Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
16. Ụlọ Mkpọrọ Carthage


16. Ụlọ Mkpọrọ Carthage

Ụlọ mkpọrọ dị n’obodo Carthage, Illinois.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Joseph Smith na nwanne ya nwoke Hyrum gbara inyinya ruo Carthage na 24 Jun 1844. A tụbara ha n’ime ụlọ mkporo a na 25 Jun n’ebubo ụgha nile nke nnupụ-isi nye ndị ọchịchị. Na 27 Jun òtù ndị na-agba aghara ndi tere iru ha agba ojii bakporo ụlọ mkpọrọ ahụ. Ma Joseph na Hyrum ka a gbagburu n’egbe, na John Taylor ka e merụrụ arụ ọtụtụ oge. N’ụzọ dị ịtụnanya, e merụghị Willard Richards arụ. N’ikpe-azụ John Taylor dere akwụkwọ ncheta nwere nkwalite mụọ nke dị ugbua na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 135.

Foto, oyiyi
foto 16

16. Ụlọ Mkpọrọ Carthage N’ebea ka e gburu Onye-amụma Joseph Smith na nwanne ya nwoke Hyrum n’ihi okwukwe ha na 27 Jun 1844 (hụ OznỌd. 135).