Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
18. Temple Salt Lake


18. Temple Salt Lake

Ụbọchị ole na ole mgbe ọgbakọ ndị bu ụzọ nke mbụ nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ batasịrị na Ndagwurugwu Salt Lake, Onye-isi Nduzi Brigham Young kụrụ mkpanaka ya n’ala na maa-ọkwa, “Ebe a ka anyị ga-ewu temple nke Chineke anyị.” E mere mmemme nke igbuwa ala na 14 Februarị 1853. Na 6 Epril 1853, e tinyere nkume njikọ ya nile. A rụchara temple ahụ na rara ya nye Chineke mgbe afọ dị 40 gasịrị na 6 Epril 1893. Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na otu Ọnụ-ọgụgụ juru aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ na-ezukọ ebe a kwa izu-ụka ịtụgharị na-ịchọ nduzi ụzọ nke Onye-nwe na-ilekọta na iwu ala-eze Chineke.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-nwe enyewo Ndị-isi Nduzi nile nke Nzukọ-nsọ na Ndị ọzọ. Ji ikike nile Ọha mwụpụta nke mụọ nke mkpughe n’ebe a tinyere Ima Ọkwa nke Ụlọ-ọrụ—2. Nke ka na nso nso a, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na otu Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ji otu obi kwenye na bipụta “Ezi na Ụlọ: Otu Ịma-ọkwa nye Ụwa”. Emume-nsọ nile nke temple e mere n’ihi ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ a gọziwo ndụ nile nke ọtụtụ nde.

Foto, oyiyi
foto 18

18. Temple Salt Lake Ihe a e ji mara ala Ndagwurugwu Salt Lake weere afọ nile dị 40 iwu ya.