Map 6
Njem Mpaghara Ọdịda Anyanwụ nke Nzukọ-nsọ
N
Canada
New York
Ọchịchị Obodo Ndị Oregon
Ọchịchị Obodo Ndị India
Fayette
Nnukwu Obodo New York
Osimiri Snake
Ebe a rusiri ike Hall
Ebe a rusiri ike Bridger
Osimiri North Platte
Nnukwu Oke Osimiri Pasifik
Ebe a rusiri ike Laramie
Winter Quarters
Iowa
Pennsylvania
4 Feb 1846 Njem nke ụgbọ-mmiri Brooklyn Amalite
Council Bluffs
Illinois
Indiana
Kirtland
San Francisco
Ndọghachi azụ California
Nnukwu Ọdọ-mmiri Nnu
Nnukwu Obodo Salt Lake
Osimiri South Platte
Nauvoo
Philadelphia
Ebe a rụsiri ike Leavenworth
Far West
Ohio
Washington, D.C.
Nnukwu Oke-Osimiri Atlantic
Sacramento
Quincy
Liberty
California
Mexico
Pueblo
Osimiri Arkansas
Independence
Ụgbọ mmiri Brooklyn rutere na Yerba Buena (San Francisco) 31 Julai 1846
Los Angeles
Missouri
Santa Fe
Osimiri Canadian
Ọchịchị Obodo Ndị India
San Bernardino
Mission San Luis Rey
Osimiri Gila
Rio Grande
Osimiri Pecos
San Diego
Tucson
Ọtụghe Ụzọ nke Map 6
Ụzọ Ìgwè otu Puku ndị-agha Mọmọn
Ụzọ Mpaghara Ọdịda-anyanwu nke Ndị-nsọ
Ụzọ nke ụgbọ mmiri Brooklyn ahụ
Kilomita nile
0 150 300 450 600
A B C D E F G H
1 2 3 4
●1
●2
●3
●4
●5
●6
●7
●8
●9
●10
●11
●12
●13
●14
●15
-
Fayette Onye-amụma Joseph Smith hapụrụ Fayette gaa Kirtland, Ohio na Jenuarị 1831, Ngalaba atọ ahụ nke New York sochiri na Epril na Mee 1831 n’ihi iwu nke Onye-nwe nyere ka a kpọkọta (hụ OznỌd. 37; 38).
-
Kirtland Isi ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ site 1 Februarị 1831 ruo 12 Jenuarị 1838, mgbe Onye-amụma gara na Far West, Missouri.
-
Independence Onye-nwe matara Independence (dị n’Ógbè Jackson, Missouri) dịka ebe etiti nke Zaịọn na Julaị 1831 (hụ OznỌd. 57:3). Ndị na-agba aghara chụpụrụ Ndị-nsọ n’ike site n’Ógbè Jackson na Novemba 1833.
-
Liberty Ndị-nsọ sitere n’Ógbè Jackson gbakọrọ na Ógbè Clay site 1833 ruo 1836, mgbe a chọrọ ọzọ ka ha pụọ. Onye-amụma Joseph Smith na ndị-ọzọ ka a tụrụ mkpọrọ n’ebe a.
-
Far West E hiwere ebe mgbaba n’ebea maka Ndị-nsọ 1836–38. Ọ bụụrụ isi ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ na 1838. Na 1838–1839 a manyere Ndị-nsọ n’ike ịhapụ gbalaga na illinois.
-
Nauvoo Isi ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ 1839–1846. Mgbe e gbusịrị onye-amụma na nwanne ya nwoke Hyrum, Ndị-nsọ gawara Ọdịda-anyanwụ.
-
Council Bluffs Ndị nchọpụta bụ ụzọ rutere ebea Jun 1846. Ndị-otu igwe otu puku ndị agha Mọmọn hapụrụ na 21 Julaị 1846 n’okpuru nduzi nke James Allen.
-
Winter Quaters Isi ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ 1846–1848. Ọgbakọ na-akwụ n’iru n’okpuru nduzi ụzọ nke Onye-isi Nduzi Brigham Young hapụrụ gawa Ọdịda-anyanwụ na Epril 1847.
-
Ebe a rụsiri ike Leavenworth Igwe otu puku ndị agha Mọmọn ka e jikeere n’ụdị ndị agha n’ebea tutu a malite ịzọ njem gawa Ọdịda-anyanwụ na Ọugọst 1846.
-
Santa Fe Philip Cooke chịrị Igwe otu puku ndị-agha Mọmọn na mgbe ọ na-azọ njem site n’ebea 19 Ọktoba 1846.
-
Pueblo Ụzọ ndị arụ na-adịghị ike atọ nke ndi agha Mọmọn ahụ ka e nyere iwu ka ha gaa nweta arụ-ike na pueblo, ebe ha nọdụrụ n’oge oyi nke 1846–1847 tinyere Ndị-nsọ sitere na Mississippi. Ọgbakọ ndị a banyere na ndagwurugwu Salt Lake na Julaị 1847.
-
San Diego Igwe otu puku ndị-agha Mọmọn ahụ zọsịrị njem ya dị 3,200 kilomita n’ebea na 29 Jenuarị 1847.
-
Los Angeles Igwe otu puku ndị-agha Mọmọn ahụ ka a tohapụrụ n’ebe a 16 Julaị 1847.
-
Sacramento Ụfọdu ndị-agha Mọmọn ahụ a hapụrụ rụrụ ọrụ n’ebe a na n’igwe ịkwọ ọka Sutter a gakwuo ọwụwa-anyanwụ n’elu Osimiri nke America, ebe ha nyere aka ịchọpụta ọla-edo.
-
Salt Lake City Brigham Young rutere n’ime Ndagwurugwu Salt Lake na 24 Julaị 1847.