Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 7


Isi 7

Mọmọn wee kpọọ ndị Leman nke ụbọchị ikpe-azụ oku ikwere na Kraịst, nabata ozi-ọma ya, ma ka azọpụta ha—Ndị nile kwere na Bible ga e kwere kwa na Akwụkwọ nke Mọmọn. Ihe dịka afọ 385 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua, lee, a ga m ekwu ihe ole na ole nye andị fọdụrụ na ndị a ahapụrụ, ọbụrụ na Chineke ga-enye ha okwu m nile, ka ha wee mata maka ihe nile nke ndị nna ha; e, a na m agwa unu, unu ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Israel, ma ndị a bụ okwu ndị ahụ nke m na ekwu:

2 Mata nụ na unu bụ nke aụlọ nke Israel.

3 Mata nụ na unu ga-abịarịrị na nchegharị, ma ọdịghị otu a agaghị azọpụta unu.

4 Mata nụ na unu ga-atọgbọrịrị ngwa-ọgụ unu nile nke agha, ma kwusị inwe mmasị nʼịkwafu ọbara, ma ghara iwerekwa ha ọzọ, ma ọbụghị na Chineke ga-enye unu iwu.

5 Mata nụ na unu ga-abịarịrị na ammata nke ndị nna unu, ma chegharia site na mmehie unu nile na ajọọ-omume nile, ma bkwere na Jisus Kraịst, na ọ bụ Ọkpara nke Chineke, ma na ndị Juu gburu ya, ma site nʼike nke Nna ahụ o biliwo ọzọ, nʼebe nke o ritaworo cmmeri ahụ nʼebe ili dị; na kwa n’ime ya ka e lomiri ihe ọgbụgba nke ọnwụ.

6 Ma ọ na-eweta na mmezu ambilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, site nʼebe a ga-esirịrị kulite mmadụ ka o guzoro nʼiru boche-ikpe ya.

7 Ma o wetawo na mmezu amgbapụta nke ụwa, ya mere onye nke a chọpụtara bnʼikpe amaghị ya nʼiru ya nʼụbọchị ikpe ahụ a ga-enye ya cibi nʼebe Chineke nọ nʼala-eze ya, ịbụ abụ otuto akwụsịghị-akwụsị ya na dotu-ndị-abụ nile nọ nʼelu, nye Nna ahụ, na nye Ọkpara ahụ, na nye mụọ Nsọ ahụ, ndị bụ eotu Chineke, nʼọnọdụ fan̄ụrị nke na-enweghị ngwụcha.

8 Ya mere chegharịa, ma ka e mee unu baptism nʼaha nke Jisus, ma jidesie aozi-ọma nke Kraịst ahụ ike, nke a ga-edozi nʼiru unu, ọbụghị nanị bnʼakụkọ-ndekọta nke a mana kwa nʼakụkọ-ndekọta nke ga-abịaru ndị Jentaịlụ csite nʼaka ndị Juu, bụ akụkọ-ndekọta nke ga-esite nʼaka ndị Jentaịlụ dbịaruo unu.

9 N’ihi na lee, anke a ka e dere maka ebum-nʼobi na unu bga-ekwere nke ahụ; ma ọbụrụ na unu kwere nke ahụ unu ga-ekwere kwa nke a; ma ọ bụrụ na unu kwere nke a unu ga-amata gbasara ndị nna unu, na kwa ọrụ ịtụ-nʼanya nile nke e mere site nʼike nke Chineke nʼetiti ha.

10 Ma unu ga-amata kwa na unu bụ ndị fọdụrụ nke mkpụrụ-afọ nke Jekọb; ya mere a gụnyere unu nʼetiti ndị nke ọgbụgba-ndụ mbụ; ma ọ bụrụ na ọ dị otu a na unu kwere na Kraịst, ma e mee unu baptism, mbụ jiri mmiri, ọzọ jiri ọkụ na jiri Mụọ Nsọ, na-eso aụkpụrụ nke Onye-nzọpụta anyị, dịka ihe ahụ nke o nyeworo anyị nʼiwu, ọ ga-adịrị unu mma nʼụbọchị nke ikpe. Amen.