Akwụkwọ nsọ
Ita 13


Isi 13

Ita wee kwuo maka Jerusalem ọhụrụ a ga ewu na Amerika site na mkpụrụ-afọ nke Josef—O wee buo-amụma, a chụpụ ya, wee dee akụkọ ndị Jared, ma buo amụma mbibi nke ndị Jared—Ịlụ-agha wee biri ọkụ nʼala ahụ nile.

1 Ma ugbua mụ, Moronaị, na-aga nʼiru idecha akụkọ-ndekọta m gbasara mbibi nke ndị ahụ nke m na-ede maka ha.

2 N’ihi na lee, ha jụrụ okwu nile nke Ita; n’ihi na ọ gwara ha maka ihe nile nʼezi-okwu, site na mmalite nke mmadụ; ma na mgbe mmiri nile ahụ alaghachịworo azụ pụọ site nʼelu ala nke a, ọ ghọrọ ala nke a họọrọ karịa ala ndị ọzọ nile, ala nke Onye-nwe họọrọ; ya mere Onye-nwe ga-achọ ka mmadụ nile ndị bi nʼelu iru ya bjeere ya ozi;

3 Ma na ọ bụụrụ ebe nke aJerusalem ọhụrụ ahụ, nke bga-agbadata site nʼelu-igwe, na ebe mgbaba dị nsọ nke Onye-nwe.

4 Lee, Ita hụrụ ụbọchị nile nke Kraịst, ma o kwuru okwu gbasara otu aJerusalem Ọhụrụ nʼala nke a.

5 Ma o kwukwara gbasara ụlọ nke Israel, na aJerusalem ahụ ebe nke bLihaị ga-esite abịa—mgbe a ga-ebibi ya a ga-ewulite kwa ya ọzọ, cobodo-ukwu dị nsọ nye Onye-nwe; ya mere, ọ gaghị enwe ike ibu Jerusalem ọhụrụ n’ihi na ọ diwo rịị nʼoge mgbe ochie; ma a ga-ewulite kwa ya ọzọ ma bụrụzie obodo-ukwu dị nsọ nke Onye-nwe; ma a ga-ewu ya nye ụlọ nke Israel—

6 Ma na otu aJerusalem Ọhụrụ ka a ga-ewulite nʼelu ala nke a, nye ndị nke fọdụrụ na mkpụrụ-afọ nke bJosef, maka ihe ndị nke e nweworo cụdị ya.

7 N’ihi na dịka Josef kpọdatara nna ya nʼime ala nke aIjipt, ọbụna otu ahụ ọ nwụrụ nʼebe ahụ; ya mere, Onye-nwe kpọpụtara ndị nke fọdụrụ na mkpụrụ-afọ nke Josef site nʼala nke Jerusalem, ka o wee meere mkpụrụ-afọ nke Josef ebere ka ha wee ghara bịla-nʼiyi, ọbụna dịka o siri meere nna nke Josef ebere ka ọ ghara ịla nʼiyi.

8 Ya mere, ndị nke fọdụrụ nʼụlọ nke Josef a ga-ewulite ha nʼelu aala nke a; ma ọ ga-abụ ala nke nketa ha; ma ha ga-ewulite obodo-ukwu dị nsọ nye Onye-nwe, dịka Jerusalem nke ochie ahụ; ma a gaghị bagwakọtakwa ha ọzọ, ruo mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa mgbe ụwa ga-agafe.

9 Ma a ga-enwe aelu-igwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ; ma ha ga-adị ka nke ochie ahụ ma ewezuga na nke ochie agafewo, ma ihe nile adịwo ọhụrụ.

10 Ma mgbe ahụ ka Jerusalem Ọhụrụ ga-abịa; ma ngọzi ga-adịrị ndị ga-ebi nʼime ya, n’ihi na ọ bụ ha ka uwe ha nile dị aọcha site nʼọbara nke Nwa-atụrụ ahụ; ma ha bụ ndị ahụ a gụnyere nʼetiti mkpụrụ-afọ nke Josef ndị nke fọdụrụ, ndị bụ nke ụlọ nke Israel.

11 Ma mgbe ahụ kwa ka Jerusalem nke ochie ahụ ga-abịa; na ndị nile bi nʼime ya, ngọzi na-adịrị ha, n’ihi na a sawo ha nʼọbara nke Nwa-atụrụ ahụ; ma ha bụ ndị ahụ e kpọsasịrị ma akpọkọta ha bata site nʼakụkụ anọ nile nke ụwa, na site na bmba nile ndị dị nʼelu-elu, ma ha bụ ndị nketa nke mmejupụta nke ọgbụgba-ndụ ahụ nke Chineke mere ya na nna ha, cAbraham.

12 Ma mgbe ihe ndị a bịara, ga-eweta na mmezu akwụkwọ-nsọ nke siri, e nwere ndị nke bụụrụ andị mbụ, ndị ga-abụ ndị ikpe-azụ, ma e nwere ndị bụụrụ ndị ikpe-azụ, ndị ga-abụ ndị mbụ.

13 Ma a chọrọ m ide ihe karịa, ma e gbochiri m, mana nnukwu na ịtụ nʼanya ka amụma nile nke Ita dị; ma ha weere ya ka ihe na-adịghị mkpa, ma chụpụ ya; ma o zoro onwe ya nʼime ọgba nke nkume nʼehihie, ma nʼabalị ọ gapụrụ na-ele ihe nile nke ga-abịakwasị ndị ahụ.

14 Ma dịka ọ na-ebi nʼime ọgba nke nkume o mere akụkọ-ndekọta nke a nke fọdụrụ, na-ele mbibi nile nke bịakwasịrị ndị ahụ, nʼabalị.

15 Ma o wee ruo na nʼime otu afọ ahụ nʼime nke a chụpụrụ ya site nʼetiti ndị ahụ a malitere inwe nnukwu ịlụ-agha nʼetiti ndị ahụ, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị bilitere, ndị bụ dike, ma chọọ ibibi Koriantamọ site nʼatụmatụ nzuzo nile nke ajọọ-omume ha, nke e kwuworo maka ya.

16 Ma ugbua Koriantamọ, ebe ọ gbaworo mbọ mmụta, nʼonwe ya, na nka nile nke ịlụ-agha na aghụghọ nile nke ụwa, ya mere o nyere ndị nke chọrọ ibibi ya agha.

17 Mana o chegharịghị, ọbụghị ma ọmarịcha ụmụ-nwoke ya na ụmụ-nwanyị ha chegharịrị; ọbụghị ma ọmarịcha ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị nke Koho ha chegharịrị; ọbụghị ma ọmarịcha ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị nke Korịho ha chegharịrị; ma na mkpirisi, ọdịghị onye ọbụla n’ime ọmarịcha ụmụ nwoke na ụmụ-nwanyị nʼelu iru nke ala ahụ nile nke chegharịrị site na mmehie ha nile.

18 Ya mere, o wee ruo na nʼime afọ nke mbụ nke Ita biri nʼime ọgba nke nkume, e nwere ọtụtụ ndị mmadụ ndị e gburu site na mma-agha nke antụgwa nzuzo nile ndị ahụ, na-alụso Koriantamọ ọgụ ka ha wee nweta ala-eze ahụ.

19 Ma o wee ruo na ụmụ-nwoke nke Koriantamọ lụrụ nnukwu ọgụ ma gbaa nnukwu ọbara.

20 Ma nʼime afọ nke abụọ okwu nke Onye-nwe bịaruru Ita, na ọ ga-eje ma buoro aKoriantamọ amụma na, ọbụrụ na ọ ga-echegharị, na ndị nile ya na ha bi, Onye-nwe ga-enye ya ala-eze ya ma debe ndị ahụ ndụ—

21 Ma ọ dịghị otu ahụ a ga-ebibi ha, na ndị nile ha na ya bi ma ọbụghị ya nʼonwe ya. Ma ọ ga-adị ndụ nanị ka o wee hụ mmejupụta nke amụma nile nke e kwuworo gbasara andị ọzọ na-anata ala ahụ maka ihe nketa ha; ma Koriantamọ kwesịrị ịnata olili site nʼaka ha; ma mkpụrụ-obi ọbụla a ga-ebibi ya ma ewezuga bKoriantamọ.

22 Ma o wee ruo na Koriantamọ echegharịghị, ọbụghị ma ndị ya na ha bi ha chegharịrị, ọbụghị ma ndị ahụ ha chegharịrị; ma ịlụ-agha nile akwụsịghị; ma ha chọrọ igbu Ita, mana ọ gbapụrụ site nʼiru ha ma zoo kwa ọzọ nʼime ọgba nke nkume ahụ.

23 Ma o wee ruo na Shared bilitere, ma o nyekwara Koriantamọ ịlụ-agha; ma o meriri ya, nke mere na nʼafọ nke atọ o wetara ya nʼime ndọkpụ nke agha.

24 Ma ụmụ-nwoke nke Koriantamọ, nʼafọ nke anọ, meriri Shared, ma nweta kwa ala-eze ahụ ọzọ nye nna ha.

25 Ugbua a malitere inwe ịlụ-agha nʼelu iru nke ala ahụ nile, nwoke ọbụla na ndị otu ya na-alụ maka ihe nke ọ chọrọ.

26 Ma e nwere ndị-ori, ma na mkpirisi, ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche nʼelu iru nile nke ala ahụ.

27 Ma o wee ruo na Koriantamọ wesoro Shared iwe karịa, ma ọ gara imegide ya, ya na ndị-agha ya nʼịlụ-agha; ma ha zutere na nnukwu iwe, ma ha zutere na ndagwurugwu nke Gịlgal; ma ịlụ-agha ahụ dịziri egwu karịa.

28 Ma o wee ruo na Shared lụrụ ọgụ megide ya nʼohere nke ụbọchị atọ. Ma o wee ruo na Koriantamọ meriri ya, ma chụọ ya ọsọ ruo mgbe ọ bịaruru nʼala dị larịị nke Heshlọn.

29 Ma o wee ruo na Shared nyekwara ya ịlụ-agha ọzọ nʼelu ala ahụ dị larịị, ma lee, o merịri Koriantamọ, ma chụghachị ya azụ ruo na ndagwurugwu nke Gịlgal ahụ.

30 Ma Koriantamọ nyekwara Shared ịlụ-agha ọzọ nʼime ndagwurugwu nke Gịlgal ahụ, nʼime nke o merịri Shared ma gbuo ya.

31 Ma Shared merụrụ Koriantamọ arụ nʼapata ụkwụ ya, nke mere na ọ gaghị kwa ịlụ-agha ọzọ nʼohere nke afọ abụọ, nʼime oge nke ndị ahụ bi nʼelu iru nke ala ahụ na akwafu ọbara ma ọdịghị onye nwere ike ịkwusị ha.