Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
11. Ọnọdụ Temple Far West


11. Ọnọdụ Temple Far West

Ọnọdụ-obibi nke Far West, Missouri, ghọrọ ebe-obibi maka Ndị-nsọ dị 3,000 ruo 5,000 ndị chọrọ ebe mgbaba site na mkpagbu n’ime ebe ọchịchị nile nke ime obodo Jackson na Clay. Na 31 Ọktoba 1838 Onye-amụma Joseph Smith na ndị ndu Nzukọ-nsọ ọzọ ka e jidere na, mgbe e kpesịrị ha ikpe maka ịma ha ikpe na Richmond, Steti nke Missouri tụrụ ha mkpọrọ na Ụlọ Mkpọrọ Liberty. N’oge oyi nke 1838–39, Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ ka a chụpụrụ site na Far West na ọnọdụ ebe ndị ọzọ dị na Missouri ma ha tinyegharịrị onwe ha na Illinois.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Otu ọnọdụ ebe temple ka a rara nye Chineke na e tinye kwara nkume-njikọ ya nile. Mkpughe asaa e bipụtara n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile ka Joseph Smith nta natara (nkeji nile nke 113–115; 117–120). Joseph F. Smith Onye-isi Nduzi nke isii nke Nzukọ-nsọ, ka a mụrụ na 13 Novemba 1838 na Far West. Far West rụrụ ọrụ nke nke oge dịka isi-ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ n’okpuru Onye-amụma Joseph Smith.

Foto, oyiyi
foto 11

11. Ọnọdụ Temple Far West Na 1838 Onye-nwe nyere Ndị-nsọ iwu ka ha wuo temple n’ebea (hụ OznỌd. 115:7–8). Mkpagbu nke ndị na-agba aghara gbochiri ha ime nke a.