Akwụkwọ nsọ
Ita 3


Isi 3

Nwanne-nwoke nke Jared wee hụ mkpịsị-aka nke Onye-nwe ka ọ na-emetụ okwute iri na isii aka—Kraịst wee gosị nwanne-nwoke nke Jared arụ mụọ ya—ndị nke nwere mmata ihe zuru-oke agaghị egbochi ha site nʼime akwa mgbochị ahụ—Ndị na-asụgharị asụsụ ka a kwadobere ha iwepụta akụkọ-ndekọta ndị Jared nʼìhè.

1 Ma o wee ruo na nwanne-nwoke nke Jared, (ugbua ọnụ-ọgụgụ nke ụgbọ nile ahụ a kwadoworo di asatọ) garuru nʼugwu ahụ, nke ha kpọrọ ugwu Shilem, n’ihi ogologo ya nke karịrị akarị, ma gbazepụta site na nkume ntakịrị okwute iri na isii; ma ha dịịrị ọcha ma pụta ìhè, ọbụna dịka enyo na-ahụ-ụzọ; ma o buuru ha nʼaka ya abụọ nʼelu ugwu ahụ, ma kpọkuo Onye-nwe ọzọ, na-asị:

2 O Onye-nwe, i sịwo na ide-mmiri ga agba anyị gburu-gburu. Ugbua lee, O Onye-nwe, ma ewesola nwa-oru gị iwe n’ihi adịghị ike ya nʼiru gị; n’ihi na anyị matara na ị dị nsọ ma biri nʼelu-igwe nile, ma na anyị ezughị-oke nʼiru gị; n’ihi aọdịda, bụdị-okike anyị nile abụrụwo ihe ọjọọ esepụghị-aka; otu o sila dị, O Onye-nwe, inyewo anyị iwu-nsọ na anyị ga-akpọkurịrị gị, na site nʼaka gị anyị ga-anata dịka ọchịchọ anyị nile siri dị.

3 Lee, O Onye-nwe, i tiwo anyị ihe otiti n’ihi ajọọ-omume anyị, ma i dugharịwo anyị, na nʼime ọtụtụ afọ nile ndị a anyị anọwo nʼime ọzara; otu o sila dị, ị nọ ana-emere anyị ebere. O Onye-nwe, lekwasị m anya nʼobi ebere, ma wepụ iwe gị site nʼebe ndị nke gị a nọ, ma ekwelaa na ha ga-aga nʼiru gafee omimi oke-iwe nke a nʼọchịchịrị; kama lee ihe ndị a nke m gbazepụtaworo site na nkume ahụ.

4 Ma amatara m, O Onye-nwe, na ị nwere aịke nile, ma ị ga-eme ihe ọbụla ịchọrọ maka ọ dị-mma nke mmadụ; ya mere metụ okwute ndị a aka, O Onye-nwe, jiri mkpịsị-aka gị, ma kwado ha ka ha wee nye ìhè nʼọchịchịrị; ma ha ga na-enye anyị ìhè nʼụgbọ nile ahụ nke anyị kwadoworo, ka anyị wee nwe ìhè mgbe anyị ga na-agafe oke osimiri ahụ.

5 Lee, O Onye-nwe, ị nwere ike ime nke a. Anyị matara na i nwere ike igosịpụta nnukwu ike, nke adị ntakịrị nʼile-anya nye nghọta nke mmadụ.

6 Ma o wee ruo na mgbe nwanne-nwoke nke Jared kwuworo okwu nile ndị a, lee, aOnye-nwe setịpụrụ aka ya ma jiri mkpịsị-aka ya metụ okwute nile ahụ aka nʼotu nʼotu. Ma e wepụrụ bakwa-mgbochi ahụ site nʼanya abụọ nke nwanne-nwoke nke Jared, ma ọ hụrụ mkpịsị-aka nke Onye-nwe; ma ọ dị ka mkpịsị-aka nke mmadụ, dịka nʼanụ-arụ na ọbara; ma nwanne-nwoke nke Jared dara nʼala nʼiru Onye-nwe, n’ihi na egwu jidere ya.

7 Ma Onye-nwe hụrụ na nwanne-nwoke nke Jared adawo nʼala; ma Onye-nwe sịrị ya: Bilie, gịnị mere I jiri daa?

8 Ma o gwara Onye-nwe: Ahụrụ m mkpịsị-aka nke Onye-nwe, ma egwu tụrụ m eleghị-anya ọ ga eti m, n’ihi na amataghị m na Onye-nwe nwere anụ-arụ na ọbara.

9 Ma Onye-nwe sịrị ya: N’ihi okwukwe gị ịhụwo na m ga-ewekwasị onwe m aanụ-arụ na ọbara; ma ọdịbeghị mgbe ọbụla mmadụ jiri ụdị okwukwe karịrị akarị dị otu a bịa nʼiru m dịka ị meworo; n’ihi na ọbụrụ na ọdịghị otu a ị garaghị enwe ike ịhụ mkpịsị-aka m. I hụrụ nke karịrị nke a?

10 Ma o zara: E-e; Onye-nwe, gosị m onwe gị.

11 Ma Onye-nwe sịrị ya: Ị ga-ekwe nʼokwu nile nke m ga-ekwu?

12 Ma ọ zara: E, Onye-nwe, a matara m na i na-ekwu ezi-okwu, n’ihi na ị bụ Chineke nke ezi-okwu, ma ị anweghị ike ikwu okwu ụgha.

13 Ma mgbe o kwuworo okwu nile ndị a, lee, Onye-nwe gosịrị ya aonwe ya, ma sị: bN’ihi na ị matara ihe ndị a agbapụtara gị site nʼọdịda ahụ; ya mere a na-akpọghachị gị nʼime ebe m nọ; ya mere cegosị m gị onwe m.

14 Lee, abụ m onye ahụ a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa aịgbapụta ndị m. Lee, abụ m Jisus Kraịst. Abụ m bNna na Ọkpara ahụ. Nʼime m ka mmadụ nile ga-enwe cndụ, ma nke ahụ ebighi-ebi ọbụna ndị ga-ekwe nʼaha m; ma ha ga-abụ ụmụ m dndị nwoke na ndị nwanyị.

15 Ma ọdịbeghị mgbe ọbụla m gosịrị onwe m nye mmadụ m keworo, n’ihi na ọdịbeghị mgbe mmadụ akwere na m dịka i meworo. I hụwo na e kere gị bnʼoyiyi nke m? E, ọbụna mmadụ nile e kere ha na mmalite nʼoyiyi nke m.

16 Lee, arụ nke a, nke ị na ahụ ugbua, bụ arụ nke amụọ m; ma mmadụ ka m keworo nʼoyiyi nke arụ nke mụọ m; ma ọbụna dịka m gosipụtara gị ịnọ na mụọ ka m ga-egosịpụtara ndị m nʼanụ arụ.

17 Ma ugbua, dịka mụ, Moronaị, kwuru na-agaghị m eme nkọwasị zuru-ezu maka ihe ndị a nke e dere, ya mere o zuworo m ikwu na Jisus gosịrị nwoke nke a onwe ya nʼime mụọ, ọbụna nʼụdị na oyiyi nke otu arụ ahụ ọbụna dịka o agosịrị ndị Nifaị onwe ya.

18 Ma ọ kụziiri ya ọbụna dịka o siri kụziere ndị Nifaị; ma ihe nile a, ka nwoke a wee mata na ọ bụ Chineke, n’ihi ọtụtụ nnukwu ọrụ nile nke Onye-nwe gosịworo ya.

19 Ma n’ihi mmata nke nwoke a enweghị ike idebe ya site nʼịhụ nʼime aakwa-mgbọchị ahụ; ma ọ hụrụ mkpịsị-aka nke Jisus, nke, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼịtụ-egwu; n’ihi na ọ matara na ọ bụ mkpịsị-aka nke Onye-nwe; ma o nweghị kwa okwukwe ọzọ, n’ihi na ọ matara, ọdịghị ihe o nwere obi abụọ.

20 Ya mere, ebe o nwere mmata nke Chineke a zuru-oke, enweghị ike aịwepụ ya site nʼime akwa-mgbọchị ahụ; ya mere ọ hụrụ Jisus; ma ọ kuziiri ya ihe.

21 Ma o wee ruo na Onye-nwe gwara nwanne-nwoke nke Jared: Lee, ị gaghị ekwe ka ihe ndị a nke ị hụworo ma nụ ka ha gaba nʼime ụwa, ruo mgbe aoge ruru na m ga-enye aha m otuto nʼanụ-arụ; ya mere, ị ga-edokwalite ihe ndị nke ị hụworo ma nụ, ma egosịkwala ya onye ọbụla.

22 Ma lee, mgbe unu ga-abịakwute m, ị ga-ede ha ma ị ga-arachilite ha, nke ga-eme na ọdịghị onye ga-enwe ike ịsụgharị asụsụ ha, n’ihi na ị ga-ede ha nʼasụsụ nke a na enweghị ike ịgụ ha.

23 Ma lee, aokwute abụọ ndị a ka m ga-enye gị, ma ị ga arachị kwa ha ha na ihe nile nke ị ga-ede.

24 N’ihi na lee, asụsụ nke i ga-ede agwakọtawo m ya; ya mere aga m eme mgbe oge nke m ruru na okwute ndị a ga-eme ka ihe nile ndị ị ga-ede buo-ibu nʼanya nke ndị mmadụ.

25 Ma mgbe Onye-nwe kwuworo okwu nile ndị a, o gosịrị nwanne-nwoke nke Jared andị nile biworo nʼụwa, na kwa ndị nile ga-ebi; ma o gbochibidoghị ha site nʼanya ya, ọbụna nye nsọtụ nile nke ụwa.

26 N’ihi na ọ gwawo ya nʼoge gara aga, na aọbụrụ na ọ ga e bkwere na ya na ya ga-egosị ya cihe nile—ya ka a ga-egosị ya, ya mere Onye-nwe enweghị ike ijichi ihe ọbụla site n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ matara na Onye-nwe nwere ike igosị ya ihe nile.

27 Ma Onye-nwe sịrị ya: Dee ihe ndị a ma arachilite ha: ma aga m egosị ha ụmụ nke mmadụ mgbe oge nke m ruru.

28 Ma o wee ruo na Onye-nwe nyere ya iwu ka ọ rachilite aokwute abụọ ndị ahụ nke ọ nataworo, ma egosịla ha, ruo mgbe Onye-nwe ga-egosị ha nye ụmụ nke mmadụ.