Akwụkwọ nsọ
Moronaị 3


Isi 3

Ndị okenye wee chie ndị nchụ-aja na ndị nkuzi echichi site nʼibikwasị-aka nʼisi. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ụdị nke ndị na-eso-ụzọ ya ahụ, ndị a kpọrọ ndị okenye nke nzukọ-nsọ ahụ, siri chie ndị nchụ-aja na ndị nkụzi echichi—

2 Mgbe ha kpeworo ekpere nye Nna nʼaha nke Kraịst, ha bikwasịrị ha aka nʼisi, ma sị:

3 Nʼaha nke Jisus Kraịst ana m echi gị echichi ịbụ onye nchụ-aja (ma-ọbụ ọbụrụ na ọ bụ onye-nkụzi, ana m echi gị echichi ịbụ onye-nkụzi) ikwusa nchegharị na nsachapụ nke mmehie nile site na Jisus Kraịst, site na nnagide nke okwukwe nʼaha ya ruo nʼọgwụgwụ. Amen.

4 Ma nʼụdị a ka ha siri chie ndị nchụ-aja nile na ndị nkuzi nile echichi, dịka onyinye nile na ọkpụkpọ nile nke Chineke kpọrọ ndị mmadụ siri dị; ma ha chiri ha site nʼike nke Mụọ Nsọ, nke dị nʼime ha.