Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
2. Ugwu Kumora na Ebe Manchester-Palmyra


2. Ugwu Kumora na Ebe Manchester-Palmyra

A na-ele anya na mpaghara elu-elu, foto a na-egosi Ugwu Kumora, na Manchester, New York. Ugwu ahụ pụtara ìhè n’ala-ala njikọ aka-nri nke foto ahụ na jiri obere gafetụ ọkara n’ebe mgbago nke foto ahụ. Ihe ncheta ọcha ahụ a na-ahụ anya na elu elu ọgwụgwụ nke ugwu ahụ na-enye mụọ-ozi Moronaị na mpụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn nnukwu ùgwù. Ugwu Kumora di ihe dịka kilomita ise na ndịda-ọwụwa-anyanwụ nke ọ́gbà dị Nsọ ahụ. Nso n’ọnụ-ọnụ foto ahụ ka Palmyra dị, ohere kilomita isii na ọkara. Ala-ubi Smith na ọ́gbà dị Nsọ dị n’agịga elu elu aka-ekpe nke foto ahụ.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Ezi na ụlọ Onye-amụma Joseph Smith biri n’ebe a n’oge Ọ̀hụ̀ nke Mbụ (A—JS 1:3). N’afọ 421 ka a mụsịrị Kraịst Moronaị liri otu ndozi nke epekele ọla-edo nile n’Ugwu Kumora na-enwe akụkọ dị nsọ nke ndị ya (OkwMọm. 1:1–11; Mọm. 6:6; Moro. 10:1–2). Moronaị ahụ kwa gwara Joseph Smith ebe ọ ga-achọta epekele nile ahụ—ịgawa n’elu elu ọgwụgwụ nke ugwu ahụ, n’akụkụ ọdịda anyanwụ dị nso n’ọnụ-ọnụ ya. Moronaị nyefere ha n’aka ya n’afọ 1827 (OznỌd. 27:5; 128:20; A—JS 1:33–35, 51–54, 59).

Foto, oyiyi
foto 2

2. Ugwu Kumora na Ebe Manchester-Palmyra Mụọ-ozi Moronaị tụziiri Joseph Smith aka ka ọ chọta epekele ọla-edo nile ndị o liri n’ugwu a. (Ugwu dị n’etiti ebe aka-nri.)