Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 6


Isi 6

Nifaị wee dee maka ihe nile nke Chineke—Ebum-n’obi Nifaị bụ ime ka ndị mmadụ kwere ma bịakwutekwa Chineke nke Abraham ka a zọpụta ha. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Nifaị, anaghị ede ihe gbasara akụkọ-agbụrụ nke nna m ha n’akụkọ-ndekọta m nke a; ọ dịghịkwanụ mgbe ọzọ m ga-ede ihe banyere ya n’elu epekele ndị a m na-ede; n’ihi na edewo ya n’akụkọ-ndekọta nke dị n’aka nna m; ya mere, anaghị m ede ya n’ọrụ m nke a.

2 N’ihi na o zuworo m ịsị na anyị bụ agbụrụ nke Josef.

3 Ma ọ dịghị m mkpa ịkpachapụ anya n’ide nkọwasị nile nke nna m n’uju n’ihi na agaghị ede ha n’elu epekele ndị a, n’ihi na achọrọ m ohere nile a, ka m nwe ike ide ihe nke Chineke.

4 N’ihi na uju nke ebum-n’obi m, bụ ka m nwe ike mee ka ụmụ mmadụ kwere, ma bịakwute kwa Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak na Chineke nke Jekọb, ka a zọpụta ha.

5 Ya mere, anaghị m ede ihe ndị nke na-atọ ụwa ụtọ, kama ihe na-atọ Chineke na kwa ndị na-abụghị nke ụwa.

6 Ya mere, m ga-enye mkpụrụ-afọ m iwu-nsọ, ka ha gharakwa ide ihe n’epekele ndị a, bụ ihe na-abụghị ihe ga-abara ụmụ nke mmadụ uru.