Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
9. Temple Kirtland


9. Temple Kirtland

E tinyere Temple Kirtland na Kirtland, Ohio.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Temple Kirtland bụụrụ temple nke mbụ e wuru n’ọgbọ nke a kara-aka (OznỌd. 88:119; 95). N’ime temple nke a Joseph Smith hụrụ ọ̀hụ̀ nke ala-eze Selestịal (OznỌd. 137). A raara ya nye Chineke na 27 Maach 1836 (OznỌd. 109). Na 3 Epril 1836, Onye-nzọpụta pụtara ìhè na nabata temple ahụ dịka ebe ọ ga-ekpughe okwu ya nye ndị ya (OznỌd. 110:1–10). Na isochi mpụta ìhè nke a, Joseph Smith na Oliver Cowdery natara nleta nile site n’aka Moses, Elaias, na Elaịja, ndị ha nile bụ ndị nyere ha ọtụghe-ụzọ ọkwa-nchụ-aja dị iche iche na ozi dị mkpa (OznỌd. 110:11–16). Temple nke a rụụrụ Ndị-nsọ ọrụ maka ihe dịka afọ abụọ tutu ha esi na Kirtland gbalaga n’ihi mkpagbu.

Foto, oyiyi
foto 9

9. Temple Kirtland Temple nke mbụ e wuru n’ọgbọ oge a kara aka nke a, 1836. N’ime temple a, Jisus Kraịst, Moses, Elaias, na Elaịja pụtara ìhè na weghachiri ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja (hụ OznỌd. 110).