2010–2019
Site n’Igwe ojii na Anyanwụ, Onye-nwe M, Nọnyere M!
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Site n’Igwe ojii na Anyanwụ, Onye-nwe M, Nọnyere M!

A na m agba ama na “site n’igwe ojii na anyanwụ Onye-nwe-anyị ga-anọnyere anyị, ka e [nwee ike] kpugide mkpagbu anyị niile n’ime ọńụ nke Kraịst.”

Otu n’ime ọmarịcha abụ anyị gosipụtara arịrịọ ahụ “Site n’Igwe ojii na Anyanwụ, Onye-nwe M, Nọnyere M!”1 Otu mgbe a nọbụụrụ m n’ime ụgbọelu dịka ọ zutere oké mmiri ozuzo. Ilepụ anya site na windo, ahụtara m mkpumkpu igwe ojii n’okpuru anyị. Ụzarị ọkụ nke anyanwụ na-apụta chapụtara n’igwe ojii ahụ, na-eme ha na-amuke n’ụcha dị egwu. Na nso, ụgbọelu ahụ gbadara site na nnukwu igwe ojii ahụ, ma ọchịchịrị dị egwu kpuchitere anyị na ntabi anya nke kpuru anyị ishi kpamkpam site n’ihé nke anyị hụworo nanị nwa oge gara aga.2

Foto, oyiyi
Ụcha anyanwụ napụta
Foto, oyiyi
Igwe-ojii Ojii

Igwe ojii nwekwara ike pụta n’ime ndụ anyị niile, nke nwere ike ikpu anyị ishi site n’ihé nke Chineke ma ọbụna mee anyị ajụọ ajụjụ ma ihé ahụ ọ dị ire maka anyị ọzọ. Ụfọdụ n’ime igwe ojii ndi ahụ bụ nke ịda mba, nchegbu, na ụdị mkpagbu nke uche na mmetụta. Ha nwere ike gbanwee otu anyị si ahụta onwe anyị, ndi ọzọ, na ọbụna Chineke. Ha na-emetụta ndi nwanyị na ndi nwoke gbara afọ ọbụla n’ime akụkụ ụwa niile.

N’otu aka ahụ mmebisi bụ enweghị uche nke ekweghị ekwe nke nwere ike imetụ ndi ọzọ ndi n’enwetebeghị nhumihe aka mgba ndia. Dịka akụkụ ọbụla nke anụ ahụ, ụbụrụ-isi nwere ike ịdaba na nrịanrịa, mmerụ, na ezughị oke nke ụmụ ihe. Mgbe uche anyị na-ata ahụhụ, ọ dị mma ịchọta ike site n’aka Chineke, site n’aka ndi gbara anyị gburugburu, na site n’aka ndi ọkachamara ọgwụ na ahụike nke uche.

“Ndi mmadụ niile—nwoke na nwanyi—ka e kere n’oyiyi nke Chineke. Nke ọbụla bụ nwa nwoke ma-ọbụ nwa nwanyị mụọ a hụrụn’anya nke nne na nna nke elu-igwe, ma … nke ọbụla nwere ụdị okike dị nsọ na-ebe nketa.”3 Dịka ndi Nne na nna anyị nke Eluigwe na Onye-Nzọpụta anyị, anyị nwere anụ ahụ4 ma n’enwete mmetụ nke obi.5

Ezi ụmụnne m ndi nwanyị, ọ bụ eziokwu na otu mgbe anyị n’enwe nwute ma ọbụ nchekasị. Ịdị nwute na nchegbu bụ mmetụ n’eme na ndụ nke mmadụ.6 Otuosiladị, ọbụrụ na anyị nọ na nwute mgbe niile na ọbụrụ na mgbu anyị kpuchịrị ike anyị inwete mmetụta ịhụnanya nke Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya na mmetụ nke Mụọ Nsọ, mgbe ahụ anyị nwere ike na-ata ahụhụ nke ịda mba, nchegbu, ma ọbụ ọnọdụ mmetụ-obi ọzọ.

Nwa m nwanyị n’otu mgbe dere: “Enwere otu mgbe … [Mgbe] m nọọrọ na nnukwu nwute oge dum niile. E chere m mgbe niile na ịdị nwute bụụrụ ihe ime ihere, nakwa na ọ bụ iriba ama nke adịghị ike. Ya mere agwaghị onye ọbụla. … Abịara m chee na m abaghị uru ma ọlị.”7

Otu enyi kọwara ya n’ụzọ nkea: “Kemgbe m bụ nwata na mbụ, ezutewo m agha oge niile inwe mmetụta nke enweghị olile anya, ọchịchịrị, owu, na ịtụ egwu na inwe uche na m adawo ma ọbụ nkwarụ. E mere m ihe niile izokpu mgbu m na egosighị ma ọlị na e nwere ihe ọzọ ma ọbụghị ịganihu na ịdị ike.”8

Ezi ndi enyi m, o nwere ike ime onye ọbụla n’ime anyị—kachasị, dịka ndi kwere ekwe n’ime atụmatụ nke ańụrị, anyị n’etinye ibu n’ekwesịghị n’isi onwe anyị site n’iche na anyị kwesịrị izuoke ugbua. Ụdị echiche ndia nwere ike n’eju anya. Inwete izuoke bụ usoro nke ga-aga n’ihu na ndụ anụ ahụ ma gafee—ma nanị site n’amara nke Jizọs Kraịst.9

N’idi iche, mgbe anyị kwupụtara gbasara aka mgba nke uche anyị, kwere na anyị ezughị oke, anyị n’enye ndi ọzọ ikike ikwupụta ndọli nke ha. Anyị na-abịa matakọrịta na enwere olile anya ma anyị ekwesịghị ịta ahụhụ naanị anyị.10

Foto, oyiyi
Olile anya n’ime Ọbịbịa nke Abụọ

Dịka onye n’eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị emewo ọgbụgba-ndụ anyị na Chineke na anyị “dị na njikere iburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya” na “ịdị na njikere isoro ndị na-eru uju iru uju.”11 Nkea nwere ike ịgụnye mmatazi gbasara ọrịa mmetụ obi, ịchọta owuwe nke nwere ike inye aka metazie mgba ndia, ma n’ikpeazụ kpọbata onwe anyị na ndi ọzọ n’ime Kraịst, onye bụ Nna Ukwu Ọgwọ-ọrịa.12 Ọbụrụgodi na anyị amaghị otu esi enye nkọwa n’ihe ndi ọzọ n’agabiga, ime ka amata na mgbu ha dị ire nwere ike bụrụ otu ụzọ dị mkpa nke ịchọta nghọta na ọgwụgwọ.13

N’ime ụfọdụ ọnọdụ, ihe n’akpata ịda mba ma ọbụ nchegbu ka e nwere ike ịmata, ebe oge ndi ọzọ o nwere ike raa ahụ karịa ịmata.14 Ụbụrụ anyị nwere ike taa ahụhụ n’ihi ndọlị15 ma ọbụ ike ọgwụgwụ kwa mgbe kwa mgbe,16 nke e nwere ike mgbe ụfọdụ metazie site n’ịhazigharị nri, ụra, na mgbatịahụ. Oge ụfọdụ, terapi ma ọbụ ọgwụ n’okpuru ntụzi aka nke ndi ọkachamara azuru azu ka e nwekwara ike ịchọ.

Ọrịa ụbụrụ-isi ma ọbụ ọrịa mmetụ obi ana agwọghị agwọ nwere ike duba ịnọ nanị mgbe niile, nghọtaghe, adịnamma mebiri emebi, mmerụ-ahụ onwe, nakwa igbu onwe. A ma m nkea n’onwe m, dịka nna m nwụrụ site n’igbu onwe ya ọtụtụ afọ gara aga. Ọnwụ ya wụrụ mụ na ezinaụlọ anyị akpata oyi na mgbawa obi. Egbuwo m ọtụtụ afọ ime ihe gbasara iru uju m, ma nanị na nso nso a ka m mụtara na ikwu gbasara igbu-onwe n’ụzọ kacha mma n’ezie n’enye aka gbochie ya kama ikwado ya.17 Ugbua ekwuwo m maka ọnwụ nna m mụ na ụmụ m ma hụta ọgwụgwọ nke Onye-Nzọpụta nwere ike inye ndi dị ndụ na ndi nwụrụ anwụ.18

Na mwute, ọtụtụ ndi n’ata ahụhụ site n’ịda mba siri ike n’ewezuga onwe ha site n’etiti ndi Nsọ ibe ha n’ihi ha n’eche na ha adabaghị n’ọnọdụ ahụghị n’anya. Anyị nwere ike nyere ha aka mata ma chee na ha n’ezie sonyere anyị. Ọ dị mkpa ịmata na ịda mba abụghị n’ihi adịghị ike, m’ọbụ mgbe niile n’ihi njọ.19 Ọ “na-amụba na nzuzo ma belata na mmetụta ọmịiko.”20 Ịdị n’otu, anyị nwere ike nwe mmeri site n’igwe ojii nke nnọọrọ onwe na ihere ka ebulie ibu nke ihere ma ọrụ ebube nke ọgwụgwọ nwee ike mee.

N’oge ndụ anụ ahụ Ya, Jizọs Kraịst gwọrọ ndi ọrịa na ndi ihe metụrụ, m ana onye ọbụla gosipụtara okwukwe na Ya ma kpaa agwa ịnata ọgwụgwọ Ya. Ụfọdụ gara ije ogologo, ndi ọzọ gbatịrị aka ha ịmetụ akwa Ya, ma ndi ọzọ ka eji ihe bugara Ya iji nwee ike nata ọgwụgwọ.21 Mgbe oge ọgwụgwọ ruru, ọ bụ na anyị niile achọghị Ya eleghị anya n’azụ? “Ọ bụ na anyị niile abụghi ndi arịrịọ?”22

Ka anyị soro ụzọ nke Onye-Nzọpụta ma melite ọmịiko anyị, belata ọchịchọ ikpe ikpe, ma kwụsị ịbụ ndi nnyocha nke ibi ndụ ime mụọ nke ndi ọzọ. Ige ntị site n’ịhụnanya bụ otu onyinye kacha ukwuu anyị nwere ike inye, ma o nwere ike dịrị anyị mfe iburu ma ọbụ bulie igwe ojii dị ukwuu nke n’atọgbu ndi anyị hụrụ n’anya na ndi enyi anyị22 ya mere na, site n’ịhụnanya, ọzọkwa ha nwere ike nwete mmetụta Mụọ Nsọ ma hụta ihé nke n’esi na Jizọs Kraịst apụta.

Ọ bụrụ na mgbe niile “ịgịrịgị ọchịchịrị” kpuchịrị gị,24 chewe ihu na Nna nke Eluigwe. E nweghị ihe metụworo gị g’enwe ike gbanwe eziokwu nke ebighị ebi na gị bụ nwa Ya ma na Ọ hụrụ gị n’anya.25 Chetakwa na Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta gị, ma Chineke bụ Nna gị. Ha ghọtara. Buru n’uche na Ha nọ nso, n’ege ntị ma enye nkwado.26 “[Ha] ga enye nkasị obi n’ime mkpagbu unu.”27 Mee ihe niile i nwere ike, ma tụkwasị obi n’amara mgbapụta nke Onye-nwe-anyị.

Ndọlị gị egosịghị onye ị bụ, kama ha nwere ike mezie gị.28 N’ihi “ogwu dị n’ime anụ ahụ,”29 i nwere ike nwee ikike nke mmetụta ọmịiko karịa nye ndi ọzọ. Dịka Mụọ Nsọ si duo, kekọrịta akụkọ gị iji nwe ike “lekọta ndị n’adịghị ike, welite aka ndị ahụ rudara ala, ma mee ka ikpere nile ndị n’adịghị ike ka ha guzozie.”30

Maka ndi n’ime anyị oge ugbua ka na adọlị m’ọbụ na-akwado otu onye na-adọlị, ka anyị dị njikere isoro iwu-nsọ nke Chineke ka anyị wee mgbe niile nwee Mụọ Ya ịnọnyere anyị.31 Ka anyị mee “ihe ndi dị ntakịrị ma dị mfe”32 nke ga enye anyị ike ime mụọ. Dịka Onye-isi Russell M. Nelson kwuru, “Enweghị ihe n’emepe eluigwe dịka nnọọ otu ngwakọta ịdị ụcha mụbara amụba, nrube isi kpọm kwem, ọchịchọ ziri ezi, ịgụ okwu nke Kraịst dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn kwa ụbọchị, na oge niile ekpebiri ịga tempụl na ọrụ akụkọ ezinụlọ.”33

Foto, oyiyi
Onye-nzọpụta n’agwọ ọrịa

Ka anyị niile cheta na Onye-Nzọpụta, Jizọs Kraịst, “[ebukwasịwo] onwe ya adịghị ike [anyị] niile, ka afọ ya niile wee jupụta n’ebere, dịka n’anụ arụ, ka o wee mata … otu ọ ga-esi nyere [anyị] aka dịka adịghị ike [anyị] niile siri dị.”34 Ọ bịara “imetazi ndi obi gbawara, … Ikasi ndi niile n’eru uju obi; … inye ha ịma mma nke ntụ, mmanụ nke ọńụ maka iru uju, uwe nke otito n’ihi mụọ nke ịdị arụ.”35

Foto, oyiyi
Ọbịbịa nke Abụọ

A na m agba ama na “site n’igwe ojii na anyanwụ” Onye-nwe-anyị ga anọnyere anyị, ka mkpagbu anyị niile nwee ike daba n’ime ọńụ nke Kraịst,”36 ma “ọ bụ site na-amara ka esi wee zọpụta anyị, emesịa n’ihe niile anyị nwere ike mee.”37 A na m agba ama na Jizọs Kraịst ga alọghachi n’ime ụwa “jiri ọgwụgwọ n’ime nku ya.”38 N’ikpeazụ, Ọ “ga-asapụ anya mmiri niile site n’anya [anyị]; ma agaghị enwe ọzọ … iru uju”39 N’ihi ndi niile ga “abịakwute Kraịst ma tozuo oke n’ime ya,”40 anyanwụ ahụ agaghịkwa ma oli agbada … n’ihi na Onye-nwe-anyị ga abụ ihé [anyị] mgbe niile na-adịgide, ma ụbọchị [anyị] nke iru-uju ga-abịa na njedebe.”41 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. “Nọnyere M!” Abụ, no. 166.

  2. Mgbe anyị nọọrọ n’elu igwe ojii ahụ, anyị enweghị ike ịhụta ọchịchịrị nọ nanị fiit ole ma ole n’okpuru anyị, ma mgbe ọchịchịrị nke nọ n’okpuru kpugidere anyị, o siri ike ịhụta mmuke nke anyanwụ nwuru nanị fiit ole ma ole n’elu anyị.

  3. Ezi-na-ụlọ ahụ: Ịma-ọkwa nye Ụwa,” Liahona, Mee 2017, 145.

  4. “Ma mụọ na anụ ahụ bụ mkpụrụ-obi nke mmadụ” (Doctrine and Covenants 88:15). “Anụ ahụ gị bụ tempụl nke mụọ gị. Ma otu i si jiri ahụ gị mee ihe n’emetụta mụọ gị” (Russell M. Nelson, “Mkpebi maka Ebigh ebi,” Liahona, Nov. 2013, 107).

  5. Lee maka ọmụmatụ, Aịzaịah 65:19; Luk 7:13; 3 Nifaị 17:6–7; Moses 7:28. Ịmụ ihe ịmata ma kwanye ugwu nye mmetụta obi anyị nwere ike nyere anyị aka tinye ha n’ọrụ n’ụzọ dị mma ịdịrịzi karịa dịka Onye-Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst.

  6. See “Mwute na Ịda mba,” kidshealth.org/en/kids/depression.html.

  7. Hermana Elena Aburto blog, hermanaelenaaburto.blogspot.com/2015/08. O dekwara:

    “Ọnwụnwa ahụ nyere m ohere inwe ezi okwukwe n’atụmatụ nke nzọpụta ahụ. N’ihi na amaara m na Nna nke Eluigwe hụrụ m n’anya, ma na O nwere atụmatụ nanị maka m, nakwa na Kraịst ghọtara n’ezie ihe m n’agabiga”.

    “Chineke anaghị emenye gị ihere mgbe ị n’amaghị otu ihe. Ọ na-amasị Ya inyere gị aka tolite ma chegharịa. Ọ naghị ele anya na gị ga-emezi ihe niile n’otu mgbe. I kwesighị ime nkea nanị gị” (iwillhealthee.blogspot.com/2018/09

  8. Nzikọrịta-ozi nke onwe O dekwara: ude ọgwụgwọ nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Onye-Nzọpụta abụrụworii ụzọ nke udo na mgbaba mgbe niile nke njem niile. Mgbe ọ dị m ka m na-adọlị nanị m, a na-echetere m na Ya agabigaworii ụdị ihe m na-agabiga n’ihi m. E nwere ọtụtụ olile-anya n’ịmata na anụ ahụ ọdịnihu m zuru oke, biliteworo n’ọnwụ agaghị arịa ọrịa site na [mkpagbu] nke anụ ahụ nkea.”

  9. Lee Russell M. Nelson, “Perfection Pending,,” Ensign, Nov. 1995, 86–88; Jeffrey R. Holland, “Be Ye Therefore Perfect—Eventually,,” Liahona, Nov. 2017, 40–42; J. Devn Cornish, “Am I Good Enough? A ga m Eru Ya?Liahona, Nov. 2016, 32–34; Cecil O. Samuelson, “Kedụ Ihe Ọ Pụtara Izuoke?New Era, Jan. 2006, 10–13.

  10. Ọ dị mkpa ikwu gbasara isi-okwu ndia anyị na ụmụ anyị, ndi ezinaụlọ, na ndi enyi n’ime n’ebe obibi anyị, ngalaba ukwu, na obodo anyị.

  11. Mosaịa 18:8–9.

  12. Lee Russell M. Nelson, “Jizọs Kraịst—Nna Ukwu Ọgwọ Ọrịa,,” Liahona, Nov. 2005, 85–88; Carole M. Stephens, “Nna Ukwu Ọgwọ Ọrịa,” Liahona, Nov. 2016, 9–12.

  13. Ịmata otu esi amata ihe iriba ama na nzipụta n’onwe anyị na ndi ọzọ nwere ike inye aka nke ukwu. Anyị nwekwara ike mụọ otu esi amata usoro iche echiche n’adabaghị na nke n’adịghị mma n’ahụ na otu esi eji ndi dabara na ndi dị mma n’ahụ edochi ha.

  14. Ịda mba nwekwara ike pụta ihé site na mgbanwe dị mma n’ime ndụ—dịka ọmụmụ nwa ma ọbụ ọrụ ọhụrụ—ma o nwere ike ime mgbe ihe dị mma n’ime ndụ nke mmadụ.

  15. Lee “Understanding Stress,” Adjusting to Missionary Life (2013), 5–10.

  16. Lee Jeffrey R. Holland, “Like a Broken Vessel,” Liahona, Nov. 2013, 40.

  17. Lee Dale G. Renlund, “Understanding Suicide” (video), ChurchofJesusChrist.org; “Talking about Suicide” (video), ChurchofJesusChrist.org; Kenishi Shimokawa, “Understanding Suicide: Warning Signs and Prevention,Liahona, Oct. 2016, 35–39.

  18. “Mbido nke ọgwụgwọ na-achọ okwukwe dịka nke nwata n’ime eziokwu na Nna bi n’Igwe hụrụ gị n’anya ma ewepụtawo ụzọ esi agwọ. Ọkpara Ya Ahụrụ n’anya, Jizọs Kraịst, tọgboro ndụ Ya iwete ọgwụgwọ ahụ. Kama enweghị ngwọta aghụghọ dị, enweghị ude dị mfe iji wete ọgwụgwọ, ma ọ bụ n’enwere ụzọ dị mfe ruo ọgwụgwọ zuru ezu. Ọgwụgwọ ahụ na-achọ okwukwe siri ike n’ime Jizọs Kraịst na n’ime ike Ya n’enweghị ọgwụgwụ agwọ ọrịa” (Richard G. Scott, “To Heal the Shattering Consequences of Abuse,” Liahona, Mee 2008, 42). Mgbe e nwere nsogbu, ihe nanụ anyị ọkụ n’obi bụ imetazi ya. Otu osiladị, anyị agaghị abụrụzi ndi mmetazi nke onwe anyị ma ọ bụ nke ndi ọzọ. Anyị ekwesịghị eme ihe niile n’onwe anyị. N’ime ihe karịrị otu mgbe n’ime ndu, a gakwuruwo m therapist inyere m aka n’oge ihe isi ike m niile.

  19. Lee Jọn 9:1–7.

  20. Jane Clayson Johnson Silent Souls Weeping (2018), 197.

  21. Lee Matiu 9:2–7, 20–22; 14:35–36; Mak 1:40–42; 2:3–5; 3 Nifaị 17:6–7.

  22. Mosaịa 4:19; lee kwa Jeffrey R. Holland, “Ọ Bụ Na Anyị Niile Abụghị Ndi Arịrịọ?Liahona, Nov. 2014, 40–42.

  23. See Romans 2:19; 13:12; lee kwa Jeffrey R. Holland, “Bịakwute M” (Brigham Young University devotional, Mar. 2, 1997), speeches.byu.edu.

  24. 1 Nifaị 8:23; lee kwa 1 Nephi 12:4, 17; 3 Nifaị 8:22.

  25. Lee Psalm 82:6; Ndi Rom 8:16–18; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 24:1; 76:24; Moses 1:1–39.

  26. Lee Nọgharịa na Ndụ Mgbasa Ozi ọma, 20; leekwa Maịka 7:8; Matiu 4:16; Luk 1:78–79; Jọn 8:12.

  27. Jacob 3:1; lee kwa Ndi Efesus 5:8; Ndi Kolos 1:10–14; Mosaia 24:13–14; Alma 38:5. Gụọ ngọzi onye-isi-ezinụlọ gị ma ọbụ rịọ maka ngọzi nke ọkwa-nchụ-aja ka i wee nwe ike hụta ma cheta otu Nna nke Eluigwe sị hụ gị n’anya ma na-achọ ịgọzi gị.

  28. Lee 2 Ndi Kọrịnt 4:16–18; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:7–8, 33; 122:5–9.

  29. 2 Ndi Kọrịnt 12:7.

  30. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 81:5; lee kwa Aịzaịa 35:3.

  31. Lee Moronaị 4:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.

  32. Alma 37:6.

  33. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Mee 2018, 95.

  34. Alma 7:12; lee kwa Aịzaịa 53:4; 2 Nifaị 9:21; Mosaia 14:4.

  35. Aịzaịa 61:1–3; lee kwa Luk 4:18.

  36. Alma 31:38; lee kwa Alma 32:43; 33:23.

  37. 2 Nifaị 25:23.

  38. Malakai 4:2; 3 Nifaị 25:2.

  39. Mkpughe 21:4.

  40. Moronaị 10:32.

  41. Aịzaịa 60:20.