2010–2019
Eduhiekwala M
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Eduhiekwala M

Dịka anyị n’erube isi nye iwu nsọ Chineke niile, a ga edubarịrị anyị mgbe niile n’ụzọ nke ziri ezi ma agaghị edughie anyị.

Taa, a na m enye onye niile okwu ndụmọdụ, kama kachasị nihi gị ọgbọ na-ebili—ụmụaka Praịmarị, ndi ikom nta, na ndiiyom nta. Onye-Amụma nke Onye-nwe-anyị nke ụbọchị anyị Onye-isi Russell M. Nelson hụrụ unu n’anya nke ukwuu—nke ukwuu nke mere na ọ gwara ọtụtụ n’ime unu okwu na mgbasa ozi ofufe ndi ntoroọbịa gburugburu ụwa afọ gara aga akpọrọ “Olile anya nke Izrel.”1 Mgbe ụfọdụ anyị na-anụta Onye-isi Nelson na akpọ unu otu ahụ kpọmkwem—“olile anya nke Izrel,” ọgbọ na-etolite na ọdịnihu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

Ndi enyi m nta, a ga m achọ ibido site n’ikọ akụkọ abụọ nke ezinaụlọ.

Dalmatian nke ugboro 102

Ọtụtụ afọ gara aga, esi m ọrụ bịarute n’ụlọ ma kụjaa ịhụta agba ọcha fesasịrị ebe niile—n’ala, ọnụ ụzọ ebe a na-adọba ụgbọala, na ụlọ biriki anyị n’acha ọbara ọbara. E nyọchara m ebe ahụ nke ọma ma chọpụta na agba ahụ ka dị mmiri mmiri. Akara nke agba duru gaa n’azụ ụlọ, ma ya mere e sooro m ya. N’ebe ahụ, a hụtara m nwa m nwoke gbara afọ ise ka o ji ahịhịa agba n’aka ya, na-achụ nkịta anyị ọsọ. Ọmarịcha Labrador ojii anyị ka awụrụ ihe ruru agba ọcha ọkara ahụ ya!

“Gịnị ka ị na-eme?” E jiiri m olu n’abụghị nke m.

Nwa m nwoke kwụsịrị, lee m anya, lee nkịta ahụ anya, lee ahịhịa agba ahụ agba n’atapụta, ma kwuo, “A chọrọ m nanị ka ya yie dịka nkịta nwere ntụpo ojii n’ime ihe nkiri ahụ—ị ma, nke ahụ nwere Dalmatian 101.”

Foto, oyiyi
Labrador Ojii
Foto, oyiyi
Dalmatian

A hụrụ nkịta anyị n’anya. Echere m na o zuru oke, ma n’ụbọchị ahụ nwa m nwoke nweere uche dị iche.

Nwa Pusi nwere Nkewa Akara

Akụkọ m nke abụọ dabere n’akụkụ Dede Ukwu-ukwu Grover, onye biiri n’ụlọ pụrụ apụ site n’obodo ahụ, dị anya site n’obodo. Dede Grover akawala nka dị egwu. Anyị echee na ụmụ anyị ndi nwoke kwesịrị ịhụta ya tupu ya anwụọ. Ya mere, otu ehihie, anyị nyara ogologo ụzọ ruo ụlọ ya mara mma. Anyị nọkọtara ọdụ ileta ma kọwatara ya ụmụ anyị ndi nwoke. N’erughị ogologo oge n’ime mkparịta ụka, ụmụ anyị ndi nwoke nta abụọ, nwere ike ịgba afọ ise na isii, chọbuuru ịga n’iro gwuo egwuregwu.

Dede Grover, nịnụta arịrịọ ha, hudatara chewe ihu ya n’ihu nke ha. Ihu ya kara ezi nka ma amaghị ya ama mere ụmụaka nwoke ndi ahụ sị tụọ egwu nwa obere n’ihi ya. Ọ gwara ha, n’ụda olu siri ike, “Lezie anya—e nwere ọtụtụ skonku n’iro ebe ahụ.” Ịnụta nkea, mụ na Lesa kụjara nke ukwuu; anyị nwere nchegbu na skọnku nwere ike ife ha ihe. Ụmụaka nwoke ahụ mgbe n’adịghị anya gara n’iro igwu egwuregwu dịka anyị garanihu ileta.

Foto, oyiyi
Skọnkụ

Emesịa, mgbe anyị banyere n’ime ụgbọala ịga n’ebe obibi anyị, a chọpụtara m n’aka ụmụaka nwoke, “Unu hụrụ skonku?” Otu n’ime ha zaghachịrị, “Ma ọlị, anyị ahụghị skonku ọbụla, kama anyị hụrụ otu nwa pusi ojii nwere akara ọcha na-azụ ya!”

Nnukwu Onye Ndughie

Akụkọ ndia gbasara ụmụntakịrị aka ha dị ọcha chọpụtara otu ihe gbasara ndụ na eziokwu nwere ike ime onye ọbụla n’ime anyị achịa ọchị, mana ha n’atụ kwa echiche dị omimi karịa.

N’akụkọ nke mbụ, nwa nwoke anyị nta nwebuuru ọmarịcha nkịta dịka petị; n’agbanyeghị, ọ buuru otu galọn agba ma, jiri ahịhịa agba n’aka ya, kpebie imepụta uche nke onwe ya.

N’ime akụkọ nke abụọ, ụmụaka nwoke ndi ahụ enweghị mgbe ha ma n’enwere ihe iyi egwu dị n’ihu ha site n’otu skonku. N’enweghị ike ịmata ihe ha zuterela, ha tinyere onwe ha n’etiti ihe nsonaozu n’ekwesighị ime ha. Ndia bụ akụkọ nke ịmaghe njirimara—ịche na nke bụ eziokwu bụ ihe ọzọ. N’ọnọdụ nke ọbụla, ihe nsonazụ ya esighị ike.

Otuosiladị, ọtụtụ mmadụ taa nabata ụdị isiokwu ndia n’ụzọ dị ukwuu karịa. Ha nwere ike inwe nsogbu ịhụta ihe niile dịka otu ha dị n’ezie ma ọbụ eziokwu ejughị ha afọ. Ọzọkwa, enwere ike ndi na-arụ ọrụ taa ahaziri ịkpachapụ anya duru anyị pụọ site n’eziokwu kacha ibe ya. Ndughịe na asị ndia karịrị mmaghịe njirimara amaghị ama ma mgbe ụfọdụ n’enwe nsonazụ dị ike n’abụghị nke nta.

Setan, nna nke ụgha niile na onye nnukwu ndughie, ga-eme anyị enwe mgbagwoju anya otu ihe sịrị dịrị ma ma ọbụ legbara eziokwu ebighi ebi niile anya ma ọbụ jiri ihe masịrị anyị karịa dochie ha. “Ọ n’ebuso ndi nsọ nke Chineke agha”2 ma jiriwo otu puku afọ na-agụkọta ma na-amụta ike ịrịọ ụmụ nke Chineke niile ikwere na ihe ọma bụ arụ ma arụ bụ ihe ọma.

O mepụtaworo onwe ya aha maka ime ndi mmadụ ekwere na skonku bụ nanị pusi ma ọbụ na, site n’ite agba, i nwere ike megharịa nkịta Labrador awụọ Dalmatian!

Foto, oyiyi
Mosis hụrụ Chineke ihu-na-ihu

Ka anyị ugbua lee anya na ụkpụrụ nkea dị n’ime akwụkwọ nsọ, mgbe Mosis onye amụma nke Onye-nwe-anyị zutere ihu-na-ihu ụdị mkpa nkea. “Mosis ka ejigidere n’elu ugwu dị nnukwu elu[;] … ọ hụrụ Chineke ihu na ihu, ma o kwusịịrị ya okwu.”3 Chineke kuziiri Mosis gbasara njirimara ebighị ebi ya. N’agbanyeghị Mosis bụ mmadụ n’ezughị oke, Chineke kuziri na Mosis dịịrị “dịka n’ọdịdị nke Nwa m Amụrụ Nanị; ma Nwa m Amụrụ Nanị … ga-abụ Onye nzọpụta.”4

N’ịchịkọta, n’ọhụ nkea dị ịtụnanya, Mosis hụrụ Chineke, ma ọ mụtakwara ihe dị mkpa gbasara onwe ya: ọ bụụrụ n’ezie nwa nke Chineke.

Gee ntị nke ọma maka ihe mere dịka ọhụ nke jụrụ anya mechiri. Ma o wee ruo na … Setan bịara ịnwa ya,” n’ekwu, “Mosis, nwa nke mmadụ fee m!”5 N’obi gbasiri ike Mosis zaghachịrị: “Onye ka bụ? N’ihi lee, a bụ m nwa nke Chineke, n’oyiyi nke Ọkpara ahụ a Mụrụ Nanị ya; ma olee ebe ebube gị dị, nke ga-eme na m ga-akpọrọ gịisi ala?”6

N’ụzọ ọzọ, Mosis kwuru, “I nweghị ike ịdughie m, n’ihi na a ma m onye m bụ. Ekepụtara m site n’Ọyịyị nke Chineke. I nweghị ihé na ebube Ya. Ya mere kedu ihe kpatara m ga-esi efe gị ma ọbụ daba n’ọnya ndughịe gị.

Ugbua ńaa ntị n’otu Mosis siri gaa n’ihu zaghachị. O kwupụtara, “Laa gị n’azụ, Setan; edughiekwala m.7

E nwere ọtụtụ ihe ndi anyị nwere ike ịmụta site na nzaghachị dị ike nke Mosis nye ọnwụnwa sitere n’aka onye-iro ahụ. A na m akpọku unu ịzaghachị otu ahụ mgbe unu zutere ọnwụnwa. Nye onye-iro nke mụọ gị iwu site n’ikwu: “Pụọ n’ezi! I nweghị ma ọlị ebube. A nwakwala m ma ọbụ kwuo okwu asị nye m! N’ihi na amara m na m bụ nwa nke Chineke. Ma a na m akpọku Chineke m mgbe niile maka enyem aka.”

Onye-iro ahụ, kosiladị, anaghị eji ike ahapụ ebumnobi mbibi ya idughie na iweda anyị ala. N’ezie o meghị otu ahụ n’ebe Mosis nọ, kama ọ chọrọ ime ya echefuo onye ọ bụ mgbe ebighi ebi.

Dịka ọ n’ekwu okwu ụmụaka, “Setan jiri oke olu tie mkpu, ma na-ekwugharị n’ụzọ dị egwu n’elu ụwa, ma nye iwu, na-asị: abụ m Onye ahụ Amụrụ nanị ya, sekpuoro m.”8

Ka anyị tulee. Ị nụrụ ihe o kwuru ugbua? Abụ m Onye ahụ Amụrụ nanị ya. Sekpuoro m!”

Nnukwu onye ndughie ahụ kwuru, n’ezie, “Esogbula; a gaghị m emeru gị ahụ—abụghị m skonku; a bụ m nnọọ otu nwa pusi nwere agba ojii na ọcha n’ahụ ya.”

Foto, oyiyi
Mosis n’achụpụ Setan

Mosis mesịrị kpọkuo Chineke ma nata ume Ya dị nsọ. Ọbụna na onye ndughie ahụ mara jijiji ma elu ụwa akụjaa, Mosis ekweghị. Olu ya kwụsịrị ike ma kwe nghọta. “Site n’ime m pụọ, Setan,” ka o kwupụtara, “n’ihi na otu Chineke nkea ka m ga esekpuru nanị ya, onye nke bụ Chineke nke otito.”9

N’ikpeazụ, ọ “pụrụ … site n’ihu Mosis.”10

Mgbe Onye-nwe-anyị bịara ma gọzie Mosis maka nrube isi ya, Onye-nwe-anyị kwuru sị:

“Ngọzi dịrị gị, Mosis, n’ihi … a ga-eme gị adị ike karịa ọtụtụ mmiri. …

“Na hụrụ, anonyeere m gị, ọbụna ruo na ọgwụgwụ nke ụbọchị gị niile.”11

Ekweghịekwe Mosis nye onye-iro ahụ bụ ọmụmatụ pụtara ihé na nke doro anya nye onye ọbụla n’ime anyị, n’agbanyeghị ebe anyị nọ na ndụ. Ọ bụ ozi dị ike nye gị onwe gị—ịmara ihe ị ga-eme mgbe ọ nwara idughie gị. Nye gị, dịka Mosis, ka ejiworo onyinye nke enyem aka eluigwe gọzie.

Iwu nsọ niile na Ngọzi niile

Kedụ otu ị ga-esi chọta enyem aka nkea si eluigwe, ọbụna dịka Mosis mere, ma na-abụghị idughie gị ma ọ bụ daba n’ime ọnwụnwa? Ụzọ dị mfe maka enyem aka dị nsọ ka enyeghachịrị nọgbọ nkea site naka Onye-nwe-anyị nOnwe Ya mgbe O kwupụtara: “Ya mere, Mụ Onye-nwe, ebe m maara ọdachi ga-adakwasị mmadụ nile bi n’ime ụwa, kpọrọ odibo m Joseph Smith, Nta, ma gwa ya okwu site n’elu-igwe, ma nyekwa ya iwu-nsọ nile.”12 Jiri okwu ndi dị mfe nghọta, anyị nwere ike wee kwuo sị na Onye-nwe-anyị, onye maara njedebe site na mbido,”13 maara ihe niile siri ike pụrụiche nke ụbọchị anyị. Ya mere, Ọ wetewo ụzọ esi eguzogide aka mgba niile na ọnwụnwa niile, ọtụtụ nke na-abịa dịka nsonazụ ya nke mmetụta aghụghọ nke onye-iro ahụ na agha ya niile.

Ụzọ ahụ dị mfe. Site n’aka ndi odibo Ya, Chineke na-agwa anyị okwu, ụmụ Ya, ma na-enye anyị iwu nsọ. Anyị nwere ike kwugharịa nkeji ahụ m kwupụtaworo ugbua ikwu, “Mụ Onye-nwe-anyị, … akpọwo onye odibo [Onye-isi Russell M. Nelson], ma site n’igwe kwusara ya okwu, ma nye ya iwu nsọ.” Ọ bụ na nke ahụ abụghị eziokwu dị ebube?

A na m agba aka-ebe ziri ezi na Onye-nwe-anyị n’eziokwu sitere n’igwe kwusara Josef Smit okwu, nke bidoro na Ọhụụ nke Mbụ dị ebube. O na-ekwusakwara Onye-isi Nelson n’oge nke anyị. A na m agba-ama na Chineke n’ekwusara ndi amụma okwu n’oge gara aga ma nye ha iwu nsọ ahaziri idu ụmụ Ya ruo ańụrị n’ime ndu nkea na mbuli na nke na-abịa.

Chineke na-aga n’ihu inye ndi amụma anyị dị ndụ iwu nsọ taa. Ọmụmatụ juru eju—ndụmọdụ oziọma zuruoke Nzukọ nsọ kwadoro dabere n’ebe obibi karịa; iji ije-ozi nlekọta gbanwe nkuzi nleta na nkuzi ebe obibi; mbelata nye usoro niile na emume nsọ niile nke tempụl; na mmụta ọhụrụ nke Ụmụaka na Ndi Ntoroọbịa. Ịma mma na ọmịiko nke Nna nke Eluigwe nwere ịhụnanya na atụ m n’anya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, onye weghachitere Nzukọ nsọ nke Onye-nzọpụta n’elu ụwa ọzọ ma akpọwo onye amụma n’ụbọchị anyị. Mweghachite ahụ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’akagbu oge dị nnukwu egwu jiri uju nke oge.

Ajọọ-omume Adịghị Mgbe Ọ Bụ Ańụrị

Nrube isi nye iwu nsọ niile enyere ndi amụma anyị bụ ọtụghe na-abụghị nanị n’izere mmetụta onye ndughịe ahụ nakwa inwe nhumihe nke ọńụ na ańụrị na anọgide. Usoro nkea dị nsọ dị mfe: eziomume, ma ọbụ nrube isi nye iwu nsọ niile, n’ewete ngọzi, ma ngọzi n’ewete ańụrị, ma ọbụ ọńụ, n’ime ndụ anyị.

Kosiladị, n’otu ụzọ ahụ nke onye-iro ahụ nwara idughie Mosis, ọ na-achọ ịghọgbụ anyị. Mgbe niile ka ọ na-aghọ aghụghọ ị bụ ihe ọ bụghị. Ọ na-achọ mgbe niile izo onye ọ bụ n’ezie. Ọ na-ekwusike na nrube isi ga-eme ndụ gị agaghị aba ụrụ na kwa na ọ ga-anapụ gị ańụrị.

I nwere ike chee maka ụfọdụ okwu aghụghọ ya idughie? N’ịmatụ, ọ n’agbanwe nsonazu mbibi nke ọgwụ iwu megidere ma ọbụ ịńụ mmanya ma kama n’atụpụta na ọ ga ewete obi ụtọ. Ọ n’emikpu anyị n’ime ururu ihe dị iche iche dị njọ nwere ike ịnọ n’ime sochial media, tinyekọta ime ntulerita na echiche obi adị mfe. Na mgbakwunye, ọ n’ezo ihe ndi ọzọ dị njọ, n’emerụ mmadụ dị nime intanet, dịka nzi akwụna, mbuso agha nye ndi ọzọ site n’imegbu mmadụ na intanet, na itinye ozi ụgha na-akpata obi abụọ na egwu n’ime obi na mụọ niile. N’iji aghụghọ ọ n’agbaizu, “Nanị soro m, ma ị ga-enwerịrị ańụrị.”

Okwu ndi edere ọtụtụ narị afọ n’aka otu onye-amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn kachasị dịrị mkpa n’ụbọchị anyị: “Ajọọ-omume adịghị mgbe ọ bụ ańụrị.”14 Ka anyị wee nwee ike mata aghụghọ niile nke Setan otu ha dị. Ka anyị wee nwee ike merie ma hụta site n’okwu ụgha niile na mmetụta niile nke onye na-achọ ibibi mkpụrụ obi anyị ma dupụ anyị site n’ọńụ ugbua na mbuli n’ọdịnihu.

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, anyị ga agarịrị n’ihu inwe okwukwe na nlezi anya, n’ihi otu ahụ bụ nanị ụzọ eji amata eziokwu na ịnụta olu nke Onye-nwe-anyị site n’aka ndi odibo Ya. “N’ihi na MụọNsọ ahụ na-ekwu ezi-okwu ma ọdịghị ekwu okwu ụgha. … Ihe ndia ka egosiri n’ihu anyị n’ọdịdị ya, maka nzọpụta nke mkpụrụ obi anyị. … N’ihi na Chineke kwukwara ha nye ndị-amụma mgbe ochie.”15 Anyị bụ Ndi Nsọ nke Chineke Kacha Elu, olile anya nke Izrel! Ị ga-ada mba? Anyị ga-ada mba ma ọ bụ ghara ọgụ ahụ? Mba! … Nye iwu nke Chineke, mụọ, obi, na aka, n’okwukwe na eziokwu anyị ga-eguzo mgbe niile.”16

A na m agba aka ebe m maka Onye Nsọ nke Izrelọbụna aha nke Jizọs Kraịst. A na m agba ama maka ịhụnanya Ya n’anọgide, eziokwu, na ọńụ ndi nke emeworo ya adị ire site n’aja Ya n’enweghị ọgwụgwụ ma dị ebighị ebi. Dịka anyị n’erube isi nye Iwu nsọ Ya niile, a ga eduba anyị mgbe niile n’ụzọ nke ziri ezi ma agaghị edughekwa anyị. Site na aha di nsọ nke Onye-Nzọpụta anyị, Jizọs Karist, amen.