Akwụkwọ nsọ
Moses 2


Isi 2

(Jun–Ọktoba 1830)

Chineke wee kee elu-igwe nile na ụwa—Ụdị nile nke ndụ ka e kere—Chineke emee mmadụ ma nye ya ọchịchị n’elu ihe nile ọzọ.

1 Na o wee ruo na Onye-nwe kwuru okwu nye Moses na-asị: Lee ana m ekpughe nye gị gbasara elu-igwe nke a, na ụwa nke a, dee okwu nile nke m na-ekwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ, Chineke Pụrụ Ime Ihe nile; site n’Onye nke m Mụrụ Nanị ya ka m kere ihe ndị a nile; e, na mmalite ekere m elu-igwe, na ala nke i na-eguzo n’elu ya.

2 Ma ụwa wee bụrụ ihe tọgbọ n’efu na nkịtị; ma m wee mee ka ọchịchịrị bịakwasị n’elu ebe ahụ miri emi; ma Mụọ m na-erugharị n’elu iru mmiri ahụ; n’ihi abụ m Chineke.

3 Na mụ, Chineke, wee sị: Ka ìhè dị; ma ìhè wee dị.

4 Na mụ, Chineke, wee hụ ìhè ahụ; na ìhè ahụ dị mma. Na mụ, Chineke, wee kewaa ìhè ahụ site n’ọchịchịrị ahụ.

5 Na mụ, Chineke, wee kpọọ ìhè ahụ Ehihie; ma ọchịchịrị ahụ ka m kpọrọ Abalị; ma nke a ka m mere site n’okwu nke ike m, ma e mere ya dịka m kwuru; ma anyasị na ụtụtụ ahụ wee bụrụ ụbọchị nke mbụ.

6 Na ọzọ mụ, Chineke, wee sị: Ka mbara dị n’ime etiti mmiri ahụ, ma o wee dị otua, ọbụna dịka m kwuru; ma m wee sị: Ka o kewaa mmiri nile site na mmiri nile; ma e wee mee ya.

7 Na mụ, Chineke, wee mee mbara ahụ ma kewaa mmiri nile ahụ, e, oke mmiri nile ahụ nọ n’okpuru mbara ahụ site na mmiri nile ahụ nke nọ n’elu mbara ahụ, ma o wee dị otu a ọbụna dịka m kwuru.

8 Na mụ, Chineke, wee kpọọ mbara ahụ Elu-igwe; ma anyasị na ụtụtụ ahụ wee bụrụ ụbọchị nke abụọ.

9 Na mụ, Chineke, wee sị: Ka a chịkọta mmiri nile ahụ nọ n’okpuru elu-igwe n’otu ebe, o wee dị otu a; na mu, Chineke, wee sị: Ka ala kpọrọ nkụ dị ma o wee dị otu a.

10 Na mụ, Chineke, wee kpọọ ala kpọrọ nkụ ahụ Ala; ma nchịkọta mmiri nile ahụ, ka m kpọrọ oke osimiri; na mụ, Chineke, wee hụ na ihe nile nke m meworo dị mma.

11 Na mụ, Chineke, wee sị: Ka ala wepụta ahịhịa, ihe ọkụkụ nke na-amị mkpụrụ ọghịgha, osisi mkpụrụ nke na-amị mkpụrụ, n’ụdị nke ya, na osisi na-amị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọghịgha ya ga-adị n’ime ya n’elu ala, ma o wee dị otua ọbụna dịka m kwuru.

12 Ma ala wee wepụta ahịhịa, ihe ọkụkụ nile na-amị mkpụrụ ọghịgha n’ụdị nke ya, na osisi na-amị mkpụrụ nke mkpụrụ ọghigha ya ga-adị n’ime ya, n’ụdị nke ya; na mụ, Chineke, wee hụ na ihe nile nke m meworo dị mma;

13 Na anyasị na ụtụtụ ahụ wee bụrụ ụbọchị nke atọ.

14 Na mụ, Chineke, wee sị: Ka ìhè nile dị n’ime mbara elu-igwe ahụ ịkpa oke n’etiti ehihie na abalị; na ka ha bụrụ n’ihi iriba-ama nile, na n’ihi oge, na n’ihi ụbọchị nile, na n’ihi afọ nile.

15 Na ka ha buru n’ihi ìhè nile n’ime mbara elu-igwe, i nye ìhè n’elu ụwa; ma o wee dị otu a.

16 Na mụ, Chineke, wee mee oke ìhè abụọ; ka ìhè nke ka ukwuu na-achị ehihie, ma ka ìhè nke ka nta na-achị abalị, na ka ìhè nke ka ukwuu wee bụrụ anyanwụ, ma ìhè nke ka nta bụrụ ọnwa, ma kpakpando nile ka e mekwara ọbụna dịka okwu m siri dị.

17 Na mụ, Chineke, tinyere ha n’ime mbara nke elu-igwe inye ìhè n’elu ụwa.

18 Na ka anyanwụ ahụ na-achị ehihie, na ka ọnwa ahụ na-achị abalị, na ịkpa oke n’etiti ìhè na ọchịchịrị; na mụ Chineke, wee hụ na ihe nile nke m meworo dị mma.

19 Ma anyasị ahụ na ụtụtụ wee bụrụ ụbọchị nke anọ.

20 Na mụ, Chineke, wee sị: Ka mmiri ahụ nile wepụta ebe ọdị ukwuu anụ na enugharị enugharị nke nwere ndụ, na anụ-ufe nke ga-na-efegharị n’elu ụwa n’iru mbara nke elu-igwe.

21 Ma mụ, Chineke, wee kee nnukwu ogologo anụ ukwu nile, na anụ nile dị ndụ na-enugharị enugharị, ndị nke mmiri nile ahụ wepụtaworo n’ebe ọdị ukwuu, n’ụdị nke ha, ma anụ ufe nile dị iche iche n’ụdị nke ya; na mụ, Chineke, wee hụ na ihe nile m keworo dị mma.

22 Na mụ, Chineke, wee gọzie ha, sị: Mịtanụ mkpụrụ, ma baa nụ ụba, ma jupụta mmiri nile dị n’oke osimiri, na ka anụ ufe baa ụba n’ime ụwa.

23 Ma abalị ahụ na ụtụtụ wee bụrụ ụbọchị nke ise.

24 Na mụ, Chineke, we sị: Ka ala wepụta ihe dị ndụ e kere eke dị iche iche nke ọbụla n’ụdị ya, anụ ụlọ, na ihe nile na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa nile nke ụwa nke ọbụla n’ụdị ha, ma o wee dị otua.

25 Na mụ, Chineke, wee mee anụ ọhịa nile nke ụwa nke ọbụla n’ụdị ha, na anụ ụlọ n’ụdị ha, na ihe dum nke na-akpụ akpụ n’elu ala, nke ọbụla n’ụdị ya; ma mụ, Chineke, wee hụ na ihe nile ndịa dị mma.

26 Na mụ, Chineke, wee sị Onye nke m Mụrụ Nanị Ya, onye nke nọnyeere m site na mmalite: Ka anyị mee mmadụ na onyinyo anyị, na oyiyi nke anyị, ma o wee dị otua. Na mụ, Chineke, wee sị: Ka ha nwee ike ọchịchị n’elu azụ nile nke oke osimiri, na n’elu anụ ufe nile nke ikuku, na n’elu anụ ụlọ, na n’elu ụwa dum, na n’elu ihe dum na-akpụ akpụ n’elu ala.

27 Na mụ, Chineke, wee kee mmadụ na onyinyo nke m, n’onyinyo nke Onye nke m Mụrụ Nani ya ka m kere ya; nwoke na nwanyị ka m kere ha.

28 Na mụ, Chineke, wee gọzie ha, ma sị ha: Mụa nụ ọmụmụ, baakwa nụ ụba, na juputa nụ ụwa, na buda ya n’okpuru unu, na nweenụ ike ọchịchị n’elu azụ nke oke osimiri, na n’elu anụ ufe nke ikuku, na n’elu ihe nile dị ndụ nke na-akpagharị n’elu ụwa.

29 Na mụ, Chineke, wee sị mmadụ: Lee, enyewo m gị ihe ọkụkụ dum na-amịta mkpụrụ ọghịgha, nke nọ n’elu iru nke ụwa nile, na osisi ọbụla nke n’ime ya ga-adị mkpụrụ osisi na-amita mkpụrụ ọghịgha; ọ ga abụrụ gị ihe oriri.

30 Na nye anụ ọhịa nile nke ụwa, na nye anụ ufe nile nke ikuku, na nye ihe dum na-akpụ akpụ n’elu ala bụ ndị nke m nyeworo ndụ, ka a ga-enye ihe ọkụkụ nile dị ọcha ịbụrụ ihe oriri, ma o wee di otua, ọbụna dịka m kwuru.

31 Na mụ, Chineke, wee hụ ihe nile nke m meworo, na, lee, ihe nile nke m mewororị dị ezigbo mma; ma anyasị ahụ na ụtụtụ wee bụrụ ụbọchị nke isii.