Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
17. Ọpụpụ gaa Ọdịda-anyanwụ


17. Ọpụpụ gaa Ọdịda-anyanwụ

Mmalite nke nkwapụ nke Nauvoo, Illinois, ka a tụrụ atụmatụ ya maka Maach—Epril, kama n’ihi mba nile nke ndị na-agba aghara. Onye-isi Nduzi Brigham Young tụziri aka ka ọpụpụ Ndị-nsọ igafe Osimiri Mississippi malite na 4 Februarị 1846. Onye-isi Nduzi Young fọdụrụ n’azụ ilekọta inyefe Ndị-nsọ Onyinye dị nsọ nile, ma ọ hapụghị Nauvoo ruo etiti Februarị.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Tutu ọnwụ ya Onye-amụma Joseph Smith buru amụma, “Ụfọdụ n’ime unu ga-adị ndụ ịga na inye-aka ime ebe-obibi nile na iwu nnukwu obodo nile na hụ Ndị-nsọ ịghọ otu nnukwu ndị mmadụ n’etiti nke Rocky Mountains.” Ọ fọdụrụ obere ka ọ bụrụ Ndị-nsọ 12,000 hapụrụ Nauvoo site Februarị ruo Septemba 1846. Mgbe Ndị-nsọ hapụsịrị Winter Quarters na ebe ikpe-azụ ndị ọzọ, a haziri ha n’ọgbakọ nke iri nile, iri ise nile, na narị nile, n’okpuru otu onye ọchị-agha ọgbakọ (OznỌd. 136:3). Na Septemba 1846 òtù ndị na-agba aghara nke dị nwa ntịntị ka ọ daba na ndịkom dị 800 ndị ji nnukwu egbe isii gbara Nauvoo okirikiri. Mgbe a lụsịrị ọgụ ọtụtụ ụbọchị, a manyere Ndị-nsọ fọdụrụ amanye ihapụ ọgụ n’usoro izọpụta ndụ ha na nwee ohere igafe osimiri ahụ. Ihe dịka narị ndịkom ise ma-ọbụ isii, ndịnyom, na ụmụ ntakịrị gafere osimiri ahụ na nwee ụlọ-ikwuu n’elu agiga osimiri ahụ. Onye-isi Nduzi Brigham Young zigara ndị òtù nzọpụta jiri ihe nziga nile iji kpọpụta ndị-ogbenye Ndị-nsọ ndị a.

Foto, oyiyi
foto 17

17. Ọpụpụ gaa Ọdịda-Anyanwụ Na 4 Februarị 1846 ụgbọ-ala aka nile nke mbụ gafere Osimiri Mississippi ịmalite njem ahụ dị mkpa n’akụkọ gaa ọdịda-anyanwụ.