Akwụkwọ nsọ
Hilaman 4


Isi 4

Ndị nghọtahịe Nifaị na ndị Leman jikọtara ndị-agha nile ma were ala nke Zarahemla—Mmeri a na-emeri ndị Nifaị na-abịa n’ihi ajọọ-omume ha—Nzukọ-nsọ ahụ na-ala azụ, ma ndị ahụ ghọrọ ndị na-adịghị ike dịka ndị Leman. Ihe dịka nʼafọ 38 ruo 30 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri ise na anọ e nwere ọtụtụ nghọtahie na nzukọ-nsọ ahụ, ma e nwekwara andọrọ ndọrọ nʼetiti ndị ahụ, nke mere na e nwere nnukwu nkwafu-ọbara.

2 Ma akụkụ nke ndị nnupụ-isi e gburu ha ma chụpụ ha site nʼala ahụ, ma ha gakwuuru eze nke ndị Leman ahụ.

3 Ma o wee ruo na ha gbara mbọ ịkwalite ndị Leman ịlụ-agha megide ndị Nifaị; mana lee, ndị Leman tụrụ egwu karịa, nke mere na ha achọghị ịn̄a-ntị nʼokwu nile nke ndị nghọtahie ahụ.

4 Mana o wee ruo nʼafọ nke iri ise na isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe, e nwere ndị anghọtahie ndị galitere site na ndị Nifaị gakwuru ndị Leman; ma ha nwetara ihe ha chọrọ ha na ndị ọzọ nʼịkwalite ha nʼiwe iwe megide ndị Nifaị; ma ha nọ nʼafọ ahụ nile na-ejikere maka agha.

5 Ma nʼime afọ nke iri ise na asaa ha gbadatara imegide ndị Nifaị nʼịlụ-agha, ma ha malitere ọrụ nke ọnwụ; e, nke mere na nʼafọ nke iri ise na asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, ha nwetara ihe ha chọrọ na nweta onwunwe nke ala nke Zarahemla; e, na kwa ala ahụ nke dị nso nʼala Uju.

6 Ma ndị Nifaị na ndị-agha nke Moronaịha a chụbara ha ọbụna nʼime ala nke Uju;

7 Ma nʼebe ahụ ha wugidesịrị ike megide ndị Leman, site nʼoke osimiri ọdịda-anyanwụ, ọbụna ruo nʼọwụwa-anyanwụ; ebe ọ bụ njem otu ụbọchị nye onye Nifaị, nʼahịrị ahụ nke ha wugidesịworo ike ma debe ndị-agha ha nile ichekwa mba elu-elu ha.

8 Ma otu a ndị nghọtahịe nke ndị Nifaị ahụ, site nʼinye-aka nke ọtụtụ ọnụ-ọgụgụ ndị-agha nke ndị Leman, enwetawo ihe-onwunwe nke ndị Nifaị nke dị nʼala dị na ndịda-ndịda. Ma ihe nile a, e mere ya nʼafọ nke iri-ise na asatọ na nke iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

9 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe, Moronaịha nwetara ihe ọ na-achọ ya na ndị-agha ya nʼinweta ọtụtụ akụkụ nke ala ahụ; e, ha nwetaghachiri ọtụtụ obodo-ukwu ndị dabaworo nʼaka nke ndị Leman.

10 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri-isii na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe ha nwetara ihe ha na-achọ nʼinweta ọbụna ọkara nke ihe onwunwe ha nile.

11 Ugbua nnukwu ntufu nke ndị Nifaị a, na nnukwu ogbugbu ahụ nke dị nʼetiti ha, agaraghị eme ma ọbụghị n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nke dị nʼetiti ha; e, ma ọ dị nʼetiti ndị ahụ na-ekwupụta kwa ịbụ nke nzukọ-nsọ nke Chineke.

12 Ma ọ bụụrụ n’ihi ampako nke obi ha nile, n’ihi bakụ na ụba ha karịrị akarị, e, ọ bụụrụ n’ihi mmegbu ha na-emegbu cndị ogbenye, na-ejịchi nri ha site nʼirute ndị agụụ na agụ, na-ejịchi uwe-oyiyi site nʼirute ndị gba ọtọ, ma na-eti ụmụnne ha ndị dị umeala ihe na nti, na-eji ihe ahụ dị nsọ eme ihe-ọchị, na-agọnarị mụọ-nke ibu-amụma na nke mkpughe, igbu-mmadụ, ipụnarị-ihe, ikwu okwu ụgha, izu ori, ịkwa-iko, ibilite na nnukwu ndọrọ-ndọrọ nile, na-agbapụ na-aba nʼala nke Nifaị, nʼetiti ndị Leman—

13 Ma n’ihi nnukwu ajọọ-omume ha nke a, na aitu-ọnụ ha nile nʼume nke onwe ha, a hapụrụ ha nʼume nke onwe ha; ya mere ha agaghị nʼiru, kama e nyere ha ntaram-ahụhụ ma nye ha otiti ihe, ma chụghachị ha nʼiru ndị Leman, ruo mgbe ha tufuworo ọfọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ ala nile ha nwere.

14 Mana lee, Mọrọnaiha kwusaara ndị ahụ ozi-ọma maka ọtụtụ ihe n’ihi ajọọ-omume ha, na kwa aNifaị na Lihaị, ndị bụ ụmụ nwoke nke Hilaman, kwusakwaara ndị ahụ ozi-ọma maka ọtụtụ ihe, e, buworo ha amụma ọtụtụ ihe gbasara ajọọ-omume ha nile, na ihe ga-abịakwute ha ma ọ bụrụ na ha echegharịghị site na mmehie ha nile.

15 Ma o wee ruo na ha chegharịrị, ma dịka ha chegharịrị, ha malitere ime nke ọma.

16 N’ihi na mgbe Moronaịha hụrụ na ha chegharịrị, ọ gbalịrị idugharị ha site nʼebe ruo nʼebe, ma site nʼobodo-ukwu ruo nʼobodo-ukwu, ọbụna ruo na ha nwetaghachịrị otu ọkara nke ihe-onwunwe ha na otu ọkara nke ala ha nile.

17 Ma otu a ka afọ nke iri isii na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri gwụchaa.

18 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri isii na abụọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, na Moronaịha enweghị ike inwetaghachị ihe-onwunwe ọzọ site nʼaka ndị Leman.

19 Ya mere ha hapụrụ atụmatụ ha inweta ala nile ndị nke fọdụrụ, n’ihi na ọnụ-ọgụgụ ndị Leman dịirị oke imerime nke mere na o kweghịzi ndị Nifaị omume inweta ike ọzọ karịa ha; ya mere Moronaịha tinyere ndị-agha ya nile nʼọrụ nʼichekwa akụkụ ndị ahụ nile o wereworo.

20 Ma o wee ruo, n’ihi nnukwu nke ọnụ-ọgụgụ nke ndị Leman ndị Nifaị nọọrọ na nnukwu ịtụ-egwu, eleghị-anya ha ga-akarị ha ike, ma zọda, ma gbuo, ma bibie ha.

21 E, ha malitere icheta amụma nile nke Alma, na kwa okwu nile nke Mosaịa; ma ha hụrụ na ha abụwọrịị ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, ma na ha edebewo iwu-nsọ nile nke Chineke ka ihe efu;

22 Ma na ha agbanwewo ma zọgide aiwu nile nke Mosaịa nʼokpuru ụkwụ ha, ma-ọbụ ihe ahụ nke Onye-nwe nyere ya iwu-nsọ inye ndị ahụ; ma ha hụrụ na iwu ha nile emebisịwo ha, ma na ha abụrụwo ndị ajọọ-omume, nke bụ na ha abụrụwo ndị ajọọ-omume ọbụna dịka ndị nke Leman.

23 Ma n’ihi ajọọ-omume ha, nzukọ-nsọ ahụ amalitewọrịị aịla-azụ; ma ha malitere n’ekwenyeghị na mụọ nke ibu-amụma ma na mụọ nke mkpughe; ma ikpe nile nke Chineke lekwasịgidere ha anya nʼiru.

24 Ma ha hụrụ na ha aadịghịzi ike, dịka ụmụnne ha nwoke, ndị Leman, ma na bMụọ nke Onye-nwe anakwaghị echekwa ha; e, o sepụwọrịị aka site nʼarụ ha n’ihi na Mụọ nke Onye-nwe anaghị ebi na ctemple nile na-adịghị nsọ—

25 Ya mere Onye-nwe kwụsịrị ichekwa ha site nʼụzọ ọrụ-ebube ya na ike na-enweghị-atụ, n’ihi na ha adabawo nʼọnọdụ nke aekweghị-ekwe na ajọọ-omume dị-egwu; ma ha hụrụ na ndị Leman dị imerime nʼọnụ-ọgụgụ karịa ha, na ma-ọbụghị na ha bga-adabere n’Onye-nwe Chineke ha, ha ga-alarịrị nʼiyi na-enweghị ihe mgbochi.

26 N’ihi na lee, ha hụrụ na ume nke ndị Leman dị ukwuu dịka ume ha, ọbụna otu nwoke na nwoke ibe ya. Ma otu a ka ha dabaworo nʼime nnukwu njehie nke a; e, otu a ka ha sịworo ghọọ ndị na-adịghị ike, n’ihi njehie ha, nʼoge ana-abụghị ọtụtụ afọ.