụ-anya kwe ya nkwa, ma ejisịrị m ya ike kemgbe afọ ndịa ahụ.

Nkwa ahụ azọwo m ọfụma mgbe mụ nọ n’oge ntorobịa m, ma afọ ndị ọzọ mgbe m bidoro nọwa n’etiti ndị azụma ahịa ibem, ebe a na-añụ mmanya dị iche-iche n’efu. Emere mụ mkpebi obi mgbe ahụ i soro iwu nile nke Chineke, ma eweghi mgbe m lere anya n’azụ. Onye Nwe-anyị kwuru, “Mụ, Onye-nwe, ka a na-amanye mgbe unu mere ihe m kwuru mana mgbe unu na-emeghị ihe m kwuru, unu enweghị nkwa.”6 Kedụ ịhe Ọ n’agwa ndị ahụ ndị n’edobe iwu nke Okwu nke Amamịhe? Na anyị ka-aga ekwe nkwa nke ahụ-isike, ike, amamịhe, mmata-ịhe, ma ndị mụọ-ozi maka nchekwa anyị.7

Ụfọdụ afọ gara, Nwanne-nwanyị Rasband na Mụ nọ na Tempụl nke Salt Lake maka nrachi nke otu n’ime nwa-nwanyị anyị. Dịka anyị na nwa-nwanyị nta ọzọ, onye n’erubeghi ị bata hụ emume ahụ, guzoro n’ezi tempụl, anyị kwukọrịtara okwu maka mkpa dị nime nrachi nke tempụl dị nsọ nke Chineke. Dịka nne m jiri kuziere m ọtụtụ afọ gara-aga, anyị gwara nwa-nwanyị anyị okwu, “Anyị chọrọ ka ịnwete nchekwa nke nrachi tempụl, ma anyị chọrọ ka i kwe anyị nkwa na mgbe ị hụrụ onye nso ebighi-ebi gị, ị ga-ahọpụta otu ụbọchi gị na ya irachi nime tempụl.” O nyere anyị okwu-ọnụ ya.

Foto, oyiyi
Nwa nwanyị Okenye Rasband na di ya.

O gwawo anyị kamgbe ahụ na nkwa ya ahụ chekwara ya ma chetara ya maka “nke kachasị dịrị mkpa.” Ọ mesịrị gba ndụ dị nsọ mgbe ya na di ya rachiri n’ime tempụl.

Onye Isi Nelson akụziwo na: “Anyị … n’ewulite ike nke Onye Nzọpụta nime ndụ anyị mgbe anyị n’agba ndụ dị nsọ ma n’edobe ọgbụgbandụ ndụ ahụ n’esepụghị aka. Ọgbụgbandụ anyị nile n’ekechikọta anyị n’ebe Ọ nọ ma n’enye anyị ike dị nsọ.”8

Mgbe anyị dobere nkwa anyị nile anyị kwekọrịtara onwe anyị, ọ pụtara na ọ g’adịrị anyị mfe i dobe nkwa anyị kwere Onye Nwe-anyị. Chetakwa okwu nile nke Onye Nwe-anyị: “Ọ bụrụgodi na ị meworo otua nye otu nime ndị ụmụnne nwoke m ndịa dịkasịrị nta, ọ bụ m ka unu meworo ya.”9

Soro m tulee uche maka ọmụmatụ ndị gosiri ịkwe nkwa n’ime akwụkwọ-nsọ. Ammọn na ndị ụmụnwoke nke Mosiah n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn kwere nkwa “ikwusa okwu nke Chineke.”10 Mgbe ndị agha Laman jidere Amọn, akpọgara ya n’iru Onye Eze ndị Laman bụ Lamoni Ọ kwere Onye-eze nkwa na, “A ga m abụ nwa-oru gị.”11 Mgbe ndị oshi bịara izuru atụrụ nke eze ahụ, Amọn gbujipụrụ aka ha. N’ihi nke-a tụrụ eze ahụ n’anya, ọ gere ntị nye nkuzi nke Amọn maka oziọma ma chegharịa.

Ruth, nime Agba-ama nke Ochie, kwere nne-di ya nkwa na, “Ebe ọ bụla ị jere, a ga m eje.”12 Ọ mere dịka okwu-ọnụ ya sịrị dị. Onye Samaritan ọma ahụ, ekwuru nime Agba-ama nke Ọhụrụ, kwere onye nlekọta inn ahụ nkwa na ọ bụrụ na ọ lekọta onye njem ahụ merụrụ ahụ, “Ịhe ọ bụla ị mefuru karịa nke-a, mgbe m laghachiri azụ, a ga m akwụghachi gị ya.”13 Zoram n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, kwere nkwa na ọ ga-esoro Nifaị na ụmụnne ya ndị nwoke baa nime ọzara ahụ. Nifaị dere, “Mgbe Zorọm n̄ụwooro anyị iyi, egwụ kwụsịrị ịtụ anyị gbasara ya.”14

Kedụ-kwanụ maka nkwa mgbe-ochie “e kwere ndị nna ha” dịka akọwara nime akwụkwọ-nsọ nile na “obi ụmụ chigharikute kwa ndị bụ nna ha?”15 N’oge ndụ tupu ụwa nke-a mgbe anyị họọrọ atụmatụ nke Chineke, anyị kwere nkwa ị nye aka kpọkọlata Izrel dị ndụ ma ndị nwụrụ-anwụ. “Mgbe ahụ anyị na Onye Nwe-anyị tinyekọtara aka n’ọrụ,” bụ ịhe Okenye John A. Widtsoe kọwara ọtụtụ afọ gara-aga. “I mezupụta atụmatụ ahụ bịaziri bụrụ, n’abụghị nanị ọrụ nke Nna, m’ọbụkwanụ ọrụ nke Onye Nzọpụta, kama ọ bụụrụkwa ọrụ anyị.”16

“Mkpọkọta [ahụ] bụ ịhe kachasị mkpa n’eme n’ụwa nke-a taa,” bụ ịhe Onye Isi Nelson kwuru mgbe ọ n’eme njem ngagharị ụwa. “Mgbe anyị n’ekwu maka mkpọkọta, ịhe dị mfe anyị n’ekwu bụ eziokwu nke-a dị mkpa: nwa Nna anyị nke Igwe ọbụla dị ndụ m’ọbụ nwụrụ-anwụ, kwesịrị ị nụ ozi nke oziọma Jizọs Kraịst nke eweghachiri-azụ.”17

Dịka Onye Ozi nke Onye Nwe-anyị Jizọs Kraịst, a nam emechi okwu m site n’ikpọ okú na ikwe nkwa. A na m akpọ unu okú ka unu jiri obi-eziokwu cheegodi maka nkwa nile na ọgbụgbandụ nile nke gị na Onye Nwe-anyị mere, wee mata na okwu-ọnụ gị bụ nkwa gị. Nke abụọ, a nam ekwe gị nkwa, na dịka ị n’eme nke-a, Onye Nwe anyị g’ewulite okwu gi nile ma kwado ọrụ-aka gị nile dịka ị na-agba mbọ, jiri uchu n’enweghi ike ọgwugwụ wulie ndụ unu nile, ezinụlọ unu nile, ma Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchi Ikpeazu a. Ọ ga-anọnyere gị, ụmụnne ọma ndị nwoke na nwanyị, ma ị nwere ike, jiri obisike, chewe ihu gị mgbe “a ga-anabata gị nime elu-igwe, nke mere na [unu] na Chineke ga-ebi n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ … n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya.”18

Nke a ka m na-agbaa-ama ma n’ekwe nkwa n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.