Akwụkwọ nsọ
Hilaman 9


Isi 9

Ndị-ozi wee chọta onye-isi-ikpe ahụ ka o nwụrụ-anwụ nʼoche-ikpe ahụ—A tụrụ ha mkpọrọ ma emesịa hapụ ha—Site na nkwalite nke mụọ Nifaị matara Siantọm dịka onye gburu ya—Ụfọdụ ndị nabatara Nifaị dịka onye-amụma. Ihe dịka nʼafọ 23 ruo 21 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, ugbua o wee ruo na mgbe Nifaị kwuworo okwu ndị a, ụfọdụ ndị nwoke ndị nọọrọ nʼetiti ha gbagara ọsọ nʼoche-ikpe ahụ; e, ọbụna ha dị ise ndị gara, ma ha kwuru nʼetiti onwe ha, dịka ha na-aga:

2 Lee, ugbua anyị ga-amata nʼezi-okwu ma nwoke a ọ bụ onye-amụma ma Chineke onyewo ya iwu iburu anyị amụma ụdị ihe ịtụ-nʼanya ndị a. Lee, anyị ekweghị na o mewo nke a; e, anyị ekweghị na ọ bụ onye-amụma, otu o sila dị, ọbụrụ na ihe nke a o kwuworo gbasara onye-isi-ikpe bụ ezi-okwu, na ọ nwụwo, mgbe ahụ ka anyị ga-ekwere na okwu ndị ọzọ ahụ o kwuworo bụ ezi-okwu.

3 Ma o wee ruo na ha gbara ọsọ nʼike ha, ma bata ruo nʼoche-ikpe ahụ; ma lee, onye-isi-ikpe ahụ adaworịị nʼala, ma dịnara nʼime ọbara ya.

4 Ma ugbua lee, mgbe ha hụrụ nke a ọ tụrụ ha nʼanya karịa, nke mere na ha dara nʼala, n’ihi na ha ekweghịrịị okwu nile nke Nifaị kwuworo gbasara onye-isi-ikpe ahụ.

5 Mana ugbua, mgbe ha hụrụ ha kwere, ma egwu bịakwasịrị ha na eleghị-anya ikpe nile nke Nifaị kwuworo maka ha ga-abịakwasị ndị ahụ; ya mere ha mara jijiji, ma ha adawo nʼala.

6 Ugbua, ngwa-ngwa mgbe e gbuworo onye-ikpe ahụ—ebe nwanne ya nwoke maworo ya mma site nʼatụmatụ nke nzuzo, ma ọ gbafuru, ma ụmụ-oru ahụ gbara ọsọ ma gwa ndị ahụ, na-eti mkpu ogbugbu-mmadụ nʼetiti ha.

7 Ma lee ndị ahụ kpọkọtara onwe ha ọnụ ruo nʼebe nke oche-ikpe ahụ—ma lee, nʼịtu-nʼanya ha, ha hụrụ ndị nwoke ise ahụ ndị daworo nʼala.

8 Ma ugbua lee, ndị ahụ adịghị ihe ha matara gbasara igwe mmadụ ahụ ndị gbakọtara onụ nʼubi-nta nke Nifaị; ya mere ha kwuru nʼetiti onwe ha: Ndị nwoke a bụ ndị ahụ gburu onye-ikpe ahụ, ma Chineke etiwo ha otiti-ihe nke mere na ha enweghị ike ịgbapụ site nʼebe anyị nọ.

9 Ma o wee ruo na ha jidere ha, ma kee ha agbụ ma tụba ha nʼime ụlọ-mkpọrọ. Ma e nwere ịma-ọkwa e zipụrụ mba nile na e gburu onye-ikpe ahụ, ma na ndị gburu ya a kpọrọwo ha ma a tụbara ha nʼụlọ-mkpọrọ.

10 Ma o wee ruo na nʼechi ya, ndị ahụ kpọkọtara onwe ha ọnụ iru uju na ibu-ọnụ, nʼolili nke nnukwu onye-isi-ikpe ahụ onye e gbuworo.

11 Ma otu a kwa ndị-ikpe ahụ nọ nʼubi-nta nke Nifaị, ma nụ okwu ya nile, ha gbakọtakwara nʼolili ahụ.

12 Ma o wee ruo na ha jụrụ nʼetiti ndị ahụ, na-asị: Olee ebe ise ndị ahụ nọ, ndị e zigara ịjụpụta gbasara onye-isi-ikpe ahụ ma ọ nwụrụ-anwụ? Ma ha zara sị: Gbasara ise ndị a ndị unu sị na unu ezipụtawo, anyị amaghị; kama e nwere ise ndị bụ ndị ogbu-mmadụ, ndị anyị tụbaworo nʼụlọ-mkpọrọ.

13 Ma o wee ruo na ndị-ikpe ahụ chọrọ ka a kpọta ha; ma a kpọtara ha, ma lee ha bụ ise ndị ahụ e zipụrụ; ma lee ndị-ikpe ahụ jụrụ ha ịmata gbasara ihe ahụ, ma ha gwara ha ihe nile nke ha meworo, na-asị:

14 Anyị gbara ọsọ ma bịa ruo nʼebe nke oche-ikpe ahụ, ma mgbe anyị hụrụ ihe nile ọbụna dịka Nifaị gbaworo nʼama, ọ tụrụ anyị nʼanya nke mere na anyị dara nʼala; ma mgbe anyị nwetara onwe anyị site nʼịtụ-nʼanya anyị, lee ha tụbara anyị nʼime ụlọ-mkpọrọ.

15 Ugbua, maka ogbugbu nke nwoke a, anyị amaghị onye meworo ya; ma nanị nke ha otu a ka anyị matara, anyị gbara ọsọ ma bịa dịka unu siri chọọ, ma lee ọ nwụrụ anwụ, dịka okwu nile nke Nifaị siri dị.

16 Ma ugbua o wee ruo na ndị-ikpe ahụ kọwadaruru ihe ahụ ala nye ndị ahụ, ma tipụta mkpu megide Nifaị, na-asị: Lee, anyị matara na Nifaị a ga-ekwekọtawọrịị ya na otu onye igbu onye-ikpe ahụ, ma mgbe ahụ o nwere ike ikwupụtara anyị ya, ka o nwe ike gbanwee anyị nye okwukwe ya, ka o nwe ike bulie onwe ya ịbụ nnukwu mmadụ, onye Chineke họrọ, na onye-amụma.

17 Ma ugbua lee, anyị ga-achọpụta nwoke a, ma ọ ga-ekwupụta mmehie ya ma mee ka anyị mata onye gburu onye-ikpe ahụ nʼezie.

18 Ma o wee ruo na ise ahụ a hapụrụ ha nʼụbọchị olili ahụ. Otu o sila dị, ha baara ndị-ikpe ahụ mba nʼokwu nile nke ha kwuworo megide Nifaị, ma dọso ha ndọrọ ndọrọ nʼotu nʼotu, nke mere na ha mechịrị ha ọnụ.

19 Otu o sila dị, ha mere ka a kpọrọ Nifaị ma kee ya agbụ ma kpọta ya nʼiru igwe mmadụ ahụ, ma ha malitere ịjụ ya ajụjụ nʼụzọ dị iche iche ka ha wee kpasuo ya iwe, ka ha nwe ike bo ya ebubo ga-edụba nʼọnwụ—

20 Na-asị ya: Ị bụ onye nwere nkwekọrịta nzuzo; onye bụ nwoke a nke meworo igbu-mmadụ a? Ugbua gwa anyị, ma nakwere iri-mpe gị; na kwa anyị ga-ahapụrụ gị ndụ gị ma ọbụrụ na ị ga-agwa anyị, ma nakwere nʼezi-okwu nkwekọrịta ahụ nke gị na ya meworo.

21 Mana Nifaị sịrị ya: O unu ndị nzuzu, unu ndị ana-ebịghị ugwu nke obi, unu ndị isi, na unu ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, unu matara ruo ole mgbe Onye-nwe Chineke unu ga-enye unu ohere ka unu gaa nʼiru nʼụzọ mmehie unu nke a?

22 O unu kwesịrị ịmalite iti oke mkpu na iru uju, n’ihi nnukwu mbibi nke nʼoge ugbua na-eche unu, ma ọbụghị na unu ga-echegharị.

23 Lee unu sị na mụ ekwekọrịtawo mụ na otu nwoke ka o gbuo Sizorọm, onye-isi-ikpe anyị. Mana lee, asị m unu, na nke a bụ n’ihi na agbaworo m unu ama ka unu nwe ike mata maka ihe nke a; e, ọbụna ka ọ bụrụ ihe aka-ebe nye unu, na amatara m maka ajọọ-omume na ihe arụ nile nke dị nʼetiti unu.

24 Ma n’ihi na emewo m nke a, unu sị na m kwekọrịtara mụ na otu nwoke ka o mee ihe nke a; e, n’ihi na e gosịrị m unu ihe ịrịba-ama nke a unu na-ewere m iwe, ma chọọ ibibi ndụ m.

25 Ma ugbua lee, aga m egosị unu ihe iriba-ama ọzọ, ma lee ma unu ga-achọ igbu m nʼihe nke a.

26 Lee asị m unu: Gaa nʼụlọ Siantọm, onye bụ nwanne nwoke nke Sizorọm, ma sị ya—

27 Nifaị, onye mere dịka onye-amụma, onye na-ebu nnukwu amụma ihe ọjọọ gbasara ndị a, gị na ya unu kwekọrịtara, nʼime nke unu gbuworo Sizorọm, onye bụ nwanne gị nwoke?

28 Ma lee, ọ ga-asị unu, e-e.

29 Ma unu ga-asị ya: I gbuwo nwanne gị nwoke?

30 Ma ọ ga eguzoro nʼegwu, ma ọ gaghị amata ihe ọ ga-ekwu. Ma lee, ọ ga-agọrọ unu agọ; ma ọ ga-eme dịka ọ tụrụ ya nʼanya; otu o sila dị, ọ ga-ekwupụtara unu na aka ya dị ọcha.

31 Mana lee, unu ga-eleru ya anya, ma unu ga-achọta ọbara nʼala uwe nke uwe-ime-arụ ya.

32 Ma mgbe unu hụworo nke a, unu ga-asị: Olee ebe ọbara nke a siri bịa? Anyị amaghị na ọ bụ ọbara nke nwanne gị nwoke?

33 Ma mgbe ahụ ka ọ ga-ama jijiji, ma iru ya agaghị achapụ-achapụ, ọbụna dịka ọnwụ abịakwasịwo ya.

34 Ma mgbe ahụ ka unu ga-asị: N’ihi ịtụ-egwu nke a na achapụghị achapụ nke bịakwasịworo gị nʼiru, lee, anyị matara na ikpe mara gị.

35 Ma mgbe ahụ ka egwu nke karịrị ga-abịakwasị ya; ma mgbe ahụ ka ọ ga-ekwupụtara unu mmehie ya, ma kwusị ịgọ-agọ ọzọ na ya emewo ogbugbu nke a.

36 Ma mgbe ahụ ka ọ ga-asị unu, na mụ, Nifaị, amaghị ihe ọbụla gbasara ihe ahụ ma ọbụghị na enyere m ya site nʼike nke Chineke. Ma mgbe ahụ ka unu ga-amata na mụ bụ nwoke aka ya kwụ-ọtọ, ma na e zitara m nye unu site nʼebe Chineke nọ.

37 Ma o wee ruo na ha gara ma mee, ọbụna dịka otu Nifaị gwaworo ha. Ma lee, okwu nile ahụ o kwuru bụ ezi-okwu; n’ihi na dịka okwu ndị ahụ siri dị, ọ gọrọ agọ; ma kwa dịka okwu ndị ahụ siri dị o kwupụtara mmehie ya.

38 Ma a kpọtara ya igosi na ya nʼonwe ya bụ onye ogbu-mmadụ ahụ, nke mere na ise ndị ahụ e mere ka ha atọhapụ ha, ma kwa otu a ka e mere Nifaị.

39 Ma e nwere ụfọdụ ndị Nifaị ahụ ndị kwere nʼokwu nile nke Nifaị; ma e nwere ụfọdụ kwa, ndị kwere n’ihi ịgba-ama nke ise ahụ, n’ihi na agbanwewo ha rịị nʼokwukwe mgbe ha nọ nʼụlọ-mkpọrọ.

40 Ma ugbua e nwere ụfọdụ nʼetiti ndị ahụ, ndị kwuru na Nifaị bụ onye-amụma.

41 Ma e nwere ndị ọzọ ndị sịrị: Lee, ọ bụ chi, n’ihi na, ma ọbụghị na ọ bụ chi, ọ gaghị enwe ike ịmata ihe nile. N’ihi na lee, ọ gwawo anyị echiche nile nke obi anyị, na kwa ọ gwawo anyị ọtụtụ ihe; ma ọbụna o wetawo na mmata nke anyị, onye nke gburu onye-isi-ikpe anyị nʼezi-okwu.